Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkụzi Atọ n’Ime Otu ò si na Baịbụl?

Nkụzi Atọ n’Ime Otu ò si na Baịbụl?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Nkụzi Atọ n’Ime Otu ò si na Baịbụl?

▪ E nwere ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ si akọwa nkụzi Atọ n’Ime Otu. Otu n’ime ha bụ na “e nwere Chukwu atọ (Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ), nke ọ bụla n’ime ha na-adịru ebighị ebi, nke ọ bụla n’ime ha pụrụ ime ihe niile, ọ dịghị nke ka ibe ya ma ọ bụ nke dị ala karịa ibe ya, a sịrị na nke ọ bụla n’ime ha bụ Chineke, sịkwa na ha abụghị Chineke atọ, kama otu Chineke.” Nkụzi a ò si na Baịbụl?

Ebe ndị mmadụ na-agbakwasịkarị ụkwụ akụzi Atọ n’Ime Otu bụ na Matiu 28:19. Lee otú Bible Nsọ Ọhụụ si sụgharịa ihe Jizọs kwuru n’amaokwu ahụ: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizm n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmọọ Nsọ.” N’eziokwu, a kpọrọ Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ aha n’amaokwu ahụ. Ma, amaokwu ahụ ekwughị na ha atọ bụ otu. Mgbe Jizọs kwuru ihe e dere n’amaokwu ahụ, ọ nọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị Juu, ka ha gaa kụziere ndị mmadụ ihe ma na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Ma mba Izrel, ma ọ bụ ndị Juu, hà kweere n’Atọ n’Ime Otu?

Mgbe Chineke si n’aka Mozis nye mba Izrel Iwu ya, bụ́ nke dị na Baịbụl, a gwara ụmụ Izrel, sị: “Ya adịla mgbe ị ga-enwe chi ọ bụla ọzọ tinyere m.” (Diuterọnọmi 5:7) Ọ̀ bụ Chineke ole nyere iwu a? Azịza ya doro anya n’ihi na Diuterọnọmi 6:4 kwuru, sị: “Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova,” ọ bụghị Chineke atọ nke dị n’otu Chineke. Mgbe e nyere mba Izrel iwu a, ha ka si n’Ijipt pụta bụ́ ebe ndị mmadụ na-efe Osaịris, Aịsis, na Họres (ị ga-ahụ ha n’aka ekpe). Osaịris, Aịsis, na Họres so n’ọtụtụ chi atọ n’ime otu ndị Ijipt na-efe ofufe. N’ihi ya, e nyere ndị Izrel iwu ka ha na-efe naanị otu Chineke. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị mmadụ ghọta iwu a nke ọma? Otu onye nkụzi ndị Juu, nke aha ya bụ Dọkịta J. H. Hertz, kwuru, sị: “Otú a e si gwa ha hoo haa ka ha fewe otu chi mere ka o doo anya na a chọtụdịghị iji ntị nụ na ha fere ọtụtụ chi . . . Shema [ya bụ, iwu ahụ e nyere na Diuterọnọmi 6:4, nke bụ́, “Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova] gosiri na atọ n’ime otu Ndị Kraịst na-akụzi abụghị eziokwu n’ihi na ozizi atọ n’ime otu na-ekwu na Chineke dị atọ.” *

Ebe ọ bụ na Jizọs bụ onye Juu, a kụziiri ya ka o rube isi n’iwu ahụ e nyere ndị Izrel. Mgbe e mechara Jizọs baptizim, Ekwensu bịara nwaa ya ọnwụnwa, Jizọs asị ya: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’” (Matiu 4:10; Diuterọnọmi 6:13) Ọ dịkarịa ala, e nwere ụzọ ihe abụọ anyị nwere ike ịmụta n’ọnwụnwa ahụ Ekwensu nwara Jizọs. Nke mbụ bụ na Setan nọ na-agbalị ime ka Jizọs fee onye ọzọ na-abụghị Jehova. Ọ bụrụ na Jizọs na Jehova bụ otu Chineke, Setan agaraghị agbalịwa ime ka Jizọs fee onye ọzọ na-abụghị Jehova. Nke abụọ bụ na Jizọs mere ka o doo anya na e nwere naanị otu Chineke onye e kwesịrị ife ofufe n’ihi na o kwuru na ‘ọ bụ naanị Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe.’ A sị na e nwere Atọ n’Ime Otu, Jizọs gaara asị ‘ọ bụ naanị anyị ka ị na-aghaghị ife ofufe.’

Mgbe ndị mmadụ mụtara eziokwu banyere Chineke ma kpebie ife ya, a “na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Matiu 28:19) Nke a pụtara na ha ghọtara na Jehova bụ onye kacha elu nakwa na ha kwetara irubere ya isi. Ọ pụtakwara na ha ghọtara ọrụ Jizọs Kraịst na-arụ n’imezu nzube Jehova ma kweta irubere ya isi. (Abụ Ọma 83:18; Matiu 28:18) Ihe ọzọ ọ pụtara bụ na ha ghọtakwara ọrụ mmụọ nsọ Chineke na-arụ, ghọtakwa na ọ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ.—Jenesis 1:2; Ndị Galeshia 5:22, 23; 2 Pita 1:21.

Ozizi Atọ n’Ime Otu emegharịala ndị mmadụ anya kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ma, Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta nke bụ́ eziokwu ma nyere ha aka ka ha bịaruo Jehova nso, bụ́ “onye naanị ya bụ ezi Chineke.”—Jọn 17:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ihe ahụ e kwuru na Diuterọnọmi 6:4 so n’ekpere ndị Juu na-ekpe n’ụlọ nzukọ ha.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 23]

Musée du Louvre, Paris