Ònye Bụ Onye Na-anụ Ekpere?
Ònye Bụ Onye Na-anụ Ekpere?
Ọ BỤRỤ na e nwere Onye na-anụ ekpere, ọ ga-abụrịrị ya kere ihe niile. È nwere onye ọzọ nwere ike ịma ihe dị mmadụ n’obi ma ọ́ bụghị Onye kere ụbụrụ mmadụ? È nwere onye ọzọ nwere ike ịza ụmụ mmadụ ekpere ha ma gbooro ha mkpa ha? Ma i nwere ike ịjụ, sị: ‘Mmadụ ò kwesịrị ikwere na e nwere Onye kere ihe niile?’
Ọtụtụ ndị chere na ọ bụrụ na mmadụ ekwere na e nwere Onye kere ihe niile, ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ ekweghị n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a chọpụtarala. Ma, ihe a ọtụtụ ndị chere abụghị eziokwu. Legodị ihe a chọpụtara.
▪ N’oge na-adịbeghị anya, a gbara ndị ọkachamara dị otu puku, narị isii na iri anọ na isii ajụjụ ọnụ. Ndị ọkachamara a na-akụzi ihe ọmụmụ sayensị na mahadum iri abụọ na otu kacha ewu ewu n’Amerịka. N’ime ha niile, ọ bụ naanị ihe dị ka narị mmadụ ise na iri ise kwuru na ha ekweghị na Chineke.
Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị kweere na Chineke.
Ihe Na-egosi na E Nwere Onye Kere Ihe Niile
Ànyị kwesịrị ikwere na e nwere Onye na-anụ ekpere ma ọ bụrụ na e nweghị ihe mere anyị ga-eji kwere? Mbanụ. Ọ bụghị eziokwu na ndị kweere na Chineke enweghị ezigbo ihe mere ha ji kwere na ya. Baịbụl kwuru na okwukwe bụ “atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu, ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” (Ndị Hibru 11:1) Dị ka ihe atụ, anyị anaghị ahụ ifufe anya. Ma anyị ma na ifufe dị n’ihi na anyị na-ahụ otú o si ebugharị ahịhịa na osisi ma o fewe. Otú ahụ ka ọ dịkwa Onye na-anụ ekpere. Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị ahụ ya anya, e nwere ọtụtụ ihe ga-eme ka obi sie anyị ike na ọ dị adị.
Ebee ka anyị ga-ahụ ihe ndị na-egosi na Chineke dị? Ha juru ebe niile. Baịbụl kwuru, sị: “N’ezie, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Ì kwetara ihe a Baịbụl kwuru? Ọ bụrụ na ị hụ ma ọ bụ chee echiche banyere otú ihe niile dị n’eluigwe na ụwa si arụ ọrụ, otú ihe ndị dị ndụ si malite, ma ọ bụ otú ụbụrụ mmadụ si arụ ọrụ, ị ga-ekweta na e nwere onye ka mmadụ nke kere ihe ndị a.
Ma ọ bụghị naanị ihe ndị e kere eke ga-eme ka anyị mata banyere Chineke. Mmadụ ịhụ ihe ndị gosiri na Chineke dị yiri ebe mmadụ nọ n’ime ụlọ na-anụ ụda ụkwụ onye na-achọ ịbata n’ụlọ ya. Ụda ụkwụ ahụ ọ na-anụ gosiri na e nwere onye na-abịa, ma ọ maghị onye ọ bụ. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ịmata onye ọ bụ, ọ ga-emepe ụzọ ya. Ọ bụrụkwa na anyị chọrọ ịmata onye kere ihe niile, o nwere ụzọ anyị ga-emepe nke yiri ụzọ ahụ onye ahụ mepere.
Baịbụl bụ ụzọ ahụ ị ga-emepe ka i nwee ike ịmata Chineke. Ọ bụrụ na ị gụọ Baịbụl ma hụ otú amụma ndị e dere na ya si na-emezu, ị ga-ahụ ihe ndị na-egosi na Chineke dị. * Ihe ọzọ dị mkpa ị ga-ahụ bụ otú Chineke si mesoo ndị mmadụ ihe, bụ́ nke ga-eme ka anyị mata ụdị onye ọ bụ.
Olee Ụdị Onye Onye Na-anụ Ekpere Bụ?
Baịbụl kwuru na Onye ahụ na-anụ ekpere bụ onye dị adị, kwuokwa na anyị nwere ike ịmata ya. N’eziokwu, ọ bụrụ na Onye ahụ na-anụ ekpere adịghị adị, ọ gaghị na-anụ ekpere anyị. Ma, Baịbụl kwuru, sị: “Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ na-anụ ekpere nke ndị niile nwere okwukwe na ya. Onye ahụ na-anụ ekpere nwekwara aha. Baịbụl sịrị: “Jehova nọ ndị ajọ omume n’ebe dị anya, ma ekpere ndị ezi omume ka ọ na-anụ.”—Ilu 15:29.
2 Ndị Kọrịnt 13:11; 1 Timoti 1:11) Baịbụl kwukwara na mgbe ihe ọjọọ juru n’ụwa, ‘o wutere Chineke.’ (Jenesis 6:5, 6) Ndị mmadụ na-asị na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ ka o wee lee ha ule. Ma nke a abụghị eziokwu. Baịbụl sịrị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ.” (Job 34:10) Ma, i nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ bụrụ na ọ bụ Chineke kere anyị, bụrụkwa Onye pụrụ ime ihe niile, gịnị mere o ji kwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ?’
Ihe anyị na-eme nwere ike iwute Jehova ma ọ bụ mee ya obi ụtọ. Baịbụl kwuru na Jehova bụ “Chineke nke ịhụnanya” na “onye obi ụtọ.” (Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ha chọrọ ime. Nke a na-egosi anyị ụdị onye Chineke bụ. Obi ọ́ dịghị gị ụtọ na Chineke kere gị ka ị na-ekpebiri onwe gị otú ị ga-esi ebi ndụ? Ma ọ dị mwute na ọtụtụ ndị taa anaghị ekpebi ime ihe dị mma. Ha na-eme ihe na-akpatara ma ha ma ndị ọzọ nsogbu. Ma, e nwere ajụjụ ọzọ anyị kwesịrị ichebasiri echiche ike. Ajụjụ ahụ bụ: Olee otú Chineke ga-esi mee ka ndị mmadụ kwụsị ịta ahụhụ ma hapụkwa ụmụ mmadụ ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ndị ha chọrọ ime? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile ka o nyere gị aka ịmata na e dere Baịbụl n’ike mmụọ nsọ Chineke.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ihe Ọjọọ Ndị A Na-eme n’Okpukpe Hà Na-eme Ka I Chewe na Chineke Adịghị?
Ọ dị mwute na okpukpe dị iche iche e nwere n’ụwa na-eme ka o siere ndị mmadụ ike ikweta na e nwere Onye na-anụ ekpere nke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Otú okpukpe dị iche iche si akwado agha, na-ahapụ ndị òtù ha ndị na-emetọ ụmụaka ka ha nọrọkwa n’okpukpe ha, nakwa otú ha si eme ka ndị òtù ha na-egbusị ndị mmadụ emeela ka ọtụtụ ndị kwetaburu na Chineke dị kwuwezie na Chineke adịghị.
Gịnị mere okpukpe ji emekarị ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ? Ọ bụ n’ihi ihe ha na-amụta n’okpukpe ha. Baịbụl buru amụma na e nwere mgbe ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst ga na-eji chọọchị akpa arụ. Pọl onyeozi gwara ndị okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst, sị: “Ndị ikom ga-esikwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.”—Ọrụ Ndịozi 20:29, 30.
Chineke kpọrọ okpukpe ụgha asị. N’eziokwu, Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru na okpukpe ụgha ga-aza ajụjụ maka “ọbara . . . nke ndị niile e gburu n’ụwa.” (Mkpughe 18:24) N’anya Chineke, ikpe ọbara mara okpukpe ụgha n’ihi na ha anaghị akụziri ndị mmadụ ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke, onye bụ́ ịhụnanya.—1 Jọn 4:8.
Onye na-anụ ekpere na-emetere ndị niile okpukpe ụgha ndị e nwere n’ụwa na-akpatara nsogbu ebere. Ebe ọ bụ na Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, ọ ga-esi n’aka Jizọs bibie okpukpe ụgha niile n’oge na-adịghị anya. Jizọs sịrị: “Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị?’ . . . Ma mgbe ahụ, m ga-ekwupụtara ha, sị: Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.”—Matiu 7:22, 23.