Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara​—Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

Ọ NA-ATỌ Ndịàmà Jehova ụtọ ka ha na ndị agbata obi ha na-akparịta ihe ndị dị na Baịbụl. Ò nwere ajụjụ gbasara Baịbụl ị ga-achọ ịma azịza ya? Ò nwere ihe Ndịàmà Jehova kweere ma ọ bụ ihe ha na-eme na-agbagwoju gị anya? Ya bụrụ otú ahụ, jụọ ya Onyeàmà Jehova ọzọ gị na ya ga-ahụ. Obi ga-atọ ya ụtọ ịza gị ya.

N’okpuru ebe a, e dere ihe Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike ịkparịta. Ka anyị were ya na Onyeàmà Jehova aha ya bụ Kate gara n’ụlọ otu onye aha ya bụ Stella.

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Unu Ekweghị na Jizọs?

Stella: Pastọ anyị sị na Ndịàmà Jehova ekweghị na Jizọs. Ọ̀ bụ eziokwu?

Kate: Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndịàmà Jehova kweere na Jizọs. Anyị kwedịịrị na ọ bụrụ na mmadụ ekweghị na Jizọs, ọ gaghị enweta nzọpụta.

Stella: Ọ bụkwa ihe m kweere.

Kate: Ihe ọ pụtara bụ na mụ na gị kweere otu ihe na nke a. Ma, ihe i nwere ike ịna-eche n’obi gị bụ, ‘Ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova kweere na Jizọs, gịnị mere ndị mmadụ ji asị na ha ekweghị na Jizọs?’

Stella: Ọ bụ ihe m chọrọ ịjụ gị. Gịnị mere ndị mmadụ ji ekwu otú ahụ?

Kate: Igbu ya na nkenke, anyị kweere na Jizọs, ma e nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere Jizọs anyị na-ekweghị.

Stella: Gwagodị m ụfọdụ n’ime ha.

Kate: Ụfọdụ ndị na-ekwu na Jizọs bụ ezigbo mmadụ nkịtị dịrị ndụ n’ụwa. Ma anyị ekweghị na nke ahụ bụ eziokwu.

Stella: Mụnwa ekweghịkwa na ọ bụ eziokwu.

Kate: Mụ na gị kwekwaara otu ihe na nke a. E nwere ihe ọzọ ndị mmadụ na-ekwu banyere Jizọs na Nna ya. Ndịàmà Jehova ekweghị n’ihe ahụ ha na-ekwu n’ihi na ọ dị iche n’ihe Jizọs kwuru.

Stella: Gịnị bụ ihe ahụ?

Kate: Ọtụtụ chọọchị na-akụzi na Jizọs bụ Chineke. O nwere ike ịbụ ihe a na-akụzi na chọọchị ị na-aga.

Stella: Ọ bụ eziokwu. Pastọ anyị sịrị na Chineke na Jizọs bụ otu onye.

Kate: Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịma eziokwu banyere Jizọs, í cheghị na ọ ga-aka mma ka onye ahụ gụọ ihe Jizọs kwuru banyere onwe ya?

Stella: Echere m otú ahụ.

Gịnị Ka Jizọs Kwuru?

Kate: Ka anyị gụgodị otu ebe na Baịbụl, bụ́ ebe ga-agwa anyị ihe Jizọs kwuru. Biko, ka anyị gụọ Jọn 6:38. Jizọs kwuru n’ebe ahụ, sị: “Esi m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m.” Jizọs agaraghị ekwu ihe a ma a sị na ọ bụ ya bụ Chineke.

Stella: Gịnị mere i ji kwuo otú ahụ?

Kate: Ị̀ hụrụ na Jizọs asịghị na ya si n’eluigwe bịa ime uche nke ya?

Stella: Ọ bụ eziokwu. Ọ sịrị na ya bịara ime uche Onye zitere ya.

Kate: Ma a sị na Jizọs bụ Chineke, ònyezi si n’eluigwe zite ya? Gịnịkwa mere Jizọs ji kwuo na ya na-eme uche Onye zitere ya?

Stella: Ọ dị ka m̀ ghọtawala ihe ị na-ekwu. Ma echeghị m na naanị otu ebe a ị gụrụ ga-eme ka m kweta na Jizọs abụghị Chineke.

Kate: Ka anyị gụọ ihe ọzọ Jizọs kwuru. Na Jọn isi nke 7, o kwuru ihe yiri ihe ahụ anyị gụburu. Biko, gụọ Jọn 7:16.

Stella: Ebe ahụ sịrị: “Ma, Jizọs zara ha, sị: ‘Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.’”

Kate: Stella, i meela. Ebe a ị gụrụ ò kwuru na Jizọs na-akụzi ihe ọ bụla dị ya mma?

Stella: Mba. Ọ sịrị na ọ na-akụzi ihe Onye zitere ya chọrọ.

Kate: I kwutere ya. Ihe ọzọ anyị ga-ajụzi bụ: ‘Ònye zitere Jizọs? Ònye gwara ya ihe ọ kụziri?’ Í cheghị na Onye ahụ karịrị Jizọs? Ọ̀ bụ na onye dunyere mmadụ ozi akaghị onye o dunyere ozi?

Stella: Agụtụbeghị m ebe a mbụ.

Kate: Ka anyị gụọ ihe ọzọ Jizọs kwuru na Jọn 14:28. Ebe ahụ sịrị: “Unu nụrụ na m sịrị unu, M na-ala, m na-alọghachikwutekwa unu. Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna m, n’ihi na Nna m ka m ukwuu.” N’ihi ihe a anyị gụrụ ebe a, olee otú ị ghọtara Jizọs si were Nna ya?

Stella: Ọ sịrị na Nna ya ka ya ukwuu. Nke a pụtara na ọ ma na Chineke karịrị ya.

Kate: I kwutere ya. E nwere ihe ọzọ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. Ọ dị na Matiu 28:18. Ebe ahụ sịrị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Jizọs ọ̀ sịrị na ya nwere ikike niile kemgbe ụwa?

Stella: Mba. Ọ sịrị na e nyere ya ikike ahụ enye.

Kate: Ma ọ bụrụ na Jizọs bụ Chineke, ọ̀ gaara adị mkpa ka e nye ya ikike ahụ? Ònye nyedịrị ya ikike ahụ?

Stella: Aga m echebara ajụjụ ndị ahụ echiche.

Ònye Ka Chineke Na-agwa Okwu?

Kate: O nwere ihe ọzọ na-agaraghị ekwe nghọta ma a sị na ọ bụ eziokwu na Jizọs bụ Chineke.

Stella: Gịnị bụ ihe ahụ?

Kate: Ọ bụ ihe mere mgbe e mere Jizọs baptizim. E dere ya na Luk 3:21, 22. Biko, gụọ ebe ahụ.

Stella: “Ma mgbe a nọ na-eme ndị ahụ niile baptizim, e mekwara Jizọs baptizim, ka ọ nọ na-ekpe ekpere, e meghere eluigwe, mmụọ nsọ wee bekwasị ya n’ọdịdị nduru, otu olu wee si n’eluigwe kwuo, sị: ‘Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.’”

Kate: Ị̀ hụrụ ihe Jizọs nọ na-eme mgbe e mere ya baptizim?

Stella: Ọ nọ na-ekpe ekpere.

Kate: Ihe anyị nweziri ike ịjụ bụ, ‘Ọ bụrụ na Jizọs bụ Chineke, ònye ka ọ na-ekpegara ekpere?’

Stella: Ihe a bụ ezigbo ajụjụ. M ga-ajụ ya pastọ anyị.

Kate: O nwekwara ihe ọzọ anyị ga-amụta n’amaokwu ahụ. Ị̀ hụrụ na mgbe Jizọs si na mmiri pụta, o nwere onye si n’eluigwe kwuo okwu? Ì chetara ihe Onye ahụ kwuru?

Stella: Ọ sịrị na Jizọs bụ Ọkpara Ya, na Ya hụrụ Jizọs n’anya, nakwa na ihe Jizọs masịrị Ya.

Kate: I kwutere ya. Ma, a sị na Jizọs bụ Chineke, ònyezi si n’eluigwe kwuo ihe ndị ahụ?

Stella: Echetụbeghị m ụdị ihe a n’echiche.

Gịnị Mere E Ji Kwuo na Chineke Bụ “Nna,” Jizọs Abụrụ “Ọkpara”?

Kate: O nwere ihe ọzọ anyị kwesịrị ichebara echiche. Na Baịbụl, Jizọs kwuru na Chineke bụ Nna ya nke eluigwe. Mgbe e mekwara Jizọs baptizim, otu olu nke si n’eluigwe kwuru na Jizọs bụ Ọkpara Ya. Jizọs kwukwara na ya bụ Ọkpara Chineke. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgwa m na mmadụ abụọ hà, olee ihe ị ga-eji maara m atụ? Ọ̀ bụ nna na nwa ka ọ̀ bụ ụmụnne abụọ?

Stella: M ga-eji ụmụnne abụọ.

Kate: I kwutere ya. I nwekwara ike iji ụmụ ejima. Ma, Jizọs sịrị na Chineke bụ Nna, yanwa abụrụ Ọkpara. Gịnị ka i chere na Jizọs na-agwa anyị?

Stella: Aghọtala m ihe ị na-ekwu. Jizọs chọrọ ka anyị ghọta na n’ime ya na Chineke, o nwere onye tọrọ ibe ya na onye ka ibe ya.

Kate: I kwuru eziokwu. Chebagodịrị nke a echiche: I kwuru na e nwere ike iji ụmụnne abụọ ma ọ bụ ụmụ ejima kọwaa na mmadụ abụọ hà. Ọ bụrụ na Jizọs bụ Chineke n’eziokwu, ì chere na Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu, ga-asị na Chineke bụ Nna, yanwa abụrụ Ọkpara? Í cheghị na ọ gaara asị na ha bụ ụmụnne ma ọ bụkwanụ ya achọta ụzọ ọzọ ga-aka doo anya ọ ga-esi kwuo ya?

Stella: Ọ bụ eziokwu.

Kate: Ma ihe o kwuru bụ na Chineke bụ “Nna,” yanwa abụrụ “Ọkpara.”

Stella: Ihe a i kwuru dị ezigbo mkpa.

Gịnị Ka Ndị Mbụ Soro Ụzọ Jizọs Kwuru?

Kate: Ọ bụrụ na ị ka nwere ohere, e nwere ihe m ga-achọ ịkọwakwuru gị.

Stella: Nsogbu adịghị.

Kate: Ọ bụrụ na Jizọs bụ Chineke n’eziokwu, í cheghị na ndị na-eso ụzọ ya gaara ekwu ya?

Stella: Ha gaara ekwu ya.

Kate: Ma o nweghị ebe e kwuru ụdị ihe ahụ n’Akwụkwọ Nsọ. Kama nke ahụ, lee ihe Pọl onyeozi, bụ́ otu n’ime ndị mbụ soro ụzọ Jizọs, dere ná Ndị Filipaị 2:9. O kwuru ihe Chineke mere mgbe Jizọs nwụrụ ma si n’ọnwụ bilie. Ebe ahụ sịrị: “Chineke buliri [Jizọs] elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ.” Gịnị ka ebe a kwuru na Chineke meere Jizọs?

Stella: O kwuru na Chineke buliri Jizọs elu ka ọ nọrọ n’ọkwá dị elu karịa nke o nweburu.

Kate: I kwutere ya. Ma ọ bụrụ na Jizọs na Chineke hà tupu Jizọs anwụọ, Chineke emechaakwa bulie ya n’ọkwá ka nke o nweburu, í cheghị na ihe ọ pụtara bụ na Jizọs akaziela Chineke? Ọ̀ dị gị ka o nwere onye ga-aka Chineke?

Stella: Mbanụ!

Kate: Ekwere m ihe i kwuru. Ugbu a anyị gụchara ihe ndị a, ì chere na Baịbụl na-akụzi na Jizọs bụ Chineke?

Stella: Mba, echeghị m otú ahụ. Baịbụl kwuru na Jizọs bụ Ọkpara Chineke.

Kate: Nke ahụ bụ eziokwu. Stella, achọrọ m ka i buru n’obi na Ndịàmà Jehova ejighị Jizọs egwuri egwu. Anyị kweere na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, onye ọnwụ ya ga-ewetara ndị niile nwere okwukwe na ya nzọpụta.

Stella: Ọ bụkwa ihe m kweere.

Kate: Ma ihe i nwere ike ịjụ bụ, ‘Olee otú anyị ga-esi gosi Jizọs na obi dị anyị ụtọ na o ji ndụ ya chụọ àjà maka anyị?’ *

Stella: Ajụọkwala m onwe m ajụjụ a.

Kate: Ọ bụrụ na ị ga-anọ n’ụlọ n’izu na-abịanụ, aga m achọ ịbịa ka m jiri Baịbụl zaa gị ajụjụ ahụ.

Stella: M ga-anọ ya.

Kate: Ọ dị mma. Ka ọ dịzienụ mgbe ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 74 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere àjà ahụ Jizọs chụrụ, gụọ isi nke 5 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?