Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Chebe Obi Gị!”

“Chebe Obi Gị!”

“Chebe Obi Gị!”

Mgbakọ Distrikti Nke Ndịàmà Jehova

Isiokwu Ụbọchị Fraịdee

“Jehova Na-ahụ Ihe Dị n’Obi”—1 SAMUEL 16:7.

Isiokwu Ụbọchị Satọdee

“Ọ Bụ Ihe Jupụtara Mmadụ n’Obi Ka Ọnụ Ya Na-ekwu”—MATIU 12:34.

Isiokwu Ụbọchị Sọnde

‘Jiri Obi Gị Dum Jeere Jehova Ozi.’—1 IHE E MERE 28:9.

Baịbụl kpọrọ okwu bụ́ obi aha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku ugboro. Ọtụtụ mgbe Baịbụl kwuru banyere obi, ihe ọ na-ekwu abụghị obi nkịtị, kama ọ bụ obi ihe atụ. Gịnị bụ obi ihe atụ? Ọ bụ ụdị onye mmadụ bụ, ya bụ, ihe mmadụ na-eche n’echiche, otú obi dị ya na ihe na-agụ ya agụụ.

Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebe obi ihe atụ anyị? Chineke mere ka Eze Sọlọmọn dee, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị, n’ihi na ọ bụ na ya ka isi iyi nke ndụ si apụta.” (Ilu 4:23) Ọ bụ otú obi ihe atụ anyị dị na-ekpebi ụdị ndụ anyị na-ebi ugbu a nakwa ma ànyị ga-adị ndụ n’ọdịnihu. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na Chineke na-ahụ ihe dị anyị n’obi. (1 Samuel 16:7) Ihe ga-egosi ma Chineke ọ̀ na-ele anyị anya ọma bụ ụdị mmadụ anyị bụ, ya bụ, “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi.”—1 Pita 3:4.

Olee otú anyị nwere ike isi chebe obi anyị? A ga-aza ajụjụ a nke ọma ná mgbakọ distrikti Ndịàmà Jehova ga-enwe n’ụwa niile malite n’ọnwa Mee. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ “Chebe Obi Gị!” Ọ ga-amalite n’ọnwa Septemba na Naịjirịa. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịazuo ụbọchị atọ nke mgbakọ a. * Ihe ị ga-amụta ga-eme ka ị na-ebi ndụ otú ga-eme ka obi Jehova Chineke ṅụrịa.—Ilu 27:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma mgbakọ nke dị gị nso, biko gaa na www.pr418.com, bụ́ ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. I nwekwara ike ịjụta Ndịàmà Jehova bi gị nso banyere mgbakọ a ma ọ bụkwanụ gị edegara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ ozi.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 32]

Foto dị n’aka nri: Aus dem Fundus der MÜNCHNER OLYMPIAPARK GMBH, München