Olee Otú Jizọs Si Lee Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Anya?
Olee Otú Jizọs Si Lee Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Anya?
IHE Matiu, Mak, Luk na Jọn dere gosiri na mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, e nwere mgbe a chọrọ ka Jizọs tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dị ka ihe atụ, obere oge e mechara Jizọs baptizim, ya bụ, mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri atọ, Ekwensu chọrọ ka ọ bụrụ onye na-achị ụwa. Mgbe ọ fọrọ obere ka o jechaa ozi ya n’ụwa, ndị mmadụ chọrọ ime ya eze ha. Ndị mmadụ mechakwara chọọ ka ọ bụrụ onye na-akwado ọchịchị. Gịnị ka Jizọs mere? Ka anyị tụlee ọkwá ndị a chọrọ inye ya ma o tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchichị.
Onye na-achị ụwa. Matiu na Luk kwuru na Ekwensu gwara Jizọs na ya ga-enye ya “alaeze niile nke ụwa.” Chegodị echiche ọtụtụ ihe ọma Jizọs gaara emere ndị mmadụ ahụhụ na-echi ọnụ n’ala ma a sị na o kwetara ịbụ onye na-achị ụwa! È nwere onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ ịkwụsị ahụhụ ndị mmadụ na-ata ga-ajụ ịbụ onye ọchịchị ụwa ma e nye ya ikike ịchị? Ma Jizọs ekweghị ịbụ onye na-achị ụwa.—Matiu 4:8-11.
Eze. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọtụtụ ndị chọrọ onye ọchịchị ga-akwụsị ahụhụ niile ha na-ata. Mgbe ha hụrụ ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ, ha chọrọ ka ọ bụrụ eze ha. Jizọs ò kwetara ịbụ eze ha? Jọn kwuru, sị: “Ebe Jizọs maara na ha na-achọ ịbịa jide ya ka ha mee ya eze, ọ gaghachiri n’ugwu ahụ naanị ya.” (Jọn 6:10-15) O doro anya na Jizọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Onye na-akwado ọchịchị. Ka anyị hụ ihe merenụ mgbe ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka e gbuo Jizọs. Ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na ndị na-eso ụzọ Herọd bịakwutere Jizọs. Ndị na-eso ụzọ ndị Farisii chọrọ ka ndị Juu chịwa onwe ha, ebe ndị na-eso ụzọ Herọd na-akwado ọchịchị ndị Rom. Ha chọrọ ịma ọchịchị nke Jizọs na-akwado. N’ihi ya, ha jụrụ ya ma ndị Juu hà kwesịrị ịna-akwụ ndị Rom ụtụ isi.
Mak dere ihe Jizọs zara ha. O dere, sị: “‘Gịnị mere unu ji na-ele m ule? Wetaranụ m mkpụrụ ego dinarịọs ka m lee.’ Ha wetara otu. O wee Mak 12:13-17) Akwụkwọ bụ́ Church and State—The Story of Two Kingdoms kwuru ihe mere Jizọs ji zaa ihe ahụ ọ zara ha. Akwụkwọ ahụ kwuru na Jizọs achọghị ịbụ onye ọchịchị. Jizọs gosikwara na e nwere iwu ndị ọchịchị anyị kwesịrị idebe nakwa na anyị kwesịrị idebe iwu ndị Chineke nyere.
sị ha: ‘Ihe a ọ̀ bụ onyinyo onye na aha onye?’ Ha wee sị ya: ‘Ọ bụ nke Siza.’ Jizọs wee sị: ‘Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.’” (Ọ bụ eziokwu na Kraịst etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata metụrụ ya n’obi. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mgbe Jizọs hụrụ ahụhụ ndị mmadụ na-ata, o wutere ya nke ukwuu. (Mak 6:33, 34) Ma, Jizọs akwụsịghị ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ụwa, ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ chọrọ ka o tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Ihe atụ ndị ahụ anyị tụlere mere ka o doo anya na Jizọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma oleekwanụ maka Ndị Kraịst taa? Hà kwesịrị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?