Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Onye Na-anụ Ekpere?

È Nwere Onye Na-anụ Ekpere?

È Nwere Onye Na-anụ Ekpere?

“M na-enwebu obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị. Ma m na-ekpekwa ekpere mgbe ụfọdụ. Amaghị m ma è nwere onye na-ege m ntị, ma ọ na-adị m ka ya bụrụ na e nwere onye na-ege m ntị. Obi anaghị adị m ụtọ, ndụ m enweghịkwa isi. Obi akaghị m ikweta na Chineke dị n’ihi na m chere na ọ bụ naanị ndị na-amaghị nke a na-akọ kweere na Chineke.”—PATRICIA, * ONYE AYALAND.

È NWERE mgbe ọ na-adị gị otú ahụ ọ dị Patricia? Ị̀ na-ekpe ekpere mgbe ụfọdụ n’agbanyeghị na ị na-enwe obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị? Cheta na ọ bụghị naanị gị ka ọ na-adị otú ahụ. Legodị ihe a chọpụtara.

▪ Na Briten, a gbara puku mmadụ abụọ na narị abụọ ajụjụ ọnụ. Ma, ọ bụ naanị ihe dị ka narị mmadụ ise kwetara na e nwere Onye kere ụwa, nakwa na ọ na-anụ ekpere. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe dị ka otu puku mmadụ na narị abụọ n’ime ndị ahụ a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha na-ekpe ekpere mgbe ụfọdụ.

▪ Mgbe a gbara puku mmadụ iri ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị si ná mba dị iche iche n’ụwa, e nwere ndị kwuru na ha ekweghị na Chineke. N’ime ndị ahụ na-ekweghị na Chineke, ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla n’ime ha kwuru na ya na-ekpe ekpere.

Gịnị Mere Ha Ji Enwe Obi Abụọ?

Otu onye Ingland aha ya bụ Allan kwuru, sị: “M na-ekwubu na ekweghị m na Chineke n’ihi na echere m na ihe mere e ji nwee okpukpe dị iche iche n’ụwa bụ iji ha kpaa ego nakwa iji ha na-atụrụ ndị mmadụ ihe ha ga-eme. Echekwara m na ọ bụrụ na Chineke dị, a garaghị enwe ọtụtụ ihe ọjọọ n’ụwa. Ma mgbe ụfọdụ, m na-anọrọ onwe m gwa ‘onye m na-amaghị okwu.’ M na-ajụkwa onwe m, sị, ‘Gịnị mere m ji dịrị ndụ n’ụwa?’”

Onye ọ bụla ọ dị otú ọ dị Allan nwere ihe mere o ji enwe obi abụọ ma è nwere onye na-anụ ekpere. Ọtụtụ mgbe, ihe mere ndị mmadụ ji eche na o nweghị onye na-anụ ekpere bụ na e nwere ọtụtụ ajụjụ ndị ha na-amaghị azịza ha. Ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị ahụ bụ:

▪ È nwere Onye kere ihe niile?

▪ Gịnị mere okpukpe ndị e nwere n’ụwa a ji akpatakarị nsogbu?

▪ Gịnị mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ?

Ọ bụrụ na ị mata azịza nke ajụjụ ndị a, obi ọ̀ ga-esikwu gị ike ikpe ekpere?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.