Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbasi Mgba Ike Iji Zie Ozi Ọma na Tesalonaịka

Ịgbasi Mgba Ike Iji Zie Ozi Ọma na Tesalonaịka

Ịgbasi Mgba Ike Iji Zie Ozi Ọma na Tesalonaịka

Tesalonaịka bụ obodo dị n’ebe ugwu Gris. Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ Tesaloniki ma ọ bụ Salonika. E nwere nnukwu ọdụ ụgbọ mmiri na ya. A kọwa akụkọ ebe Ndị Kraịst oge gboo kwusara ozi ọma, karịchaa, ebe ndị Pọl bụ́ onyeozi nke ndị mba ọzọ kwusara ozi ọma, a ga-akpọrịrị obodo a aha.—ỌRỤ 9:15; NDỊ ROM 11:13.

N’IHE dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu na iri isii gara aga, Pọl na Saịlas, gara Tesalonaịka. N’oge a, Pọl nọ n’agba nke abụọ nke ozi ọma o kwusaara ndị mba ọzọ. Ihe a bụ nke mbụ ha na-abịa ikwusa ozi ọma banyere Kraịst n’ebe a na-akpọ Yurop ugbu a.

Mgbe ha na-erute Tesalonaịka, o doro anya na ha chetara otú e si tie ha ihe ma tụọ ha mkpọrọ na Filipaị, bụ́ obodo a ma ama na Masedonia. Pọl mechadịrị gwa ndị Tesalonaịka na mgbe ya bịara n’obodo ha, na ya ‘gbasiri mgba ike zie ha ozi ọma Chineke.’ (1 Ndị Tesalonaịka 2:1, 2) Ihe ọ̀ ga-akara ha mma na Tesalonaịka? Olee ihe ga-eme ma ha kwusawa ozi ọma n’obodo a? Ndị mmadụ hà ga-ege ntị? Ka anyị burugodị ụzọ mata ihe ụfọdụ mere n’obodo a tupu oge ndịozi.

Obodo A Lụrụ Ọtụtụ Agha na Ya

Ebe e si nweta aha obodo a, bụ́ Tesalonaịka, bụ n’okwu Grik nke pụtara ọgụ na mgba. E kwuru na n’afọ 352 Tupu A Mụọ Kraịst, eze ndị Masedonia, bụ́ Filip nke Abụọ, onye bụ́kwa nna Alegzanda Onye Ukwu, meriri otu agbụrụ bi n’ebe a na-akpọ Tesali ná mba Gris. A kọrọ na eze ahụ gụrụ otu nwa ya nwaanyị Tesaloniki iji na-echeta mmeri ahụ o meriri Tesali. Nwa ya nwaanyị a mechara lụọ Kasanda, bụ́ onye ghọrọ eze mgbe Alegzanda, nwanne Tesaloniki, nwụrụ. N’ihe dị ka afọ 315 Tupu A Mụọ Kraịst, Kasanda wuru otu obodo n’ebe ọdịda anyanwụ nke ebe a na-akpọ Kalsidisi. Ọ gụrụ obodo a o wuru aha nwunye ya bụ́ Tesaloniki. N’oge ochie, a lụrụ agha ọtụtụ ugboro n’obodo Tesalonaịka.

Tesalonaịka bụkwa obodo ego dị na ya. Ọ bụ n’obodo a ka e nwere otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri kacha mma n’Oké Osimiri Ejiyan. N’oge ndị Rom na-achị ụwa, obodo a dị n’okporo ụzọ a ma ama nke a na-akpọ Via Egnatia. Ebe ọ bụ na Tesalonaịka nwere ọdụ ụgbọ mmiri, nweekwa okporo ụzọ e si aga obodo ndị ọzọ, ọ bụ otu n’ime ebe e si ebubata ma ọ bụ ebupụ ngwá ahịa n’ebe niile ndị Rom na-achị. N’oge ochie, ndị Gọt, ndị Slav, ndị Frank, ndị Venishia, na ndị Tọk gbachara mbọ ka ha nweta obodo a n’ihi na ego dị na ya. Ụfọdụ n’ime ha lụrụ agha kwafuo ọbara tupu ha enweta obodo a. Ma, ka anyị lebazie anya n’oge Pọl gara n’obodo a, bụ́ mgbe e bidoro ịgbasi mgba ike ikwusa ozi ọma na ya.

Pọl Erute Tesalonaịka

Mgbe ọ bụla Pọl gara ikwusa ozi ọma n’obodo ọ na-agabeghị mbụ, ọ na-ebukarị ụzọ agakwuru ndị Juu ibe ya n’ihi na ha ma Okwu Chineke, ọ dịkwaara ya mfe ịgwa ha okwu ma nyere ha aka ka ha ghọta ozi ọma ọ na-ekwusa. Otu ọkà mmụta kwuru na ihe mere Pọl ji na-eme otú ahụ bụ na ọ hụrụ ndị Juu ibe ya n’anya. Ụfọdụ chekwara na ihe kpatara ya bụ na ọ na-achọ iji ndị Juu na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke bidogodị ozi ọma ọ na-ekwusara ndị mba ọzọ.—Ọrụ 17:2-4.

N’ihi ya, mgbe Pọl rutere Tesalonaịka, o bu ụzọ banye n’ụlọ nzukọ ndị Juu, bụ́ ebe “ya na [ndị Juu] nọ na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ . . . , na-akọwa ma jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ, ka o sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie, na-asị: ‘Ọ bụ onye a bụ Kraịst, ya bụ, Jizọs a, onye m na-ekwusara unu.’”—Ọrụ 17:2, 3, 10.

Ọtụtụ ndị Juu achọghị iji ntị anụ ihe ahụ Pọl gwara ha, ya bụ, na onye bụ́ Mesaya ahụ tara ahụhụ ma nwụọ. Ebe ọ bụ na ndị Juu na-ele anya na Mesaya ga-anapụta ha n’aka ndị Rom, ọ na-ewe ha iwe ịnụ na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ. Pọl mere ka ndị Juu ‘tụgharịa uche’ n’Akwụkwọ Nsọ, ‘kọwaakwa’ ihe ọ na-ekwu ma ‘jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ’ gosi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Ihe mere o ji mee ihe ndị a bụ ka ha kweta ihe ọ na-agwa ha. Nke a gosiri na ọ bụ ezigbo onye nkụzi. * Ma gịnị ka ndị ahụ Pọl na-agwa okwu mere mgbe ọ na-akụziri ha ihe ọma niile ahụ?

Ozi Ọma Ha Rụpụtara Ihe n’Agbanyeghị Nsogbu

Ọtụtụ ndị Grik ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu na ụfọdụ ndị Juu, nakwa “ọtụtụ ndị inyom a ma ama” ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Okwu ahụ bụ́ “ndị inyom a ma ama” dabara adaba n’ihi na e nwere ọtụtụ ụmụ nwaanyị ọnụ na-eru n’okwu na Masedonia. Ụmụ nwaanyị ndị Masedonia na-eso n’ọchịchị, ha na-enwe ụlọ ma ọ bụ ala nke ha, ha na-azụ ahịa, na-emekwa ụfọdụ ihe ụmụ nwoke na-eme. E nwedịrị ihe ụfọdụ e wuru iji na-echeta ụfọdụ n’ime ha. Ọtụtụ ụmụ nwaanyị a ma ama na Tesalonaịka gere ntị n’ozi ọma otú ahụ Lidia, bụ́ nwaanyị na-achụ nta ego na Filipaị, gere ntị n’ozi ọma. O nwere ike ịbụ na ụmụ nwaanyị ndị a si n’ezinụlọ a ma ama ma ọ bụ ya abụrụ na ndị di ha bụ ndị a ma ama na Tesalonaịka.—Ọrụ 16:14, 15; 17:4.

Ma ndị Juu malitere imere Pọl anyaụfụ. Ha “kpọọrọ ụfọdụ ndị ikom ọjọọ n’etiti ndị na-akwụgharị n’ọma ahịa, ha wee ghọọ otu ìgwè mmadụ, wee mee ka obodo ahụ jupụta n’oké ụzụ.” (Ọrụ 17:5) Olee ụdị mmadụ ndị ahụ ha kpọọrọ bụ? Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru na ha bụ “ndị agamevu na ndị iberiibe.” O kwukwara, sị: “O yiri ka o nweghị ihe gbasara ndị a na ihe Pọl na-ekwu; kama ha bụ ndị aghara, ndị ọ na-abụ obere ihe metụhaala, ha agbakọta mebiwe ihe.”

Ìgwè mmadụ ahụ “wakpokwara ụlọ Jesin [onye Pọl na Saịlas nọ n’ụlọ ya] wee na-achọ inyefe ha n’aka ìgwè ahụ na-akpa aghara.” Ma mgbe ha na-ahụghị Pọl, ha gawara na nke ndị na-achị obodo. “Ha dọkpụụrụ Jesin na ụmụnna ụfọdụ gakwuru ndị na-achị obodo, na-eti mkpu, sị: ‘Ndị a, bụ́ ndị kpuworo elu ụwa mmadụ bi ihu, nọkwa n’ebe a.’”—Ọrụ 17:5, 6.

Ebe ọ bụ na Tesalonaịka bụ isi obodo Masedonia, ọ bụ obodo kwụụrụ onwe ya. Ndị na-elekọta obodo a bụ ụmụ amaala Tesalonaịka, bụ́ ndị a họpụtara ka ha na-ahụ maka nsogbu ọ bụla dapụtara n’obodo. Ndị ahụ “na-achị obodo” * bụ ndị e nyere ọrụ ịhụ na e nweghị nsogbu n’obodo nakwa na ọ bụrụgodị na nsogbu adapụta, ha ga-ahụ na e doziri ya ka ndị Rom ghara ịbịa chịwa obodo a otú ha si achị obodo ndị ọzọ. N’ihi ya, ndị ahụ na-achị obodo agaghị achọ iji ntị anụ na e nwere ndị bịara ịkpata nsogbu n’obodo.

Ìgwè mmadụ ahụ bokwara Ndị Kraịst ahụ ebubo ka njọ. Ha sịrị: “Ndị a niile na-emekwa ihe megidere iwu Siza, na-ekwu na e nwere eze ọzọ, bụ́ Jizọs.” (Ọrụ 17:7) Otu ọkà mmụta kwuru na ebubo ahụ e boro ha pụtara na ha ‘bụ ndị nnupụisi na ndị na-agba ọchịchị Rom mgba okpuru.’ Ndị eze Rom “anakwanụghị eji ntị anụ ebe a kpọrọ onye ọzọ eze n’obodo ndị ha na-achị, ọ gwụla ma è bu ụzọ nata ha ikike.” Ihe ọzọ mere o ji yie ka ebubo ahụ ọ̀ bụ eziokwu bụ na Pọl nọ na-ekwusa na Jizọs bụ Eze. Ihe mekwaranụ ndị Rom ji gbuo Jizọs bụ na a sịrị na ọ na-agba ọchịchị Rom mgba okpuru.—Luk 23:2.

Ihe niile a ndị na-achị Tesalonaịka nụrụ mere ka iwe wee ha. Ma, ebe ọ bụ na a hụghị Pọl na Saịlas, e nweghịkwanụ ezigbo ihe gosiri na ebubo ahụ e boro ha bụ eziokwu, ‘ha natara Jesin na ndị nke ọzọ ihe ibé zuru ezu ma hapụ ha ka ha laa.’ (Ọrụ 17:8, 9) Ihe ibé ahụ a natara Jesin na Ndị Kraịst ndị ọzọ gosiri na ha na-ekwe nkwa na Pọl ga-apụ n’obodo ahụ nakwa na ọ gaghị abịaghachi ịkpata nsogbu. O nwere ike ịbụ na Pọl bu ihe a merenụ n’obi mgbe o kwuru na “Setan nọchiiri [ya] ụzọ” ma gbochie ya ịgaghachi n’obodo ahụ.—1 Ndị Tesalonaịka 2:18.

N’ihi nsogbu a, e ji abalị zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa Beria. Ozi ọma Pọl ziri na Beria mere ka ọtụtụ ndị ghọọ Ndị Kraịst. Nke a mere ka iwe wewe ndị Juu ahụ nọ na Tesalonaịka. Ha wee si ebe ahụ gaa kilomita iri asatọ rute Beria ma mee ka ndị mmadụ malite imegide Pọl. N’ihi nke a, Pọl hapụkwara Beria gawa Atens, ma mgba a na-agbasi ike iji zie ozi ọma akwụsịghị.—Ọrụ 17:10-14.

Mgba Ọgbakọ Ọhụrụ ahụ Gbara

Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na e mechara nwee ọgbakọ na Tesalonaịka, ma nsogbu Ndị Kraịst bi n’ebe ahụ nwere abụghị naanị mmegide ahụ ndị mmadụ na-emegide ha. Nsogbu ọzọ bụ na ọtụtụ ndị obodo ahụ bụ ndị na-ekpere arụsị na ndị na-eme omume rụrụ arụ. Nke a mekwara ka Pọl na-echegbu onwe ya ma Ndị Kraịst ahụ hà ga-anọgidesikwa ike na-efe Chineke.—1 Ndị Tesalonaịka 2:17; 3:1, 2, 5.

Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka maara na ozugbo ha kwụsịrị iso ndị obodo ha na-ekpere arụsị ma kwụsịkwa iso ha na-eme ihe ndị ọzọ, ọtụtụ ndị bụ́bu ndị enyi ha ga-ewesawa ha iwe ma ọ bụ kpọọ ha asị. (Jọn 17:14) Ihe ọzọ bụ na e nwere ọtụtụ ụlọ arụsị na Tesalonaịka bụ́ ndị a rụụrụ chi dị iche iche, dị ka chi ndị Gris bụ́ Zus, Atemis, na Apolo, nakwa ụfọdụ chi ndị Ijipt. Ihe ọzọ na-ewu ewu n’obodo ahụ bụ ife Siza, a chọkwara ka ụmụ amaala niile soro n’ememme ndị a na-emere Siza. Ọ bụrụ na mmadụ esoghị mee ememme ndị a, a ga-ewere na onye ahụ na-enupụrụ Siza isi.

Ikpere arụsị mere ka ọtụtụ ndị na-ebi ndụ rụrụ arụ. Dị ka ihe atụ, ndị na-efe Kabirọs, bụ́ chi ndị Tesalonaịka, na chi ndị ọzọ bụ́ Dayọnaịsis na Afrọdaịt, nakwa chi ndị Ijipt bụ́ Aịsis, na-akwa iko aghara aghara ma na-eri oriri oké mkpọtụ mgbe ha na-efe chi ndị a. Ọtụtụ ndị n’obodo a na-agba akwụna, ọtụtụ ndị nwekwara ndị iko. Ịkwa iko abụghịrị ha ihe ọjọọ. Ha mụtara omenala ndị Rom. Otu ọkà mmụta kwuru na ‘e nwere ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị akwụna n’obodo a bụ́ ndị onye ọ bụla agụụ ịkwa iko na-agụ nwere ike ịgakwuru. Ndị dọkịta e nwekwaranụ n’ebe ahụ na-agwa ndị mmadụ na onye ọ bụla agụụ ịkwa iko gụwara kwesịrị inye ahụ́ ya ihe ọ chọrọ.’ Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji dọọ Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha “zere ịkwa iko” na “iji anyaukwu na-enwe agụụ mmekọahụ,” zerekwa “adịghị ọcha.”—1 Ndị Tesalonaịka 4:3-8.

Ha Meriri na Mgba Ahụ

Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka gbasiri mgba ike ka ha nọgidesie ike na-efe Chineke. N’agbanyeghị mmegide, ihe isi ike, omume rụrụ arụ, na ikpere arụsị juru n’obodo ahụ, Pọl jara ha mma maka ‘ọrụ ha ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ, ndọgbu ha ji ịhụnanya na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, na ntachi obi ha,’ nakwa mbọ niile ha gbara kwusaa ozi ọma n’ebe niile.—1 Ndị Tesalonaịka 1:3, 8.

N’afọ 303 Oge Anyị, a malitere ịkpagbu Ndị Kraịst n’ebe niile ndị Rom na-achị, mkpagbu ahụ kpụkwa ọkụ n’ọnụ. Onye kacha kpagbuo ha bụ eze a na-akpọ Siza Galeriọs, bụ́ onye biri na Tesalonaịka. Eze a chọrọ obodo a mma ma wuo ọtụtụ nnukwu ụlọ na ya. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ o wuru ka dịkwa taa, n’agbanyeghị na e nweela ndị dakasịrịnụ.

Taa, Ndịàmà Jehova nọ na Tesaloniki na-ekwusara ndị agbata obi ha ozi ọma. Ọtụtụ mgbe, ha na-anọ n’ihu ihe ndị ahụ eze ahụ, bụ́ onye kpagburu Ndị Kraịst, wuru ekwusa ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na o nwere mgbe a kpagburu Ndịàmà Jehova n’oge na-adịchabeghị anya n’obodo a, e nwere ihe dị ka ọgbakọ Ndịàmà Jehova iri isii ugbu a n’obodo a. Ha jikwa obi ha niile na-ekwusa ozi ọma. Ozi ọma a ha na-ekwusa gosiri na mgba ahụ a gbara ọtụtụ narị afọ gara aga iji zie ozi ọma n’obodo a ka na-aga nke ọma.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 O nwere ike ịbụ na Pọl ji ihe ndị e dere n’Abụ Ọma 22:7; 69:21; Aịzaya 50:6; 53:2-7; na Daniel 9:26 gosi ha na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.

^ par. 16 Okwu a bụ́ “ndị na-achị obodo” adịghị n’akwụkwọ ndị Gris dere. Ma, a hụrụ ebe e dere ya n’ihe ndị e gwupụtara n’ebe dị nso na Tesalonaịka. E dere ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ na otu narị afọ gara aga. Ihe ndị a a hụrụ gosiri na ihe e dere n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi bụ eziokwu.

[Map dị na peeji nke 18]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Via Egnatia

MASEDONIA

Filipaị

Amfipọlis

Tesalonaịka

Beria

TESALI

Oké Osimiri Ejiyan

ATENS

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

N’elu: otú Tesaloniki dị taa

N’okpuru: ụlọ ahịa na ebe ndị Rom oge ochie na-asa ahụ́

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ụlọ dị okirikiri nke dị nso ná nnukwu mgbidi Galeriọs rụrụ; isi siza Galeriọs; ndị na-ekwusa ozi ọma n’akụkụ nnukwu mgbidi Galeriọs rụrụ

[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 18]

Isi mmadụ a tụrụ atụ: © Bibliothèque nationale de France; ihe e dere n’ahụ́ ájá: Thessalonica Archaeological Museum, copyright Hellenic Ministry of Culture and Tourism

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 20]

Foto abụọ dị n’okpuru: 16th Ephorate of Prehistoric and Classical Antiquities, copyright Hellenic Ministry of Culture and Tourism

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 21]

Foto dị n’etiti: Thessalonica Archaeological Museum, copyright Hellenic Ministry of Culture and Tourism