Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụrụ na Chineke Agbaghara Mmadụ Mmehie, Ọ̀ Na-echefu Mmehie Ahụ?

Ọ Bụrụ na Chineke Agbaghara Mmadụ Mmehie, Ọ̀ Na-echefu Mmehie Ahụ?

Bịaruo Chineke Nso

Ọ Bụrụ na Chineke Agbaghara Mmadụ Mmehie, Ọ̀ Na-echefu Mmehie Ahụ?

AZỊZA ya bụ ee. Jehova kwuru banyere ndị ọ hụrụ n’anya, sị: “M ga-agbaghara ha njehie ha, agakwaghị m echeta mmehie ha.” (Jeremaya 31:34) Ihe amaokwu a kwuru mere ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na Jehova agbaghara onye mmehie chegharịrị echegharị mmehie ya, ọ na-echefu mmehie ahụ. Ma nke a ọ̀ pụtara na ọ bụrụ na Onye kere ihe niile dị n’eluigwe na n’ụwa agbaghara mmadụ mmehie, na o nweghịzi ike icheta mmehie ahụ? Ihe Ezikiel kwuru mere ka anyị ghọtakwuo otú o si bụrụ na mgbe Chineke gbaghaara mmadụ mmehie na o chefuola mmehie ahụ.—Gụọ Ezikiel 18:19-22.

Jehova si n’ọnụ Ezikiel onye amụma mee ka a mata na ya ga-ebibi Juda na Jeruselem. Ndị Juu hapụrụ ofufe Jehova, ihe ọjọọ wee ju n’ala ahụ. Jehova kwuru na ya ga-esi n’aka ndị Babịlọn bibie Jeruselem. Ma n’oge ahụ Jehova kwuru ihe ọ ga-eme ha, o kwukwara ihe ga-eme ka ha nwee olileanya. Ọ gwara ha na ọ bụ ihe onye ọ bụla mere ga-ekpebi ma ọ̀ ga-adị ndụ ma à ga-ebibi ya; onye ọ bụla ga-eji isi ya buru ihe o metere.—Amaokwu nke 19, 20.

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ akwụsị ihe ọjọọ ọ na-eme ma mewe ihe ọma? Jehova kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ajọ omume ahapụ mmehie niile o mere, debe ụkpụrụ m niile, meekwa ihe ziri ezi na ezi omume, ọ ga-anọgide na-adị ndụ. Ọ gaghị anwụ.” (Amaokwu nke 21) N’eziokwu, ọ bụrụ na onye mmehie ejiri obi ya dum chegharịa ma hapụ ajọ omume ya, Jehova ‘dị njikere ịgbaghara ya mmehie’ ya.—Abụ Ọma 86:5.

Oleekwanụ maka mmehie ndị onye ahụ mere? Jehova kwuru, sị: “A gaghị echeta iwu niile o mebiri iji mee ya ihe.” (Amaokwu nke 22) Ị̀ hụrụ na amaokwu a kwuru na “a gaghị echeta iwu niile o mebiri iji mee ya ihe”? Gịnị ka nke a pụtara?

Na Baịbụl, okwu Hibru a sụgharịrị ‘icheta’ apụtaghị naanị icheta ihe mere n’oge gara aga. Otu akwụkwọ kwuru banyere okwu a, sị: “Ọtụtụ mgbe, e kwuo [icheta,] ihe ọ pụtara bụ na e nwere ihe e mere ma ọ bụ na e nwere ihe a ga-eme.” N’ihi ya, “icheta ihe” nwere ike ịpụta “ime ihe.” Mgbe Jehova kwuru na ọ bụrụ na onye mmehie echegharịa, na ya ‘agaghị echeta iwu niile o mebiri iji mee ya ihe,’ ihe ọ na-ekwu bụ na ya agaghị emecha mee onye ahụ ihe maka mmehie ndị ahụ o mere, ya bụ, na ya agaghị ajụ onye ahụ ajụjụ mmehie ahụ ma ọ bụ taa ya ahụhụ n’ihi ya. *

Ihe a e kwuru n’Ezikiel 18:21, 22 na-egosi otú Chineke si agbaghara mmehie kpamkpam. Ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị mmehie, o nweghị ihe ga-eme ka ọ taa anyị ahụhụ n’ọdịnihu n’ihi mmehie ahụ. Kama nke ahụ, ọ na-awụfu mmehie ndị ahụ n’azụ ya. (Aịzaya 38:17) E nwere ike ịsị na ọ na-ehichapụ mmehie ndị ahụ.—Ọrụ Ndịozi 3:19.

Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, ọ dị mkpa ka Chineke meere anyị ebere. A sị ka e kwuwe, anyị na-eme mmehie ọtụtụ ugboro. (Ndị Rom 3:23) Ma Jehova chọrọ ka anyị mara na ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile chegharịa, ọ ga-agbaghara anyị. Mgbe ọ bụla ọ gbaghaara anyị mmehie anyị, ọ na-echefu ya, ya bụ, ọ gaghị ajụkwa anyị ajụjụ mmehie ahụ ma ọ bụ taa anyị ahụhụ n’ihi ya. Ọ̀ bụ na nke a anaghị eme anyị obi ụtọ? Otú a Chineke si agbaghara mmehie ọ́ naghị eme ka ị chọọ ịbịarukwu ya nso?

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Julaị:

Ezikiel 6-20

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Na Baịbụl, e kwuo na ‘e chetara njehie nke ndị mmehie,’ ihe o nwere ike ịpụta bụ na a “ga-ata ha ahụhụ.”—Jeremaya 14:10.