Ihe Niile E dere na Ya Bụ Otu
Ihe Niile E dere na Ya Bụ Otu
“Ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”—2 PITA 1:21.
IHE MERE BAỊBỤL JI DỊ ICHE: Ọtụtụ akwụkwọ ndị e dere n’oge ochie na-ekwu ihe dị iche n’ihe akwụkwọ ndị ọzọ e dere ha na ha otu oge na-ekwu. Ọ bụrụ na ndị na-ebighị ndụ n’otu oge nakwa ndị na-ebighị n’otu ebe edee akwụkwọ dị iche iche, o siri ezigbo ike ka akwụkwọ ahụ niile kwuo otu ihe. Ma, Baịbụl kwuru na ọ bụ otu Onye kwuru ihe e dere n’akwụkwọ iri isii na isii dị na ya, nke mere ka ihe ha niile na-ekwu bụrụ otu.—2 Timoti 3:16.
IHE GOSIRI NA IHE NIILE E DERE NA BAỊBỤL BỤ OTU: Otu onye na-azụ atụrụ nke dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ isii gara aga, onye aha ya bụ Mozis, dere n’akwụkwọ mbụ nke Baịbụl na e nwere “mkpụrụ” nke ga-azọpụta ụmụ mmadụ. E mechara kwuo n’akwụkwọ ahụ na mkpụrụ ahụ ga-esi n’ezinụlọ Ebreham, Aịzik, na Jekọb. (Jenesis 3:15; 22:17, 18; 26:24; 28:14) Mgbe ihe dị ka narị afọ ise gafere, Netan onye amụma kwuru na mkpụrụ ahụ ga-esi n’ezinụlọ Eze Devid. (2 Samuel 7:12) Otu puku afọ Netan kwuchara nke a, Pọl onyeozi kwuru na ndị ga-eso ná mkpụrụ ahụ bụ Jizọs na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ọ họọrọ. (Ndị Rom 1:1-4; Ndị Galeshia 3:16, 29) N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, e buru amụma n’akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl na ndị so ná mkpụrụ ahụ ga-agba àmà banyere Jizọs n’ụwa, nakwa na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha biri n’eluigwe ma soro Jizọs chịa otu puku afọ. Ha na Jizọs ga-eso bibie Ekwensu ma zọpụta ụmụ mmadụ.—Mkpughe 12:17; 20:6-10.
IHE NDỊ ỌKÀ MMỤTA KWURU: Mgbe Louis Gaussen lebachara anya nke ọma n’akwụkwọ iri isii na isii dị na Baịbụl, o dere na otu ihe tụrụ ya n’anya bụ ‘otú Baịbụl si kwuo otu ihe n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ndị so dee ya, n’agbanyeghịkwa na o were ha otu puku afọ na narị afọ ise iji dechaa ya.’ Ihe ọzọ tụrụ ya n’anya bụ na ‘onye ọ bụla n’ime ha dere akwụkwọ nke ya ka à ga-asị na ya na ibe ya bu otu ihe n’obi, nke bụ́ ịkọ otú Ọkpara Chineke ga-esi azọpụta ụwa a.’—Akwụkwọ bụ́ Theopneusty—The Plenary Inspiration of the Holy Scriptures.
GỊNỊ KA I CHERE? Ọ bụrụ na o were ihe dị ka mmadụ iri anọ ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ ise iji dechaa otu akwụkwọ, ì chere na akwụkwọ ahụ ga na-ekwu otu ihe? Í cheghị na Baịbụl dị iche?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
“Anyị achọpụtala na ihe niile e dere na Baịbụl, malite na Jenesis ruo Mkpughe, na-ekwu otu ihe . . . O nweghị akwụkwọ ọzọ yiri ya ma ọ bụ nke hụrụ azụ ya anya.”—AKWỤKWỌ BỤ́ THE PROBLEM OF THE OLD TESTAMENT, NKE JAMES ORR DERE