Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-echeta Ọnwụ Jizọs?

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-echeta Ọnwụ Jizọs?

Mụta Ihe n’Okwu Chineke

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-echeta Ọnwụ Jizọs?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Olee otú e kwesịrị isi na-echeta ọnwụ Jizọs?

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta ọnwụ ya. O ji achịcha na mmanya gosi ha otú ha ga-esi na-echeta ya. O nwere ihe ndị achịcha ahụ na mmanya ahụ nọchiri anya ha. Achịcha ahụ nọchiri anya ahụ́ Jizọs, mmanya ahụ anọchie anya ọbara ya.—Gụọ Luk 22:19, 20.

E tinyeghị ihe na-eko achịcha n’achịcha ahụ Jizọs ji gosi ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-echeta ọnwụ ya. Ihe kpatara ya bụ na na Baịbụl, ihe na-eko achịcha na-anọchikarị anya mmehie. N’ihi ya, achịcha ahụ nọchiri anya ahụ́ Jizọs bụ́ nke zuru okè. O ji ahụ́ ya chụọ àjà. Ọ bụ ya mere e ji kwụsịzie iji anụmanụ achụ àjà otú Iwu Mozis kwuru ka a na-eme. (Ndị Hibru 10:5, 9, 10) Mmanya ahụ nọchiri anya ọbara Jizọs nke dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke ọ wụsara ka o wee gbapụta anyị ná mmehie anyị.—Gụọ 1 Pita 1:19; 2:24; 3:18.

2. Olee mgbe anyị kwesịrị ịna-echeta ọnwụ Jizọs?

Jizọs nwụrụ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, n’oge Ememme Ngabiga. Ndị Juu na-amalite ịgụ ụbọchị ọhụrụ ma anyanwụ daa. N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya riri oriri Ngabiga. Mgbe ha richara ya, o ji achịcha na mmanya gosi ha otú ha ga-esi na-echeta ọnwụ ya.—Gụọ Luk 22:14, 15.

Taa, Ndị Kraịst na-echeta Jizọs bụ́ onye Chineke zitere ka ọ gbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie na ọnwụ. (Ọpụpụ 12:5-7, 13, 17) Ebe ọ bụ na ndị Juu na-eme Ememme Ngabiga otu ugboro n’afọ, ọ bụkwa otu ugboro n’afọ ka a na-echeta Ọnwụ Jizọs mgbe anyanwụ dachara n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan na kalenda ndị Juu.—Gụọ Jọn 1:29.

3. Olee ndị kwesịrị ịna-ata achịcha ahụ, na-aṅụkwa mmanya ahụ?

Mgbe Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mmanya ahụ, ọ sịrị ha: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” (1 Ndị Kọrịnt 11:25) E ji ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dochie ọgbụgba ndụ Iwu Mozis. N’ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na ụmụ Izrel gbara, Chineke kwere ụmụ Izrel nkwa na ọ bụrụ na ha erubere ya nnọọ isi, ha ga-aghọ ndị ya. (Ọpụpụ 19:5, 6) Ma ụmụ Izrel erubereghị Chineke isi. Ọ bụ ya mere Jehova ji mee ka e nwee ọgbụgba ndụ ọhụrụ.—Gụọ Jeremaya 31:31.

Ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị ole na ole. Ha dị naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Jehova ga-esi n’aka ha gọzie ọtụtụ mmadụ ndị si ná mba niile ma mee ka ha dị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. Ụfọdụ ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ka nọ ndụ n’ụwa na-ejere Jehova ozi. Ọ bụ naanị ha kwesịrị ịna-ata achịcha ahụ ma na-aṅụ mmanya ahụ n’ihi na iko ahụ “pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ.”—Gụọ Luk 12:32; Mkpughe 14:1, 3.

4. Olee uru icheta Ọnwụ Jizọs baara anyị?

Icheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ na-eme ka anyị ghọtakwuo otú Jehova hụruru anyị n’anya. O zitere Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi mmehie anyị. N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị gara Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị kwesịrị ichebara uru ọnwụ ya baara anyị echiche. Anyị kwesịkwara iche echiche banyere otú anyị nwere ike isi gosi Jehova na Jizọs na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ha meere anyị.—Gụọ Jọn 3:16; 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie ka Bible Na-akụzi? peeji nke 206-208 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.