Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Tinyere Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Tinyere Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Tinyere Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

▪ Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-eje ozi ha. Ma ọ gwaghị ha tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Matiu 28:18-20) N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ Jizọs nọgidere na-eme ihe o bu ụzọ kwuo, nke bụ́: “Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”—Mak 12:17.

Olee otú ihe ahụ Jizọs kwuru si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ibi n’ụwa ma ghara ịbụ nke ụwa? Olee otú ha si ama ihe bụ́ nke Siza na ihe bụ́ nke Chineke?

Pọl onyeozi weere na ọ bụrụ na ya etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, o gosiri na ya emeghị ihe ahụ Jizọs kwuru. Otu akwụkwọ aha ya bụ Beyond Good Intentions—A Biblical View of Politics kwuru, sị: “Iwu gọọmenti tiri banyere ụmụ amaala Rom baara Pọl uru n’ihi na o mere ka e kpee ya ikpe ka nwa amaala Rom, ma o nweghị mgbe o tinyere aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.”

Gịnị ka Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha mee? Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Akwụkwọ ozi ndị o degaara Ndị Kraịst ibe ya nọ n’obodo Kọrịnt, Efesọs, nakwa na Rom gosiri na ọ gwaghị ha tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na Pọl “nyere Ndị Kraịst iwu ka ha na-erubere ndị ọchịchị isi, ma n’akwụkwọ ozi niile o dere, o nweghị ebe ọ gwara ha ka ha tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.”—Ndị Rom 12:18; 13:1, 5-7.

Ndị Kraịst ndị biri ndụ ọtụtụ afọ Pọl nwụchara nyere Chineke ihe nke Chineke, nyekwa Siza ihe nke Siza. Ha rubeere ndị ọchịchị isi, ma ha etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Akwụkwọ ahụ anyị kpọrọ aha n’elu kwuru banyere Ndị Kraịst oge mbụ, sị: “Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst oge mbụ ma na ha kwesịrị irubere ndị ọchịchị isi, ma ha ma na ha ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.”

Ma ihe gbanwere n’ihe dị ka narị afọ atọ Kraịst nwụchara. N’akwụkwọ bụ́ Between Christ and Caesar, ọkà mmụta okpukpe aha ya bụ Charles Villa-Vicencio, kwuru, sị: “Mgbe Constantine malitere ịchị ma gbanwee ihe ụfọdụ n’ọchịchị, o yiri ka ọtụtụ Ndị Kraịst hà malitere ịrụ ọrụ gọọmenti, ịrụ ọrụ agha na ịbụ ndị ọchịchị.” Gịnị si na ya pụta? N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa gara aga, okpukpe ahụ nke malitere itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ghọziri okpukpe ọchịchị Rom na-akwado.

Taa, ọtụtụ okpukpe ndị sị na ha na-eso ụzọ Kraịst na-agwa ndị òtù ha ka ha na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, okpukpe ndị a anaghị eme ka Kraịst, ha anaghịkwa eme ka Ndị Kraịst oge mbụ.