Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

GỊNỊ nyeere otu nwaanyị onye Filipinz aka ka ọ kwụsị ịṅụ oké mmanya ma mee ka ya na di ya na ụmụ ya dịkwuo ná mma? Gịnị mere otu nwoke onye Ọstrelia nke ịgba karat riri isi ji ghọọ onye na-ekwusa ozi ọma? Gụọ ihe ha kwuru.

‘Ọ dịrịghị m mfe ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị m na-akpa.’​—CARMEN ALEGRE

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1949

ABỤ M ONYE: FILIPINZ

NDỤ M BIRI: ANA M AṄỤ OKÉ MMANYA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo San Fenando, nke dị na steeti a na-akpọ Kamarinas Sọọ. Ma mgbe m toro, ebe m biri bụ n’obodo Antipolo, nke dị n’ebe a na-akpọ Rizal. Obodo Antipolo dị n’ugwu, e nwekwara ọtụtụ osisi na ahịhịa na ya. Mgbe m kwatara n’obodo a, ọtụtụ ndị ebighị na ya. Anaghị m ahụkarị ndị mmadụ n’okporo ụzọ n’abalị. Ma ugbu a, ọ ghọọla nnukwu obodo, ọtụtụ ndị bikwa na ya.

Obere oge m kwagachara Antipolo, mụ na otu nwoke aha ya bụ Benjamin kpawara, anyị mechakwara lụọ. Ma otú m tụrụ anya na ihe ga-adị ma m lụọ di abụghị otú ọ dị. M malitere ịṅụ oké mmanya n’ihi na m chere na ọ ga-eme ka m chefuo nsogbu dị n’ezinụlọ anyị. Àgwà m bịara jọọ njọ nke na m na-emesi di m na ụmụ m ike. Anaghị m ejideli onwe m ma ha mee ihe ọ bụla na-adịghị m mma. Anaghịkwa m asọpụrụ di m. Ihe ndị a mere ka udo ghara ịdị n’ezinụlọ anyị.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: E nwere nwanne di m aha ya bụ Editha. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ọ gwara mụ na di m ka anyị gbalịa ka anyị na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Anyị kwetara n’ihi na anyị chere na ọ ga-eme ka udo dị n’ezinụlọ anyị.

E nwere ọtụtụ ihe anyị mụtara mgbe anyị na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ihe Baịbụl kwuru ná Mkpughe 21:4 metụrụ m n’obi nke ukwuu. Amaokwu ahụ kwuru ihe Chineke ga-emere ndị ga-ebi na paradaịs mgbe Alaeze ya ga-achịwa ụwa. O kwuru na Chineke ‘ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.’ M chọrọ iso ná ndị Chineke ga-emere ihe ọma ndị ahụ.

Achọpụtara m na m kwesịrị ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị m na-akpa. Ọ dịrịghị m mfe ịkwụsị ha, ma m mechakwara kwụsị ịṅụ oké mmanya. M mụtakwara inwe obiọma na inwere di m na ụmụ m ndidi. M malitere ịkwanyere di m ùgwù ma na-akwado ya n’ihe niile ọ na-eme n’ezinụlọ anyị.

Mgbe mụ na di m bidoro ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ihe ndị anyị hụrụ ebe ahụ masịrị anyị nke ukwuu. Anyị chọpụtara na Ndịàmà Jehova anaghị agba chaa chaa, ha anaghị aṅụbiga mmanya ókè, ha anaghịkwa akpa ókè. Ha na-akwanyere onye ọ bụla ùgwù. Ọ bịara doo anyị anya na Ndịàmà Jehova bụ ezigbo Ndị Kraịst.—Jọn 13:34, 35.

URU NDỊ M RITERELA: Ihe akala mma n’ezinụlọ anyị. Mụ na di m bizi n’udo, ọ na-atọkwa anyị ụtọ ịga na-akụziri ndị ọzọ Baịbụl. Ndịàmà Jehova na ụmụ anyị ndị nwoke abụọ torola eto na ndị nwunye ha amụwakwala Baịbụl. Anyị na-atụ anya na otu ụbọchị ha ga-eso anyị fewe Jehova. N’eziokwu, ife Jehova bụ ihe kacha mma mmadụ nwere ike ime ná ndụ.

“Echere m na m bụ anwụ anwụ.”​—MICHAEL BLUNSDEN

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1967

ABỤ M ONYE: ỌSTRELIA

NDỤ M BIRI: ỊGBA KARAT RIRI M ISI

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m n’otu obodo a na-akpọ Ọlberi nke dị na Niu Saụt Wels. Obodo a mara ezigbo mma, ego dịkwa na ya. Ndị ọjọọ nọkwa n’obodo a otú ha nọkwa n’ọtụtụ obodo ndị mepere emepe. N’agbanyeghị nke ahụ, Ọlberi mara mma obibi.

Ezinụlọ anyị bara ọgaranya. Ọ bụ eziokwu na nne na nna m gbara alụkwaghịm mgbe m dị afọ asaa, ha na-emere mụ na nwanne m nwoke na ụmụnne m nwaanyị abụọ ihe ọ bụla anyị chọrọ. Agara m ụlọ akwụkwọ kacha mma n’ụlọ akwụkwọ niile ndị mmadụ nwe n’ebe ahụ. Papa m chọrọ ka m bụrụ o ji ego achụ nta ego ma m gachaa akwụkwọ. Ma obi m dị n’egwuregwu n’ihi na m na-eme nke ọma n’ịgba ígwè nakwa n’ịgba karat. M mechara nweta ọrụ n’ebe a na-arụzi ụgbọala, ọrụ a na-enyekwa m ohere ịga mee egwuregwu ndị ahụ.

Ọ na-atọ m ụtọ ime egwuregwu n’ihi na ọ na-eme ka ahụ́ gbasie m ike. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka m̀ bụ anwụ anwụ. Ebe ọ bụ na ịgba karat doro m anya, m nwere ike imerụ ndị ọzọ ahụ́. Ma onye na-akụziri m karat kụziiri m ka m na-ejide onwe m ma ghara ịkpa àgwà ọjọọ. Ọ na-agwa m mgbe niile na ọ dị mkpa ka m na-erube isi ma jiri ndị ọzọ kpọrọ ihe.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, amụtara m na Jehova kpọrọ ime ihe ike asị. (Abụ Ọma 11:5) Ná mmalite, m gwara onwe m na ịgba karat abụghị ime ihe ike, na ọ bụ egwuregwu nkịtị. Eweere m na karat na-akụziri mmadụ àgwà ọma, otú ahụ Baịbụl si akụzikwa àgwà ọma. Di na nwunye na-akụziri m Baịbụl nweere m ezigbo ndidi. Ọ dịghị mgbe ha gwara m kwụsị ịgba karat, naanị ihe ha mere bụ ịna-akụziri m Baịbụl.

Ka m na-amụtakwu Baịbụl, mụ na Jehova bịara dịkwuo ná mma, agbanwekwara m otú m si eche echiche. Obi tọrọ m ụtọ mgbe m mụtara ihe Jizọs, bụ́ Ọkpara Jehova, mere. Ọ bụ eziokwu na Jizọs siri ezigbo ike, ọ dịghị mgbe o mere ihe ike. Ihe o kwuru na Matiu 26:52 metụrụ m n’obi. Amaokwu ahụ sịrị: “Ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.”

Ka m na-amụtakwu banyere Jehova, otú ahụkwa ka m na-ahụkwu ya n’anya ma na-asọpụrụ ya. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m mụtara na Onye kere anyị hụrụ m n’anya, n’agbanyeghị na ọ bụ ya kacha ike, marakwa ihe karịa onye ọ bụla. Obi tọkwara m ụtọ mgbe m mụtara na ọ bụrụgodị na mụ emehie Jehova, ma ọ bụ ya adị m ka mụ agaghị emeli ihe Jehova chọrọ, Jehova agaghị ajụ m, ma ọ bụrụhaala na m na-agba mbọ ime ihe dị ya mma. Ihe mere m ezigbo obi ụtọ obi bụ nkwa a o kwere, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’” (Aịzaya 41:13) Mgbe m ghọtara otú Jehova hụruru m n’anya, m kpebiri ife ya.

Ama m na ịkwụsị ịgba karat ga-esiri m ezigbo ike. Ma amakwa m na obi ga-adị Jehova ụtọ ma m kwụsị ya, o dokwara m anya na ọ dịghị ihe ọ bụla m hapụrụ nke karịrị ife Jehova. Mgbe m kpebisiri ike na m ga-akwụsị ịgba karat bụ mgbe m gụrụ ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:24. Ebe ahụ sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ.” Aghọtara m na o nweghị otú m ga-esi na-efe Jehova, na-agbakwa karat, n’ihi na mee elu mee ala, karat ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ m. Ama m na oge eruola ka m họrọ onye ga-abụ nna m ukwu.

Ọ dịrịghị m mfe ịkwụsị ịgba karat. Mgbe ụfọdụ, obi na-adị m ụtọ na m na-eme Jehova obi ụtọ. Ma o nwere mgbe ọ na-adị m ka m̀ mechuru onye na-akụziri m karat ihu. Ndị na-agba karat na-ewere mmadụ imechu onye ọzọ ihu ka mmehie na-enweghị mgbaghara. Ọ na-akadịrị ụfọdụ ndị mma igbu onwe ha kama ịnọ ndụ na-edi ihere ha menyere onwe ha.

Obi akaghị m ịga kọọrọ onye na-akụziri m karat ihe mere m ji chọọ ịkwụsị ịgba karat. Kama ịga gwa ya, ihe m mere bụ ịkwụsị ịga ebe anyị na-amụ karat. Akwụsịkwara m ihe ọ bụla jikọrọ mụ na ya na ndị ọzọ mụ na ha na-agba karat. Ama m na karat ahụ m kwụsịrị ịgba bụ ihe m kwesịrị ime, ma o wutekwara m na akọrọghị m ndị ahụ mụ na ha na-agbabu karat ihe ndị m mụtara na Baịbụl. Ọ bịaziri na-adị m ka m̀ mechuru Jehova ihu tupu mụ amalitedị ife ya. Ihe niile a nọ na-enye m nsogbu n’obi. Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ m kpewe ekpere, anaghị m ekpecha ya, mụ ebewezie ákwá.

Ọ ga-abụrịrị na Jehova hụrụ ihe dị mma n’ime m n’ihi na o mere ka ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ anyị nyere m aka. Otú ha si kasie m obi ma gosi na ha hụrụ m n’anya abụghị ihe e ji ọnụ akọ. Ihe a kọrọ na Baịbụl banyere Devid na Bat-shiba kasikwara m obi. Ọ bụ eziokwu na Devid mere mmehie ndị dị oké njọ, Jehova gbaghaara ya mgbe o ji obi ya niile chegharịa. Mgbe m chebaara akụkọ a echiche, o nyeere m aka ịghọta na Jehova ga-agbaghakwara m.

URU NDỊ M RITERELA: Tupu m malite ịmụ Baịbụl, m na-eche naanị banyere onwe m, ihe gbasara ndị ọzọ anaghị emetụ m n’obi. Aka Jehova nyeere m na aka ọmarịcha nwunye m lụrụ kemgbe afọ asaa nyeere m, emeela ka m mụta otú m ga-esi na-eme ka ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ m n’obi. Anyị nwekwara ọtụtụ ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl, ụfọdụ n’ime ha bụkwa ndị ọdachi dakwasịrị. Obi na-atọ m ụtọ mgbe ọ bụla m hụrụ otú ndị ọzọ si na-agbanwe ndụ ha n’ihi otú Jehova si hụ anyị n’anya. Agaraghị m enwe ụdị obi ụtọ a ma ọ bụrụ na m bụ ọkaibe n’ịgba karat.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

“Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m mụtara na Onye kere anyị hụrụ m n’anya, n’agbanyeghị na ọ bụ ya kacha ike, marakwa ihe karịa onye ọ bụla”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

“Unu Emeela Maka Isiokwu A Magburu Onwe Ya!”

Akụkọ ndị a a kọrọ n’isiokwu a bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” hà tọrọ gị ụtọ? Akụkọ abụọ a so n’ihe karịrị akụkọ iri ise a kọrọla n’Ụlọ Nche kemgbe a malitere ibipụta isiokwu a n’ọnwa Ọgọst nke afọ 2008. Isiokwu a bụ isiokwu kacha atọ ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị ụtọ. Gịnị mere o ji atọ ha ụtọ?

Ndị a kọrọla akụkọ ha n’isiokwu a si n’ebe dị iche iche n’ụwa. Tupu ụfọdụ n’ime ha amalite ịmụ banyere Jehova Chineke, ha bara ọgaranya, ma ndụ ha enweghị isi. Ndị nke ọzọ nwekwara nsogbu ndị ọzọ, dị ka iwe oké iwe, ịṅụ ọgwụ ike, ma ọ bụ ịṅụ oké mmanya. E nwekwara ndị nke fere Jehova mgbe ha bụ nwata, ma ha emechaa kwụsị ife ya. Akụkọ niile a na-egosi na mmadụ nwere ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị ọ na-akpa ma mewe ihe dị Chineke mma. Ime otú a na-abara onye ọ bụla mere ya uru. Olee uru akụkọ ndị a na-abara ndị gụrụ ha?

Otu onye na-agụ akụkọ ndị a kọrọ otú o si jiri akụkọ ndị a kọrọ n’Ụlọ Nche February 1, 2009, nyere ụfọdụ ụmụ nwaanyị ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ aka.

▪ O kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime ndị mkpọrọ ahụ na-enwe ụdị nsogbu mmadụ atọ ndị a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu ahụ nwere. Ihe kacha ruo ha n’obi bụ foto ndị gosiri otú ndị a kọrọ akụkọ ha dị tupu ha amụwa Baịbụl na foto ndị nke gosiri otú ha dị mgbe ha fewere Chineke nakwa ihe e kwuru banyere ụdị ndụ onye nke ọ bụla n’ime ha biri na mbụ. Ọtụtụ ndị mkpọrọ ahụ bikwara ụdị ndụ ahụ. Mmadụ abụọ n’ime ndị mkpọrọ ahụ malitere ịmụ Baịbụl mgbe ha gụchara akụkọ ndị ahụ.”—C. W.

Akụkọ ndị a ruru ụfọdụ ndị na-agụ ya n’obi. Dị ka ihe atụ, Ụlọ Nche Eprel 1, 2011, kọrọ akụkọ otu nwoke aha ya bụ Guadalupe Villarreal. Nwoke a na-edina ụmụ nwoke ibe ya. Ma ọ kwụsịrị ụdị ndụ ahụ ọ na-ebi ma bido ife Jehova. Ọtụtụ ndị gụrụ akụkọ Guadalupe Villarreal detaara anyị akwụkwọ ozi mgbe ha gụchara ya. Legodị ihe mmadụ abụọ n’ime ha kwuru.

▪ “Akụkọ Guadalupe ruru m nnọọ n’obi. Ọ tọrọ m ụtọ ịhụ na mmadụ nwere ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ọ na-akpa n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya ma jiri Okwu Jehova kpọrọ ihe.”—L. F.

▪ “Na mbụ, m na-ezi onye ọ bụla m hụrụ ozi ọma, ma ndị nwoke na-edina nwoke ibe ha ma ndị nwaanyị na-edina nwaanyị ibe ha. Ma n’oge na-adịbeghị anya, achọpụtara m na anaghịzi m ezi ha ozi ọma, mgbe ụfọdụ, m na-ezedị ha eze. Isiokwu a baara m ezigbo uru. O meela ka m lewezie ụdị ndị ahụ anya otú Jehova si ele ha anya, ya bụ, ka ndị nwere ike imecha fewe Jehova.”—M. K.

Akụkọ ọzọ ruru ọtụtụ ndị gụrụ ya n’obi bụ akụkọ Victoria Tong. Akụkọ a gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 1, 2011. Victoria kọrọ ọtụtụ nsogbu o nwere mgbe ọ bụ nwata. O kwuru na n’agbanyeghị na ya efeela Jehova ọtụtụ afọ, ọ na-adị ya ka Jehova ahụghị ya n’anya. O kwukwara ihe nyeere ya aka imecha ghọta na Jehova hụrụ ya n’anya. Legodị ihe ụfọdụ ndị kwuru mgbe ha gụchara akụkọ ya.

▪ “Akụkọ Victoria bara m n’obi. Enweela m ọtụtụ nsogbu ná ndụ m. N’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agafeela m ghọrọ Onyeàmà Jehova, ọ na-adị m ka o nweghị uru m bara ná ndụ. Akụkọ Victoria mere ka m gbalịsikwuo ike iwere onwe m otú Jehova si were m.”—M. M.

▪ “Mgbe m dị obere, ikiri ndị gba ọtọ riri m isi, ma m jisiri ike kwụsị ya. N’oge na-adịbeghị anya, m kiriri ya ọzọ. M gakwuuru ndị okenye e nwere n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova kọọrọ ha ihe m mere ka ha nyere m aka. Kemgbe ahụ, m na-agbalịsi ike ka m ghara ikiri ya ọzọ. Ndị okenye ahụ nyeere m aka ịghọta na Chineke ka hụrụ m n’anya nakwa na ọ ga-emere m ebere. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka nwere mgbe ọ na-adị m ka o nweghị uru m bara, na-adịkwa m ka Jehova agaghị ahụli m n’anya. Akụkọ Victoria nyeere m ezigbo aka. Ugbu a aghọtala m na mgbe ọ bụla m chere na Chineke agaghị agbagharali m, ihe m na-ekwu bụ na àjà ahụ Ọkpara ya ji ndụ ya chụọ agaghị ekpuchili mmehie m. Achakapụtala m akụkọ a debe ya n’ebe m ga na-ahụ ya anya ka m nwee ike ịna-agụ ya ma na-echebara ya echiche mgbe ọ bụla ọ dị m ka o nweghị uru m bara. Unu emeela maka isiokwu a magburu onwe ya unu na-ebipụta!”—L. K.