Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-akpọ Aha Chineke?

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-akpọ Aha Chineke?

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-akpọ Aha Chineke?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị mere Chineke ji nwee aha?

O doro anya na ị chọrọ ka ndị mmadụ na-akpọ gị aha gị kama ịkpọ gị “nwoke m,” “maazị,” ma ọ bụ “nwaanyị.” Ọ bụ aha gị ka e ji ama onye ị bụ. E nwere aha ndị a na-etu Chineke, dị ka “Ọkaakaa,” “Onyenwe anyị,” “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” na ‘Onye Okike Ukwu anyị.’ (Jenesis 15:2; 17:1; Ekliziastis 12:1) Ma Chineke nwere aha ọ gụrụ onwe ya. Ọ gụrụ onwe ya aha a iji nyere anyị aka ịmata onye ọ bụ nakwa ka anyị na ya dịrị ná mma. N’asụsụ Igbo, aha ahụ bụ Jehova.—Gụọ Aịzaya 42:8.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl ji okwu ndị dị ka “Chineke” na “Onyenwe anyị” dochie aha Chineke, ma mgbe e dere Akwụkwọ Nsọ Hibru, aha Chineke pụtara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ugboro puku asaa. O doro anya na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ mara aha ya.—Gụọ Aịzaya 12:4.

2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mata aha Chineke?

Ịma aha Chineke abụghị naanị ịma otú e si akpọ aha ya. Mmadụ ịma aha Chineke pụtara onye ahụ na Chineke ịdị n’ezigbo mma. Aha ahụ bụ́ Jehova pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Aha a na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke nwere ike ime ihe ọ bụla dị mkpa ka o mee iji mezuo nzube ya. N’ihi ya, mmadụ ịma aha Chineke pụtara na onye ahụ ga-ekwere na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere. (Abụ Ọma 9:10) Ọ bụrụ na mmadụ ma aha Chineke ma na-akpọ aha ahụ, onye ahụ ga-atụkwasị Chineke obi ma jiri ofufe ya kpọrọ ihe ná ndụ ya. Jehova Chineke ga-echebekwa onye ahụ.—Gụọ Abụ Ọma 91:14.

3. Gịnị mere Chineke ji chọọ ka ndị mmadụ mara aha ya?

Chineke chọrọ ka ndị mmadụ mara aha ya maka na ọ ga-abara ha uru. Ịmata aha Chineke ga-eme ka ha na Chineke bụrụ enyi, meekwa ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji chọọ ka anyị mee ka ndị mmadụ mara aha ya!—Gụọ Jọn 17:3; Ndị Rom 10:13, 14.

Jizọs mere ka ndị mmadụ mata aha Chineke. Ọ kụziiri ha ụdị onye Chineke bụ, iwu Ya, na ihe ndị O kwere ná nkwa. Taa, ndị na-eso ụzọ Jizọs ka na-arụ ọrụ ahụ Jizọs rụrụ. Ha na-eme ka ndị mmadụ mara aha Chineke n’ebe niile n’ụwa. Ha ji otu obi na-eme ya n’ihi na ha bụ ‘ndị Chineke wepụtaara aha ya.’—Gụọ Ọrụ 15:14; Jọn 17:26.

4. Olee otú Chineke ga-esi mee ka aha ya dị nsọ?

Jehova Chineke chọrọ ka e doo aha ya nsọ n’ihi na ndị mmadụ emebiela aha ya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-asị na ọ bụghị Chineke kere ihe niile nakwa na anyị ekwesịghị irubere ya isi. E nwekwara ndị na-ekwu na Chineke ahụghị anyị n’anya nakwa na ọ bụ ya na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata. Ndị na-ekwu ihe ndị a na-emebi aha Chineke. Ma Chineke agaghị ahapụ ha ka ha nọgide na-emebi aha ya. Ọ ga-ebibi ha.—Gụọ Abụ Ọma 83:17, 18.

Jehova ga-eme ka aha ya dị nsọ mgbe Alaeze ya ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ ma mee ka e nwee udo n’ụwa a nakwa ka obi ruo ndị mmadụ ala. (Daniel 2:44) N’oge na-adịghị anya, mmadụ niile ga-amara na Jehova bụ ezi Chineke.—Gụọ Ezikiel 36:23; Matiu 6:9.

Gịnị ka i kwesịrị ime? Gbalịa ka gị na Chineke dịrị ná mma. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịmụ Okwu Chineke na iso ndị hụrụ Chineke n’anya na-efe Ya. Mgbe Jehova ga-eme ka aha ya dị nsọ, ọ ga-echeta ndị na-erubere ya isi.—Malakaị 3:16.

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 17]

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 1 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ebe e dere aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’oge gboo