Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ihe Ndị Kraịst Na-akụzi Si Abara Obodo Uru?

Olee Otú Ihe Ndị Kraịst Na-akụzi Si Abara Obodo Uru?

Olee Otú Ihe Ndị Kraịst Na-akụzi Si Abara Obodo Uru?

N’ISIOKWU ndị bu nke a ụzọ, anyị kwuru ihe mere ezigbo Ndị Kraịst na-anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, olee otú Ndị Kraịst si egosi na ha chọrọ ka ihe ka mma n’obodo? Otu ụzọ ha si eme ya bụ irube isi n’iwu Jizọs bụ́: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

E nwere ihe jikọrọ iwu ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, ya bụ ka ha gaa mee ka ndị mmadụ bụrụ ‘ndị na-eso ụzọ ya,’ na ime ihe o buru ụzọ gwa ha, nke bụ́ na ha ga-abụ nnu na ìhè nke ụwa. (Matiu 5:13, 14) Gịnị jikọrọ ha? Oleekwa uru ikwusa ozi ọma ga-abara ndị mmadụ?

Ihe Jizọs Kụziri Na-echebe Ndụ Ndị Mmadụ ma Na-eme Ka Ha Mata Eziokwu

A na-eji nnu echekwa ihe oriri. Otú ahụ ka ozi ọma ahụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya kwusaa n’ụwa niile nwere ike isi chebe ndụ ndị mmadụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ anabata ozi ọma ma mee ihe ha mụtara, ha na-echebe onwe ha ka ha ghara ịdaba n’omume rụrụ arụ juru n’ụwa taa. Olee otú ha si echebe onwe ha? Ha na-amụta otú ha ga-esi zere ihe ndị nwere ike ịkpatara ha ọrịa, dị ka ịṅụ sịga. Ha na-amụtakwa àgwà ọma ndị dị ka ịhụnanya, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, na ịdị mma. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Àgwà ọma ndị a ha na-akpa na-eme ka ha bakwuoro obodo ha uru. Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-ekwusara ndị agbata obi ha ozi ọma a nke na-echebe ndụ na-eme ihe ga-abara obodo ezigbo uru.

Gịnịkwanụ banyere ihe ahụ Jizọs kwuru nke bụ́ na ndị na-eso ụzọ ya bụ ìhè nke ụwa? Otú ahụ ìhè anyanwụ si eme ka ọnwa na-eti n’abalị, ndị na-eso ụzọ Kraịst na-emekwa ka “ìhè” si n’aka Jehova Chineke na-enwu. Otú ha si eme ya bụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịrụ ezi ọrụ.—1 Pita 2:12.

Jizọs mekwara ka anyị ghọta otú mmadụ ịbụ ìhè na mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ ya si yie. O kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-amụnye oriọna ma dọba ya, ọ bụghị n’okpuru nkata, kama n’elu ihe ndọba oriọna, ọ na-enwukwara ndị niile nọ n’ime ụlọ. Otú ahụ, meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ.” Ọ bụrụ na a mụnyere oriọna ma dọba ya n’elu ihe ndọba oriọna, mmadụ niile ga-ahụ ya nke ọma. Otú ahụ ka ndị mmadụ kwesịrị isi ahụ ozi ọma ezigbo Ndị Kraịst na-ekwusa na ọrụ ọma ha na-arụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs sịrị na ndị hụrụ ọrụ ọma ahụ ga-enye Chineke otuto, ọ bụghị Ndị Kraịst.—Matiu 5:14-16.

Ọrụ Ndị Kraịst Niile Ga-arụ

Mgbe Jizọs sịrị, “Unu bụ ìhè nke ụwa” na “meenụ ka ìhè unu na-enwu,” ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya niile ka ọ na-agwa okwu ndị ahụ. Ọ bụghị mmadụ ole na ole nọ n’okpukpe dị iche iche ga-arụ ọrụ ahụ Jizọs nyere iwu ka a rụọ. Kama, ọ bụ Ndị Kraịst niile bụ “ìhè” ahụ. Nde Ndịàmà Jehova asaa, bụ́ ndị bi n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ na ise, ghọtara na ọ bụ ọrụ ha ikwusara ndị agbata obi ha ozi ọma ahụ Kraịst chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya kwusaa.

Gịnị ka Ndịàmà Jehova na-ekwusara ndị mmadụ? Mgbe Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ọ gwaghị ha ka ha kwusaa otú a ga-esi weta mgbanwe n’obodo ma ọ bụ otú a ga-esi gbanwee ọchịchị ma ọ bụkwanụ otú a ga-esi mee ka ndị chọọchị na ndị ọchịchị bụrụ otu, ma ọ bụkwanụ ihe yiri ya. Kama, ọ gwara ha, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” (Matiu 24:14) N’ihi ya, ezigbo Ndị Kraịst taa na-eme ihe ahụ Jizọs kwuru. Ha na-ekwusara ndị agbata obi ha banyere Alaeze Chineke, nke bụ́ naanị ọchịchị ga-ebibi ụwa ajọ omume Setan ma weta ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-adị na ya.

Ọ bụrụ na ị gụọ akwụkwọ Matiu, Mak na Luk, ị ga-ahụ ụzọ ihe abụọ Jizọs mere mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma. Ihe abụọ ahụ gbasakwara ozi ezigbo Ndị Kraịst na-eje taa. A kọwara ihe ndị ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Olee otú ozi ọma Ndị Kraịst na-ekwusa si yie nnu?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Olee otú ozi Kraịst si yie oriọna nke a dọbara n’ebe gbara ọchịchịrị?