Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Nupụrụ Isi ma Mechaa Mee Ihe A Gwara Ya

O Nupụrụ Isi ma Mechaa Mee Ihe A Gwara Ya

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

O Nupụrụ Isi ma Mechaa Mee Ihe A Gwara Ya

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe i nupụrụ isi ma jụ ime ihe a gwara gị? * O nwere ike ịbụ na i kiriri otu ihe a na-eme na tiivi nke mama gị ma ọ bụ papa gị gwara gị ekirila. O nwekwara ike ịbụ na o mechara wute gị na i kiriri ya. E nwere otu nwoke nke jụburu ime ihe a gwara ya. Aha ya bụ Neaman. Ka anyị hụ ihe mere o ji mechaa mee ihe ahụ a gwara ya.

Weregodị ya na anyị nọ ndụ ihe karịrị puku afọ atọ gara aga bụ́ mgbe Neaman nọ ndụ. Neaman bụ nnukwu mmadụ. Ọ bụ onyeisi ndị agha obodo Siria. Ọ bụ ya na-agwa ndị agha ya ihe ha ga-eme, ha na-erubekwara ya isi. Ma Neaman malitere ịrịa ọrịa ọjọọ a na-akpọ ekpenta. Ọrịa a mere ka akpụkpọ ahụ́ ya jọọ njọ, o nwekwara ike ịbụ na ọ na-afụ ya ezigbo ụfụ.

Nwunye Neaman nwere otu nwatakịrị nwaanyị onye Izrel bụ́ odibo ya. Otu ụbọchị, nwata ahụ gwara nwunye Neaman na e nwere nwoke a na-akpọ Ịlaịsha n’Izrel. Ọ gwara ya na Ịlaịsha ga-agwọli Neaman ọrịa ahụ na-arịa ya. Mgbe Neaman nụrụ nke a, o jikeere gawa ịhụ Ịlaịsha ozugbo. Neaman wetara ọtụtụ onyinye ọ ga-enye Ịlaịsha, kpọrọkwa ụfọdụ ndị agha ya mgbe ọ na-aga. O bu ụzọ gaa na nke eze Izrel ka ọ gwa ya ihe mere o ji bịa.

Mgbe Ịlaịsha nụrụ na Neaman bịara, o zigaara eze ozi ka ọ gwa Neaman ka ọ bịa hụ ya. Oge Neaman rutere n’ụlọ Ịlaịsha, Ịlaịsha gwara onye na-ejere ya ozi ka ọ gaa gwa Neaman ka ọ gaa mikpuo onwe ya n’Osimiri Jọdan ugboro asaa. Ịlaịsha kwuru na ọ bụrụ na Neaman emee ihe a, ọrịa ya ga-ala. Gịnị ka i chere Neaman mere mgbe a gwara ya ihe ahụ Ịlaịsha kwuru?

Iwe were ya. Ọ jụrụ ime ihe ahụ onye amụma Chineke gwara ya. Ọ gwara ndị agha ya, sị: ‘E nwere osimiri ndị ka osimiri Jọdan mma n’obodo anyị, gịnị mere ọ ga-eji asị m gaa mikpuo onwe gị n’osimiri Jọdan?’ Neaman weere iwe chọwa ịla. Ma, ị̀ ma ihe ndị agha ya jụrụ ya?— Ha jụrụ ya, sị, ‘A sị na onye amụma ahụ gwara gị mee ihe siri ike omume, ọ̀ bụ na ị gaghị eme ya? Gịnị mere na ị gaghị eme obere ihe a ọ gwara gị mee?’

Neaman gere ndị agha ya ntị ma mee ihe ha gwara ya. Ọ gara mikpuo onwe ya ugboro isii n’osimiri ahụ. Mgbe o mikpuru onwe ya nke ugboro asaa, ihe ọ hụrụ riri ya ọnụ. Ekpenta ya alaala! Akpụkpọ ahụ́ ya adịla mma! Ozugbo ahụ, ọ laghachiri n’ụlọ Ịlaịsha ka ọ gaa kelee ya. Ụlọ Ịlaịsha dịkwanụ ihe dị ka kilomita iri anọ na asatọ ma e si n’osimiri Jọdan gawa ya. Neaman nyere Ịlaịsha onyinye ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa o ji bịa, ma Ịlaịsha ekweghị anara ya ihe ọ bụla.

Neaman rịọziri Ịlaịsha otu ihe. Ị̀ ma ihe ọ rịọrọ ya?— Ọ sịrị ya, ‘Biko kponye m ájá ịnyịnya ibu abụọ ga-ebu ka m kporo laa.’ Ị̀ ma ihe ọ chọrọ iji ájá ahụ mee?— Neaman sịrị na ya chọrọ iji ájá ahụ si n’Izrel, bụ́ obodo ndị Chineke, wụsa n’ebe ya ga-anọ na-achụrụ Chineke àjà. Neaman kwukwara na ọ bụ naanị Jehova ka ya ga na-akpọrọ isiala, na ya emekataghị kpọọrọ chi ọzọ isiala! Ọ jụburu ime ihe a gwara ya, ma ugbu a ọ chọziri irubere ezi Chineke isi.

Ị̀ hụrụ otú i nwere ike isi dị ka Neaman?— Ọ bụrụ na ị na-enupụ isi, ị ga-akwụsịli ya. I gee ndị mụrụ gị ntị ma mee ihe ha gwara gị, ị ga-abụ nwa na-erube isi.

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

2 Ndị Eze 5:1-19

Luk 4:27

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.