Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gbaa Mbọ Ka Gị na Onye Na-anụ Ekpere Bụrụ Enyi

Gbaa Mbọ Ka Gị na Onye Na-anụ Ekpere Bụrụ Enyi

Gbaa Mbọ Ka Gị na Onye Na-anụ Ekpere Bụrụ Enyi

E NWERE ọtụtụ ndị sịrị na ha kweere na Chineke, ma ha amaghị ihe mere ha ji kwere na ya. Ha amaghịkwa ihe mere okpukpe dị iche iche ji emekarị ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ ma ọ bụkwanụ ihe mere Chineke ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ. Ha na-ekpe ekpere mgbe ụfọdụ, n’agbanyeghị na ha amaghị onye ha na-ekpegara ya.

Ma i nwere ike ime ka gị na Chineke bụrụ ezigbo enyi. Ihe ga-eme ka ị hụ Chineke n’anya ma nwee okwukwe n’ebe ọ nọ bụ ịghọta onye ọ bụ. Ọ bụ mmadụ ịchọpụta ihe ndị gosiri na Chineke dị ga-eme ka onye ahụ nwee okwukwe na ya. (Ndị Hibru 11:1) Ọ bụrụ na ị mụta eziokwu banyere Chineke, ị ga-amata onye ọ bụ ma na-agwa ya okwu ka enyi gị. Ka anyị hụgodị ihe ụfọdụ ndị kwuru bụ́ ndị na-ekpe ekpere n’agbanyeghị na ọ na-adịbu ha ka Chineke adịghị.

Patricia, onye e kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ, sịrị: “Otu ụbọchị, mụ na ndị enyi m malitere ikwurịta banyere okpukpe. Anyị dị ihe dị ka mmadụ iri. M gwara ha na e nwere ụbọchị Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị, mụ ahapụ ya na papa m pụọ maka na achọghị m itinye ọnụ n’ihe ha na-ekwu. Ma, ya na papa m kwurịtara okwu n’agbanyeghị na papa m ekweghị na Chineke. Otu n’ime ndị enyi m ahụ sịrị, ‘O nwere ike ịbụ na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi bụ eziokwu.’

“Onye ọzọ kwuru, sị, ‘Ka anyị gaanụ ọmụmụ ihe ha chọpụta?’ Anyị gara. Ọ bụ eziokwu na obi akachaghị anyị, ụfọdụ n’ime anyị nọgidere na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova n’ihi otú ha si nabata anyị.

“Ma otu ụbọchị Sọnde, m nụrụ otu ihe nke mere ka m gbanwee otú m si eche echiche. Onye kwuru okwu n’ụbọchị ahụ kọwara ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ. Amabughị m na mmadụ zuru okè mgbe e kere ya nakwa na mmehie na ọnwụ si n’aka otu nwoke ruo mmadụ niile. Onye ahụ kwuru okwu kọwara na ihe mere Jizọs ji nwụọ bụ ka e mee ka ụmụ mmadụ nwetaghachi ihe ahụ nwoke mbụ Chineke kere tụfuru. * (Ndị Rom 5:12, 18, 19) Ọ bụ mgbe ahụ ka ihe niile bidoro ido m anya. M kwuru n’obi m, sị, ‘Ya bụ na e nwere Chineke onye hụrụ ụmụ mmadụ n’anya.’ M nọgidere na-amụ Baịbụl. N’oge na-adịghị anya, ihe na-emetụbeghị m mere. Ọ bịara doo m anya na e nwere onye dị adị nke na-anụ ekpere.”

Allan, onye e kwukwara okwu ya n’isiokwu nke mbụ, sịrị: “Otu ụbọchị mgbe Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị, nwunye m nabatara ha maka na ihe ha na-ekwu banyere mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa masịrị ya. Ihe ahụ nwunye m mere were m iwe. Ihe m meziri bụ ịkpọrọ nwunye m gaa n’usekwu, gwa ya, sị, ‘Isi ọ̀ dịkwa gị mma? Ọ̀ bụ ihe ọ bụla ị nụrụ gị ekwere?’

“Nwunye m gwara m, sị, ‘Ngwanụ, ị sị na ihe ha na-ekwu abụghị eziokwu, gakwuru ha gosi ha na ọ bụghị eziokwu.’

“Enwelighị m ike igosi ha na ihe ha na-ekwu abụghị eziokwu. Ma, ha medara obi gwa m okwu ma nye m otu akwụkwọ nke kwuru otú mmadụ na ihe ndị ọzọ si malite. Ihe akwụkwọ ahụ kwuru doro m anya nke na m kpebiri na m ga-amụtakwu banyere Chineke. Mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, ọ dịghịkwa anya mụ aghọta na ihe Baịbụl na-ekwu dị ezigbo iche n’ihe m cheburu banyere okpukpe. Ka m na-amụtakwu banyere Jehova, abịaziri m ghọta na ọ bụ ya ka m na-agwa okwu ma m kpewe ekpere. E nwere àgwà ụfọdụ m na-akpa na-adịchaghị mma, n’ihi ya, m kpere ekpere ka Jehova nyere m aka ka m kwụsị ha. O doro m anya na ọ zara ekpere m.”

Andrew, onye bi n’Ingland, sịrị: “Ọ bụ eziokwu na m bụ ekwe ekwe nakwa na m nwere mmasị na sayensị, ihe mere m ji kweta na e keghị ihe niile eke bụ maka na ndị ọzọ sịrị na a chọpụtala na e keghị ihe eke. Ihe ọjọọ niile na-eme n’ụwa mekwara ka m ghara ikwere na Chineke.

“Ma o nwere mgbe m na-eche na ‘ọ bụrụ na Chineke dị, m ga-achọ ịma ihe mere anyị ji dịrị ndụ nakwa ihe mere ihe ọjọọ ji ju n’ụwa, ndị mmadụ ana-alụkwa agha.’ Mgbe ihe siiri m ike, m na-ekpe ekpere mgbe ụfọdụ, ma amaghị m onye m na-agwa okwu.

“Otu ụbọchị, e nwere onye nyere nwunye m otu traktị Ndịàmà Jehova bipụtara nke isiokwu ya bụ, Ụwa nke a Ọ̀ Ga-alanarị? Ajụjụ a bụ ajụjụ m jụrụla onwe m ọtụtụ ugboro. Ihe traktị ahụ kwuru mere ka m chewe ma ọ̀ ga-abụ na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu. Otu ụbọchị, mgbe m gara ezumike, otu onye nyere m akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? * [Baịbụl Ọ̀ Bụ Okwu Chineke Ka Ọ̀ Bụ nke Mmadụ]. Mgbe m gụrụ akwụkwọ ahụ, m chọpụtara na ihe Baịbụl kwuru dabara n’ihe ndị sayensị chọpụtarala. Nke a mere ka m nwee mmasị ịmụkwu Baịbụl. N’ihi ya, mgbe otu Onyeàmà Jehova gwara m ka mụ na ya mụwa Baịbụl, m kwetara. Mgbe m ghọtara ihe mere Jehova ji kee mmadụ, ọ bịara doo m anya na Jehova dị adị nakwa na ọ bụ onye m nwere ike ikpegara ekpere ma kọọrọ ihe dị m n’obi.”

Jan, onye Protestant nke bi na Lọndọn, sịrị: “Otú ahụhụ si ju n’ụwa a na otú ndị chọọchị si ekwu ọzọ eme ọzọ mere ka m kwụsị ịga chọọchị. M kwụsịkwara ịga mahadum ma malite ịgụ egwú na ịkpọ ụbọ ka m wee nweta ego. Ọ bụ mgbe ahụ ka mụ na otu nwoke aha ya bụ Pat bidoro kpawa. Ọ bụ onye Katọlik, ma ọ kwụsịkwala ịga chọọchị.

“Anyị na ụfọdụ ndị ọzọ ndị kwụsịkwara ịga mahadum gara biri n’otu ụlọ ọ na-enweghịzi ndị bi na ya. Ndị ahụ anyị na ha bi nwere mmasị n’okpukpe ndị a na-ekpe n’Eshia. Ọtụtụ mgbe, anyị na ha na-akparịta ụka ruo n’ime ime abalị. Ihe anyị na-akparịta bụ ihe mere mmadụ ji dịrị ndụ n’ụwa. Ọ bụ eziokwu na mụ na Pat ekweghị na Chineke, anyị chere na a ga-enwerịrị onye kere ihe niile.

“Mgbe anyị mechara kwaga ebe ọzọ n’Ingland ịga chọọ ebe anyị ga na-akụ egwú, anọ m ebe ahụ mụọ nwa anyị nwoke. Otu ụbọchị mgbe nwa ahụ rịawara ọrịa, ekpegaara m Chineke ekpere ọ bụ eziokwu na ekweghị m na Chineke. Mgbe obere oge gafere, mụ na Pat sewere okwu, mụ ekuru nwa anyị gbapụ. N’oge ahụkwa, m kpere ekpere n’agbanyeghị na amaghị m ma ò nwere onye na-anụ ekpere m. Pat kpekwara ekpere mgbe ahụ, ma amaghịdị m.

“Ndịàmà Jehova abụọ mechara bịa na nke Pat n’ụbọchị ahụ ma gosi ya ndụmọdụ ụfọdụ dị na Baịbụl bụ́ ndị ga-abara ya uru. Pat kpọrọ m na fon ma jụọ m ma m̀ ga-achọ ka mụ na ya na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Ọ dịghị anya, anyị amụta na ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Chineke mma, anyị kwesịrị ịlụ n’ihi na anyị bi kemgbe n’alụghị alụ. Ma, ebe ọ bụ na mụ na Pat na-ese okwu mgbe ahụ, mụ na ya ịlụ yiri ihe na-agaghị ekwe omume.

“Anyị chọkwara ịmatakwu otú amụma ndị dị na Baịbụl si emezu, ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ, na ihe bụ́ Alaeze Chineke. N’oge na-adịghị anya, anyị ghọtara na Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, anyị chọkwara ime ihe Chineke chọrọ. N’ihi ya, anyị lụrụ. Ihe e kwuru na Baịbụl enyerela anyị aka ịzụ ụmụ atọ anyị mụrụ. O doola anyị anya na Jehova nụrụ ekpere anyị.”

Jiri Aka Gị Chọpụta nke Bụ́ Eziokwu

Ndị anyị kọrọ akụkọ ha n’isiokwu a ekweghị ka okpukpe ụgha ndị e nwere n’ụwa a duhie ha. Ha achọpụtakwala ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. E nweekwala ọtụtụ nde mmadụ ndị ọzọ ndị mere ka ha. Ị̀ hụrụ na ọ bụ mgbe onye nke ọ bụla n’ime ndị a anyị kọrọ akụkọ ha n’isiokwu a ghọtara ihe Baịbụl na-ekwu ka ọ bịara doo ya anya na Jehova na-anụ ekpere?

Ị̀ ga-achọ ịhụ ihe ndị gosiri na Chineke dị adị? Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ka ị mụta eziokwu banyere Jehova nakwa otú i nwere ike isi bụrụ enyi “Onye na-anụ ekpere.”—Abụ Ọma 65:2.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara uru ọnwụ Jizọs baara ụmụ mmadụ, gụọ isi nke 5 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ par. 12 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

“Mgbe m ghọtara ihe mere Jehova ji kee mmadụ, ọ bịara doo m anya na Jehova dị adị nakwa na ọ bụ onye m nwere ike ikpegara ekpere ma kọọrọ ihe dị m n’obi”

[Foto dị na peeji nke 9]

Ihe ndị ga-eme ka mmadụ nwee okwukwe na Chineke bụ onye ahụ ịchọpụta ihe ndị gosiri na Chineke dị na inwe mmasị ịmụta eziokwu banyere Chineke