Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Nweenụ Ịhụnanya n’Etiti Onwe Unu’

‘Nweenụ Ịhụnanya n’Etiti Onwe Unu’

‘Nweenụ Ịhụnanya n’Etiti Onwe Unu’

“Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—JỌN 13:34, 35.

Gịnị Ka Ihe A Jizọs Kwuru Pụtara? Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ahụ ibe ha n’anya otú yanwa si hụ ha n’anya. Olee otú Jizọs hụruru ndị mmadụ n’anya? N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị Izrel kpọrọ ndị mba ọzọ asị, o nweghịkwa ihe ha ji ụmụ nwaanyị kpọrọ. Ma, Jizọs emeghị otú ahụ. (Jọn 4:7-10) Otú Jizọs si hụ ndị mmadụ n’anya mere ka o jiri oge ya na ike ya nyere ha aka. Ọ na-eme nke a mgbe niile, ma mgbe ike gwụchara ya. (Mak 6:30-34) Kraịst mekwara ihe kacha gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; onye ọzụzụ atụrụ ọma na-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi atụrụ ya.”—Jọn 10:11.

Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Mere Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Ndị Kraịst oge mbụ na-akpọ ibe ha “nwanna nwoke” ma ọ bụ “nwanna nwaanyị.” (Faịlimọn 1, 2) Ha nabatara ndị si ná mba ọ bụla n’ọgbakọ Ndị Kraịst, n’ihi na ha kweere na “ọ dịghị ihe dị iche n’etiti onye Juu na onye Grik, n’ihi na e nwere otu Onyenwe mmadụ niile.” (Ndị Rom 10:11, 12) Mgbe e mechara ememme Pentikọst nke afọ 33 Oge Anyị, ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Jeruselem ‘rere ihe onwunwe ha na akụ̀ ha ma kesaara mmadụ niile ihe ha retara n’ihe ndị a, dị nnọọ ka mkpa onye ọ bụla si dị.’ Gịnị mere ha ji mee otú ahụ? Ọ bụ ka ha nyere ndị e mere baptizim ọhụrụ aka ka ha nwee ike ịnọtụkwu na Jeruselem “na-ege ntị n’ozizi ndịozi.” (Ọrụ 2:41-45) Gịnị mere ha ji nyere ha aka? Mgbe ọ na-eruchabeghị narị afọ abụọ ndịozi Jizọs nwụchara, Tertullian dere ihe ndị mmadụ nọ na-ekwu banyere Ndị Kraịst oge ahụ, sị: “Ha hụrụ nnọọ ibe ha n’anya . . . ha dịkwa njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ.”

N’oge Anyị A, Ole Ndị Na-eme Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Akwụkwọ bụ́ The History of the Decline and Fall of the Roman Empire (1837) kwuru na kemgbe ọtụtụ narị afọ, otú ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst “si mesie ibe ha ike karịdịrị otú ndị na-abụghị Ndị Kraịst sirila mesie ha ike.” Otu nchọpụta e mere ná mba Amerịka gosiri na ọ bụ ndị sịrị na ha nwere okpukpe ha na-ekpe, karịchaa ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst, na-akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị. Ndị nọ n’otu chọọchị n’otu mba anaghị enwe ihe jikọrọ ha na ndị chọọchị ha nọ ná mba ọzọ. Nke a na-eme ka ọ ghara imetụ ha n’obi inyere ndị chọọchị ha nọ ná mba ọzọ aka ma ha nwee mkpa.

N’afọ 2004, ajọ ifufe kpara mkpamkpa n’obodo Flọrịda. Onyeisi oche kọmitii hụrụ maka ịgbatara ndị ọdachi ahụ dakwasịrị ọsọ enyemaka gara n’ebe njinji ahụ jiri ka ọ mara ma è nyekwara ndị ọdachi ahụ dakwasịrị ihe ndị e wetara. O kwuru na Ndịàmà Jehova haziri otú ha si na-ekesara ndị ọdachi ahụ dakwasịrị ihe ahazi karịa ndị ọ bụla ọzọ, ọ gwakwara Ndịàmà Jehova na ọ bụrụ na e nwere ihe ọzọ ha chọrọ, na ya ga-enye ha ya. N’afọ 1997, Ndịàmà Jehova nọ na Yurop gbatakwaara ụmụnna ha na ndị ọzọ nọ na Kọngo Kinshasa ọsọ enyemaka. Ha bugaara ha ọgwụ, nri, na uwe. Ihe niile ha bugaara ha karịrị otu narị nde naịra.