Gịnị Mere Onye Na-anụ Ekpere Ji Kwe Ka Ndị Mmadụ Na-ata Ahụhụ?
Gịnị Mere Onye Na-anụ Ekpere Ji Kwe Ka Ndị Mmadụ Na-ata Ahụhụ?
Ọ BỤ eziokwu na ụfọdụ ndị na-ekpe ekpere, ma obi esighị ha ike na Chineke dị. Gịnị mere ha ji enwe obi abụọ? O nwere ike ịbụ maka na ha na-ahụ otú ndị mmadụ si atagbu onwe ha n’ahụhụ n’ụwa a. Ò nwetụla mgbe ị nọ na-eche ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ?
Chineke ò kere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-ezughị okè nakwa ka ha na-ata ahụhụ? Ọ ga-esiri anyị ike ịsọpụrụ Chineke ma ọ bụrụ na o kere ndị mmadụ ka ha na-ata ahụhụ. Chebagodịrị ihe atụ a echiche: Ọ bụrụ na ị hụrụ otu ụgbọala mara ezigbo mma, gị agaa kiriwe ya, ma mechaa hụ na o nwere ebe kụkpọrọ n’ahụ́ ya, ị̀ ga-echewe na ọ bụ onye rụrụ ụgbọala ahụ rụrụ ya otú ahụ? Mbanụ! Ihe ị ga-ekwu bụ na onye rụrụ ya rụrụ ihe niile dị na ya ha amaa mma, ma o nwere ihe ma ọ bụ onye kụkpọrọ ya.
Ọ bụrụkwa na anyị ahụ otú ihe ndị Chineke kere si maa mma ma na-arụ ọrụ nke ọma, hụkwa otú ụmụ mmadụ si nọrọ ná nsogbu ma na-ata ahụhụ, ànyị ga-asị na ọ bụ otú a ka Chineke kere ha ka ha dịrị? Baịbụl kwuru na mgbe Chineke kere Adam na Iv, ha zuru okè. Ma, ọ bụ ha mechara kpatara onwe ha nsogbu. (Diuterọnọmi 32:4, 5) Chineke ekwela nkwa iwepụ nsogbu ahụ ha kpatara. Ọ ga-eme ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi zuo okè. Ma kemgbe ahụ, gịnị mere na Chineke emebeghị ihe ahụ o kwere ná nkwa?
Gịnị Mere na O Mebeghị Ya?
Ihe mere na Chineke emebeghị ya bụ na o nwere ihe dị mkpa ọ chọrọ ịbụ ụzọ mee. Ọ chọrọ ka onye ọ bụla ghọta onye kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ. Jehova ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha. Ọ bụ ya kwesịrị ịna-achị ha. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jeremaya 10:23) Ọ dị mwute na Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi ma gosi na ha achọghị ka Chineke na-achị ha. Ihe a ha mere mere ka ha bụrụ ndị mmehie. (1 Jọn 3:4) N’ihi ya, ha ghọrọ ndị na-ezughị okè ma kpatara onwe ha na ụmụ ha nsogbu.
Kemgbe ọtụtụ afọ, Jehova hapụrụ ndị mmadụ ka ha na-achị onwe ha. Ihe ndị merela n’ụwa
emeekwala ka o doo anya na ụmụ mmadụ enweghị ike ịchị onwe ha. Nke a na-egosi na o nweghị ọchịchị mmadụ nke na-anaghị akpatara ndị mmadụ ahụhụ. O nwebeghị nke kwụsịrịla agha, arụrụala, mmegbu, ma ọ bụ ọrịa.Olee Otú Chineke Ga-esi Mee Ka Ihe Dị Mma?
Baịbụl kwuru na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka e nwee ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi na ya. (2 Pita 3:13) Ọ bụ naanị ndị ji obi ha niile hụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya ka Chineke ga-ekwe ka ha biri n’ụwa mgbe ahụ.—Diuterọnọmi 30:15, 16, 19, 20.
Baịbụl kwukwara na Chineke ga-ewepụ ahụhụ ma bibie ndị na-akpata ya. Ọ ga-eme nke a ‘n’ụbọchị ikpe’ ya nke ji ọsọ na-abịa. (2 Pita 3:7) E bibichaa ndị ajọ omume, Jizọs Kraịst, bụ́ onye Chineke họpụtara ka ọ chịwa ụwa, ga-amalite ịchị ndị na-erubere Chineke isi. (Daniel 7:13, 14) Gịnị ka ọchịchị Jizọs ga-emere ndị mmadụ? Baịbụl kwuru, sị: “Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:11.
Mgbe Jizọs ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa, ọ ga-ewepụrụ ụmụ mmadụ nsogbu ha niile, ma ọrịa ma nká ma ọnwụ, ya bụ, nsogbu niile ụmụ mmadụ kpataara onwe ha mgbe ha nupụụrụ Jehova, bụ́ “isi iyi nke ndụ” isi. (Abụ Ọma 36:9) Jizọs ga-agwọ ndị niile kwere ka ọ chịwa ha. N’oge ahụ, ihe ndị a Baịbụl kwere ná nkwa ga-emezu:
▪ “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’ Ndị bi n’ala a ga-abụ ndị a gbaghaara njehie ha.”—Aịzaya 33:24.
▪ “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ na Chineke ga-emezu nkwa ya n’oge na-adịghị anya, meekwa ka ahụhụ niile kwụsị? Ka ọ dị ugbu a, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-anụ ekpere anyị n’agbanyeghị na ọ ka kwere ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ.
Chineke dị adị. Ọ na-anụ ekpere gị, ma ndị nke i kpere mgbe ị nọ n’ahụhụ na mgbe ị na-echegbu onwe gị. Ọ chọkwara ka ị dịrị ndụ mgbe ahụhụ niile dị n’ụwa ga-akwụsị, bụ́ mgbe ọ na-enwekwaghị ihe ga-eme ka i chewe na Chineke adịghị.