Otú Mmadụ Nwere Ike Isi Bụrụ Ezigbo Onye Kraịst na Ezigbo Nwa Amaala
Otú Mmadụ Nwere Ike Isi Bụrụ Ezigbo Onye Kraịst na Ezigbo Nwa Amaala
GỊNỊ bụ ihe abụọ dị mkpa Jizọs mere mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma? Nke mbụ bụ na ọ gbalịrị inyere ndị mmadụ aka ka ha gbanwee otú ha si ebi ndụ, ọ bụghị ịgbanwe ọchịchị. Dị ka ihe atụ, ọ dị ihe Jizọs kwusiri okwu ya ike n’ozizi ahụ ọ nọ n’elu ugwu zie. Tupu ya ekwuo na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịbụ nnu na ìhè, ọ gwara ndị na-ege ya ntị na ndị nwere ezigbo obi ụtọ bụ “ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” O kwukwara, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, . . . ndị dị ọcha n’obi, . . . ndị na-eme udo.” (Matiu 5:1-11) Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịghọta na ha kwesịrị ịkpọ ihe Chineke kpọrọ asị asị ma na-eme ihe ndị dị Chineke mma. Ha kwesịkwara iji obi ha niile na-ejere Chineke ozi.
Nke abụọ bụ na mgbe Jizọs hụrụ ndị na-ata ahụhụ, o meteere ha ebere ma mee ka ahụhụ ha na-ata belata. Ma mkpa ya mgbe ahụ abụghị ime ka ndị mmadụ kwụsị ịta ahụhụ. (Matiu 20:30-34) Ọ gwọrọ ndị ọrịa, ma o meghị ka ndị mmadụ kwụsị ịrịa ọrịa. (Luk 6:17-19) O nyeere ndị a na-emegbu emegbu aka, ma ndị mmadụ ka na-ata ahụhụ n’ihi ikpe na-ezighị ezi. O nyere ndị agụụ na-agụ nri, ma agụụ ka na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ.—Mak 6:41-44.
Jizọs Mere Ka Ndị Mmadụ Na-akpa Àgwà Ọma ma Belata Ahụhụ Ha Na-ata
Gịnị mere na mkpa Jizọs abụghị ịgbanwe ọchịchị ma ọ bụ ịkwụsị ahụhụ kpamkpam, kama ya abụrụ ime ka ndị mmadụ na-akpa àgwà ọma na ibelata ahụhụ ha na-ata? Jizọs maara na Chineke bu n’obi iji Alaeze Ya bibie ọchịchị ụmụ mmadụ ma kwụsị ihe niile na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata. (Luk 4:43; 8:1) N’ihi ya, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs chọrọ ka o jirikwuo oge ya na-agwọ ndị ọrịa, Jizọs gwara ha, sị: “Ka anyị gaa ebe ọzọ, n’obodo nta ndị dị nso, ka m wee kwusaakwa ozi ọma n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ n’ihi nzube a ka m ji bịa.” (Mak 1:32-38) Jizọs belatara ahụhụ ọtụtụ ndị mmadụ na-ata, ma ihe bụ́ mkpa ya bụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịkụziri ha Okwu Chineke.
Ndịàmà Jehova na-eme ihe ahụ Jizọs mere mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. Ha na-enyere ndị mmadụ aka, si otú ahụ na-eme ka ahụhụ ndị mmadụ na-ata belata. Ma mkpa Ndịàmà Jehova abụghị ịkwụsịcha ahụhụ ndị mmadụ na-ata. Ha kwetara na ọ bụ Alaeze Chineke ga-akwụsị ihe niile na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata. (Matiu 6:10) Ndịàmà Jehova na-eme ka Jizọs, ya bụ, mkpa ha abụghị ịgbanwe ọchịchị kama ọ bụ ime ka ndị mmadụ na-akpa àgwà ọma. Ihe a ha na-eme na-enyere ndị mmadụ aka n’eziokwu, n’ihi na ihe kacha akpatara ndị mmadụ nsogbu abụghị ọchịchị, kama ọ bụ àgwà ndị mmadụ.
Ezigbo Ụmụ Amaala
Ndịàmà Jehova ghọtakwara na ha kwesịrị ịbụ ezigbo ụmụ amaala. N’ihi ya, ha na-erubere ndị ọchịchị isi. Ha na-eji akwụkwọ ndị ha na-ebipụta na ozi ọma ha na-ekwusa enyere ndị mmadụ aka irubere ndị ọchịchị isi. Ma, mgbe ndị ọchịchị gwara Ndịàmà Jehova mee ihe Chineke sịrị ha emela, Ndịàmà Jehova anaghị ekwe. Ha ‘na-erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’—Ọrụ 5:29; Ndị Rom 13:1-7.
“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” bụ́ nke dị na peeji nke 18 na magazin a.
Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị niile bi n’obodo ha Baịbụl n’efu. Ihe a ha na-akụziri ndị mmadụ emeela ka ọtụtụ nde mmadụ kwụsị àgwà ọjọọ. Ha na-enyere ọtụtụ puku mmadụ aka kwa afọ ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị dị ka ịṅụ sịga, ịṅụbiga mmanya ókè, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịgba chaa chaa na ịkwa iko. Ndị a ha nyeere aka aghọọla ezigbo ụmụ amaala n’ihi na ha amụtala ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya eme.—Gụọ isiokwu bụ́Ihe ọzọ bụ na ihe Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị mmadụ na-eme ka ndị niile nọ n’ezinụlọ na-akwanyere ibe ha ùgwù ma na-emekọ ihe ọnụ, ma di na nwunye, ma nne na nna na ụmụ ha, ma ụmụaka na ụmụaka ibe ha. Ihe ndị a na-eme ka ezinụlọ dịkwuo ná mma. Ọ bụrụ na ezinụlọ dị iche iche e nwere n’obodo adị mma, obodo ga-adịkwa mma.
Ugbu a anyị tụlechara isiokwu ise a, ì chere na Baịbụl kwadoro ka Ndị Kraịst na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Azịza ya doro anya. Ọ kwadoghị ya. Ma ezigbo Ndị Kraịst hà kwesịrị ịbụ ezigbo ụmụ amaala? Ee, ha kwesịrị. Olee otú ha ga-esi bụrụ ma ezigbo Ndị Kraịst ma ezigbo ụmụ amaala? Otú ha ga-esi eme ya bụ ime ihe ahụ Jizọs kwuru, ya bụ, ịbụ nnu na ìhè nke ụwa.
Ndị na-agbalịsi ike ime ihe ahụ Jizọs kwuru na-abara ma onwe ha ma ezinụlọ ha uru. Ha na-abakwara obodo ha uru. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova nọ n’ebe i bi ụtọ ịkọwakwuru gị otú ha si na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl ugbu a n’ebe i bi. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 Ọ bụrụ na ị chọọ, i nwere ike ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova n’ebe ha na-edebe ihe n’Ịntanet, nke adres ya bụ www.watchtower.org
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]
Mkpa Jizọs abụghị ịgbanwe ọchịchị, kama ọ bụ inyere ndị mmadụ aka ka ha gbanwee otú ha si ebi ndụ
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
Ndịàmà Jehova ghọtara na ha kwesịrị ịbụ ezigbo ụmụ amaala