Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Kpọrọ Mmegbu Asị

Chineke Kpọrọ Mmegbu Asị

Maka Ndị Na-eto Eto

Chineke Kpọrọ Mmegbu Asị

Ihe ị ga-eme: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na e nwere ebe ị nọ na-ekiri ka ihe ndị ị na-agụ na-eme. Werekwa ya na ị na-anụ ihe ndị ị na-agụ akụkọ ha na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị a kọrọ akụkọ ha: Ehab, Jezibel, Nebọt, na Ịlaịja

Ihe a kọrọ: Jezibel mere ka Eze Ehab gbuo mmadụ ka Ehab wee nweta ubi vaịn.

1 CHEBARA OTÚ IHE NDỊ A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ 1 NDỊ EZE 21:1-26.

Olee otú i chere ndị a a kọrọ akụkọ ha dị?

Ehab ․․․․․

Jezibel ․․․․․

Nebọt ․․․․․

Ịlaịja ․․․․․

Olee ụdị olu i chere Jezibel na Ehab ji kwuo okwu n’amaokwu nke 5 ruo nke 7?

․․․․․

Kọọ otú i chere ihe e kwuru n’amaokwu nke 13 si mee.

․․․․․

Olee ụdị olu i chere Ehab na Ịlaịja ji kwuo okwu n’amaokwu nke 20 ruo nke 26?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Olee ụdị àgwà Jezibel nwere bụ́ nke anyị nwere ike ịhụ n’ihe e kwuru n’amaokwu nke 7 na nke 25?

․․․․․

Olee ụdị àgwà Ehab nwere bụ́ nke anyị nwere ike ịhụ n’ihe e kwuru n’amaokwu nke 4?

․․․․․

Olee ndị ọzọ Ehab gburu ka o nwee ike inweta ubi vaịn Nebọt? (Gụọ 2 Ndị Eze 9:24-26.)

․․․․․

N’anya Jehova, olee ụdị mmadụ Ehab bụ? (Gụgharịa amaokwu nke 25 na nke 26. Gụọkwa 1 Ndị Eze 16:30-33.)

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE  . . .

Ihe gosiri na Jehova na-ahụ otú ndị mmadụ si emegbu ibe ha.

․․․․․

Ihe gosiri na mmegbu a na-emegbu ndị mmadụ na-ewute Jehova.

․․․․․

Otú Jehova si egosi na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi. (Gụọ Diuterọnọmi 32:4.)

․․․․․

4 ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.

Olee otú ụfọdụ ndị taa nwere ike isi na-akpa àgwà ka Jezibel? (Gụọ Mkpughe 2:18-21.)

․․․․․

Olee mgbe o nwere ike ịdị mkpa ka i nwee obi ike ka Ịlaịja?

․․․․․

Gịnị ka i kwesịrị iburu n’obi mgbe mmadụ megburu gị ma ọ bụkwanụ mgbe ị hụrụ ka a na-emegbu ndị ọzọ?

․․․․․

5 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? GỊNỊKWA MERE O JI BAARA GỊ URU?

․․․․․

Aro anyị na-atụrụ gị: Kọọ ihe ị gụtara n’isiokwu a ka à ga-asị na ị na-akọ akụkọ ụwa. Were ya na ị gbara ndị a kọrọ akụkọ ha na ndị nọ mgbe ihe ndị a mere ajụjụ ọnụ, deekwa ihe ha kwuru.

Gaa na www.pr418.com

Ka ị gụọ Baịbụl n’Ịntanet

Nakwa ka i si n’ịntanet nweta isiokwu a ma ọ bụ bipụta ya