Maka Ndị Na-eto Eto—E Nyere Mozis Ọrụ Pụrụ Iche
Maka Ndị Na-eto Eto—E Nyere Mozis Ọrụ Pụrụ Iche
Ihe ị ga-eme: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị e dere n’isiokwu a, were ya na o nwere ebe ị nọ na-ekiri ka ihe ị na-agụ na-eme. Werekwa ya na ị na-anụ ihe ndị ị na-agụ akụkọ ha na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.
Ndị a kọrọ akụkọ ha: Jehova Chineke na Mozis
Ihe a kọrọ: Otú Jehova si gwa Mozis ka o duru ụmụ Izrel pụọ n’Ijipt.
1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ ỌPỤPỤ 3:1-14; 4:1-17.
Kọwaa otú i chere osisi ogwu ahụ na-enwu ọkụ dị.
․․․․․
Mgbe Mozis nụrụ òkù Chineke kpọrọ ya, bụ́ nke e dere n’Ọpụpụ 3:4, olee otú i chere ihu ya dị, oleekwa ụdị olu o ji zaa Chineke?
․․․․․
Mgbe Mozis na-ajụ Jehova ajụjụ ndị ahụ e dere n’Ọpụpụ 3:11, 13 nakwa n’Ọpụpụ 4:1, 10, olee otú i chere obi dị Mozis?
․․․․․
2 LEBAKWUO YA ANYA.
Jiri ihe e ji eme nchọnchọ ndị i nwere chọpụtakwuo ihe okwu a pụtara: “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụpụ 3:14) Gịnị mere Jehova ji kwuo ihe ahụ mgbe Mozis jụrụ ya aha ya? *
․․․․․
Gịnị ka i chere na ọ bụ ya mere na obi akaghị Mozis ịgakwuru Fero? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ․․․․․
Gịnị ka i chere na ọ bụ ya mere na obi akaghị Mozis ịgakwuru ndị Izrel?
․․․․․
3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .
Ihe mere ụmụ mmadụ ji atụ ụjọ ma a gwa ha mee ihe ụfọdụ.
․․․․․
Otú o si bụrụ na Jehova ma gị, marakwa ihe ị ga-emeli.
․․․․․
ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.
Olee ihe ụfọdụ ọ na-abụ ị chọọ ime, obi anaghị aka gị ime ha?
․․․․․
Ya bụrụgodị na o nwere ihe ndị ị na-anaghị emete, olee uru i nwere ike ịbara Jehova Chineke?
․․․․․
4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? GỊNỊKWA MERE O JI BAARA GỊ URU?
․․․․․
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ isiokwu a n’Ịntanet ma ọ bụ na ị chọrọ isi n’Ịntanet bipụta ya, gaa n’adres anyị bụ́ www.pr418.com
Ọ bụrụ na i nweghị Baịbụl, gwa ndịàmà Jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị agụọ ya n’asụsụ bekee na www.watchtower.org na www.pr418.com
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 13 Ndịàmà Jehova ebipụtala ọtụtụ akwụkwọ ndị nwere ike inyere gị aka ka ị mụtakwuo ọtụtụ ihe na Baịbụl. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu Baịbụl, gwa Ndịàmà Jehova bi gị nso ka ha nyere gị aka ma ọ bụ gị edetara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.