Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mgbe Ọ Bụla Unu Na-ekpe Ekpere, Sịnụ, ‘Nna’”

“Mgbe Ọ Bụla Unu Na-ekpe Ekpere, Sịnụ, ‘Nna’”

“Mgbe Ọ Bụla Unu Na-ekpe Ekpere, Sịnụ, ‘Nna’”

Ọ bụrụ na ị nụ okwu a bụ́ “Nna” gịnị na-agbata gị n’obi? Ọ̀ bụ nwoke hụrụ ezinụlọ ya n’anya nke chọrọ ka ihe dịrị ha ná mma? Ka ọ̀ bụ nwoke na-anaghị elekọta ndị ezinụlọ ya ma ọ bụdị na-echi ha ọnụ n’ala? Ụdị mmadụ nna gị bụ so n’ihe ga-ekpebi ihe ga-agbata gị n’obi.

MGBE Jizọs na-ekpegara Chineke ekpere ma ọ bụ na-akọrọ ndị ọzọ banyere Chineke, ihe ọ na-akpọkarị Chineke bụ “Nna.” * Mgbe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, ọ sịrị ha: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ, Nna.” (Luk 11:2) Ma olee ụdị nna Jehova bụ? Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị mata azịza ajụjụ a. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ bụrụ na anyị aghọta ụdị nna Jehova bụ, ọ ga-eme ka anyị na ya dịkwuo ná mma, meekwa ka anyị hụkwuo ya n’anya.

Ọ bụ naanị Jizọs bụ onye kacha ruo eruo ịkọrọ anyị banyere Nna anyị nke eluigwe. Ya na Nna ya dị n’ezigbo mma n’oge ọ nọ n’eluigwe. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa onye maara Ọkpara ahụ n’ụzọ zuru ezu ma e wezụga Nna ya, ọ dịghịkwa onye maara Nna m n’ụzọ zuru ezu ma e wezụga Ọkpara ya na onye ọ bụla Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.” (Matiu 11:27) N’ihi ya, ọ bụ Ọkpara ahụ ka anyị ga-esi n’aka ya mata Nna anyị nke eluigwe.

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs banyere Nna anyị nke eluigwe? Legodị ihe Jizọs kwuru banyere Nna ya. Ọ sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ihe a Jizọs kwuru mere ka anyị ghọta na ịhụnanya bụ àgwà kachanụ e ji mara Nna anyị nke eluigwe. (1 Jọn 4:8) E nwere ọtụtụ ụzọ Jehova si egosi na ya hụrụ anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, ọ na-egosi na o nwere mmasị n’ebe anyị nọ, ọ na-enwere anyị ọmịiko, na-echebe anyị, na-adọ anyị aka ná ntị, na-egbokwara anyị mkpa anyị.

Nna Anyị Nwere Mmasị n’Ebe Anyị Nọ

Obi na-esi ụmụaka ike ma na-atọkwa ha ụtọ ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha na-egosi ha na ha nwere mmasị n’ebe ha nọ. Chegodị otú obi dị Jizọs mgbe ọ nụrụ ka Nna ya kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Matiu 3:17) Jizọs kwukwara na Nna ya hụrụ anyị n’anya ma nwee mmasị n’ebe anyị nọ. Jizọs sịrị: “Onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya.” (Jọn 14:21) Ihe a Jizọs kwuru na-eme anyị obi ụtọ! Ma e nwere onye na-achọghị ka anyị kweta na Chineke hụrụ anyị n’anya.

Setan na-eme ka anyị chewe na Nna anyị nke eluigwe ahụghị anyị n’anya. Ọ na-eme ka anyị chewe na ihe ọ sọkwara anyị mee, Chineke agaghị ahụ anyị n’anya. Mgbe Setan kacha eme ka anyị chewe otú ahụ bụ mgbe anyị nọ ná nsogbu, dị ka mgbe anyị na-arịa ọrịa, mgbe anyị kara nká, mgbe mmadụ mere anyị ihe anyị na-atụghị anya na ọ ga-eme anyị ma ọ bụ mgbe anyị mere ihe na-adịghị mma. Chegodị ihe mere otu nwa okorobịa aha ya bụ Lucas. Lucas chere na o nweghị ihe ga-eme ka Chineke hụ ya n’anya. Lucas kwuru na mgbe ya na-etolite, ndị mụrụ ya malitere ịkpa àgwà ọjọọ, mewezie ọtụtụ ihe ha kụziiri Lucas na ọ dịghị mma. O nwere ike ịbụ àgwà ọjọọ ha mere o ji siere Lucas ike iwere Chineke ka Nna ya. Nsogbu ọzọ Lucas nwere bụ na ọ na-emekarị ihe ọkụ ọkụ nke mere ka ya na ndị mmadụ na-esekarị okwu. Ma, nwunye Lucas ji nwayọọ nwayọọ nyere ya aka ka ọ kwụsị ịna-eme ihe ọkụ ọkụ. Otú nwunye Lucas si nweere di ya ndidi ma gbaa ya ume mere ka Lucas kwuo na nwunye ya bụ “onyinye pụrụ iche Chineke ji gọzie ya.” Lucas bịara ghọta na “Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie.” (1 Timoti 1:15) Lucas kwuru na ihe mere ya ji nwewezie obi ụtọ ná ndụ bụ na ya chere echiche ma ghọta otú Chineke si hụ ya n’anya.

Ọ bụrụ na o nwere mgbe ọ na-adị gị ka Jehova ahụghị gị n’anya, ọ ga-adị mma ka ị gụọ Ndị Rom 8:31-39 ma chebara ihe ị gụrụ echiche. N’ebe ahụ, Pọl onyeozi mere ka obi sie anyị ike na o nweghị ihe nwere ike “ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” *

Nna nke Nwere Obi Ọmịiko

Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Nna anyị nke eluigwe n’obi. Ọ bụ Chineke “obi ọmịiko.” (Luk 1:78) Jizọs nweere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ọmịiko otú Nna ya na-enwere ha. (Mak 1:40-42; 6:30-34) Ezigbo Ndị Kraịst na-emekwa ka Nna ha nke eluigwe. Ha na-enwere ndị mmadụ ọmịiko. Ha na-eme ihe a Baịbụl kwuru, ya bụ, “nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko.”—Ndị Efesọs 4:32.

Legodị ihe mere otu nwoke aha ya bụ Felipe. Otu ụbọchị, mgbe ọ na-aga ọrụ, o nwere ebe fụrụ ya ezigbo ụfụ n’azụ ka à ga-asị na a mara ya mma. E bugara ya ụlọ ọgwụ ozugbo. O were ndị dọkịta awa asatọ tupu ha achọpụta na nnukwu akwara dị n’obi ya gbawara agbawa. Ha gwara Felipe na ọ fọrọ naanị nkeji iri abụọ na ise ka ọ nwụọ nakwa na ọ baghị uru ka a waa ya ahụ́.

E nwere ụfọdụ ndị ha na Felipe na-efekọ Chineke nọ n’ebe ahụ. Ha meteere Felipe ebere ma buru ya gawa ụlọ ọgwụ ọzọ ozugbo. N’ụlọ ọgwụ ahụ, a wara ya ahụ́ ozugbo e butere ya. Ndị ahụ butere Felipe nọkwa ebe ahụ ruo mgbe a wachara ya ahụ́. Felipe mechara gbakee. Mgbe ọ bụla o chetara ihe ahụ mere ya, ọ na-enwe obi ụtọ na ndị ahụ ya na ha na-efekọ Chineke nweere ya ọmịiko. Ma o doro Felipe anya na ọ bụ Nna ya nke eluigwe mere ka ndị ahụ metere ya ebere. Felipe kwuru, sị: “Ọ dị m ka Chineke ọ̀ nọ n’akụkụ m na-agba m ume otú nna nke hụrụ nwa ya n’anya si eme.” N’eziokwu, Jehova bụ Chineke ọmịiko. Otú ọ na-esikarị egosi anyị ọmịiko ya bụ na ọ na-eme ka ndị na-efe ya na-enwere anyị ọmịiko.

Nna Anyị Na-echebe Anyị

Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ ụjọ tụwa nwatakịrị, ya agbakwuru nna ya. Ozugbo ọ makụrụ nna ya, obi na-eru ya ala. Obi siri Jizọs ike na Jehova ga-echebe ndị na-efe ya. (Matiu 26:53; Jọn 17:15) Obi kwesịkwara isi anyị ike na Nna anyị nke eluigwe ga-echebe anyị. Otú Jehova si echebe anyị ugbu a karịchaa bụ na ọ naghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị na ya kwụsị ịdị ná mma. Otú o si eme ya bụ na ọ na-akụziri anyị ihe ndị ga-eme ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu na ihe ndị ga-eme ka anyị na ya na-adịkwu ná mma. Otu ụzọ o si eme ya bụ na ọ na-esi na Baịbụl enye anyị ndụmọdụ. Ọ bụrụ na anyị anabata ndụmọdụ dị na Baịbụl, ọ ga-adị ka Jehova ò so anyị n’azụ na-agwa anyị, sị: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.”—Aịzaya 30:21.

Legodị ihe ụmụnne atọ aha ha bụ Tiago, Fernando, na Rafael mere. Ha na-eso otu òtù egwú akụ egwú. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ mgbe a gwara ha na ha ga-eso kụọ egwú n’ebe a ma ama a na-anọ akụ egwú n’obodo Saụ Paụlo, nke dị na Brazil. Ọ dị ha ka hà alaferela. Ma, otu onye ha na ya na-efekọ Chineke gwara ha na iso ndị na-anaghị erubere Chineke isi akpachi anya nwere ike ibutere ha nsogbu. (Ilu 13:20) Onye ahụ ha na ya na-efekọ Chineke kọọrọ ha ihe mere nwanne ya nwoke ka o wee gosi ha na ndụmọdụ a si na Baịbụl bara uru. Ọ kọọrọ ha na nwanne ya nwoke mere omume rụrụ arụ n’ihi na ya na ndị na-anaghị efe Chineke nọ na-akpa. Tiago na ụmụnne ya kwụsịziri ịkụ egwú. Ugbu a, ha atọ bụ Ndị Kraịst na-ekwusa ozi ọma oge niile. O doro ha anya na ihe mere ka ha na Chineke nọgide na-adị ná mma bụ na ha ṅara ntị na ndụmọdụ si n’Okwu Chineke.

Nna Anyị nke Eluigwe Na-adọ Anyị Aka ná Ntị

Nna nke hụrụ ụmụ ya n’anya na-adọ ha aka ná ntị n’ihi na ọ chọrọ ka ha baa uru ná ndụ. (Ndị Efesọs 6:4) Nna ahụ agaghị ahapụ ụmụ ya ka ha na-eme ihe ọ bụla sọrọ ha, ma ọ naghị eji obi ọjọọ adọ ha aka ná ntị. Otú ahụ ka ọ dịkwa Nna anyị nke eluigwe. Ọtụtụ mgbe, ọ na-adọ anyị aka ná ntị. Ma mgbe ọ bụla ọ na-adọ anyị aka ná ntị, ọ na-eji ịhụnanya adọ anyị ya, ọ naghị eji obi ọjọọ. Jizọs dịkwa ka Nna ya. O nweghị mgbe o ji obi ọjọọ mesoo ndị na-eso ụzọ ya, ma mgbe ha na-emeghị ihe ọ gwara ha mgbe ọ gwara ha ya.—Matiu 20:20-28; Luk 22:24-30.

Otu nwoke aha ya bụ Ricardo mechara nwee obi ụtọ na Jehova ji ịhụnanya dọọ ya aka ná ntị. Mgbe Ricardo dị naanị ọnwa asaa, papa ya gbahapụrụ ya na mama ya. Mgbe Ricardo dị ihe dị ka afọ iri na ise, agụụ papa ya gụsiwere ya ike. O bidoro kpawa àgwà ọjọọ, akọnuche ya amawa ya ikpe. Mgbe ọ ghọtara na àgwà ọjọọ ọ na-akpa abụghị àgwà Ndị Kraịst kwesịrị ịkpa, ọ gara gwa ndị okenye nọ n’ọgbakọ ebe ọ na-aga amụ Baịbụl. Ndị okenye ahụ ji Baịbụl dọsie ya aka ná ntị ike, ma ha gosikwara ya na ha hụrụ ya n’anya. Ricardo nabatara aka ná ntị ahụ ha dọrọ ya, ma akọnuche ya ka nọ na-enye ya nsogbu n’ihi ihe ndị o mere. Ọ naghị ekwe ya hie ụra, ọ na-ebekwa ákwá mgbe niile, obi na-ajọkwa ya njọ. O mechara ghọta na aka ná ntị ahụ a dọrọ ya gosiri na Jehova ka hụrụ ya n’anya. Ricardo chetara ihe e kwuru ná Ndị Hibru 12:6, bụ́ ebe sịrị: “Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.”

Anyị kwesịrị icheta na ịdọ mmadụ aka ná ntị abụghị naanị inye mmadụ ahụhụ. Baịbụl gosikwara na inye mmadụ ọzụzụ bụ otu ụzọ e si adọ mmadụ aka ná ntị. Ọ bụ ya mere na mgbe ụfọdụ, otú Nna anyị nke eluigwe nwere ike isi dọọ anyị aka ná ntị bụ ikwe ka anyị tatụ ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ anyị mere. Ma, Baịbụl gosiri na ụdị ịdọ aka ná ntị a na-enyere anyị aka ime ihe ziri ezi. (Ndị Hibru 12:7, 11) N’eziokwu, ihe banyere anyị na-emetụ Nna anyị n’obi, ọ na-adọkwa anyị aka ná ntị maka ọdịmma anyị.

Nna Anyị Na-egboro Anyị Mkpa Anyị

Nna nke hụrụ ezinụlọ ya n’anya na-egboro ha mkpa ha. Jehova na-emekwa otú ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.” (Matiu 6:25-34) Jehova kwere nkwa, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.

Otu nwaanyị aha ya bụ Nice bịara chọpụta na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu mgbe a chụrụ di ya n’ọrụ. Tupu a chụọ di ya n’ọrụ, nwaanyị a hapụrụ ezigbo ọrụ ọ na-arụ ka o nwee ohere ọ ga-eji na-elekọta ụmụ ha nke ọma ma nwekwuo ohere na-ejere Chineke ozi. Oleezi otú ha ga-esi na-akpa afọ ezinụlọ ha? Ihe Nice mere bụ ikpegara Jehova ekpere. N’echi ya, di ya gaghachiri n’ebe ahụ ọ na-arụ ọrụ ka o were ihe ndị ọ hapụrụ ebe ahụ. Ihe ọ na-atụghị anya ya meziri. Onyeisi ọrụ ya gwara ya na e nwere ọrụ ọzọ gbaranụ a ga-enye ya. Ọ bụ otú ahụ ka e si chụọ di Nice n’ọrụ n’otu ụbọchị ma nye ya ọrụ ọzọ n’echi ya. Nice na di ya kelere Nna ha nke eluigwe maka ịza ekpere ha. Ihe a mere ha na-echetara anyị na Jehova, Onye hụrụ anyị n’anya ma na-egboro anyị mkpa anyị, anaghị echefu ndị na-erubere ya isi.

Anyị Kwesịrị Ikele Nna Anyị Maka Ịhụnanya Ya

N’eziokwu, anyị agaghị akọchali otú Nna anyị nke eluigwe hụruru anyị n’anya. O nwere mmasị n’ebe anyị nọ, na-enwere anyị ọmịiko, na-echebe anyị, na-adọ anyị aka ná ntị, ma na-egboro anyị mkpa anyị. Ọ bụrụ na anyị echee echiche banyere ụzọ ndị a o si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya, anyị ga-ekweta na o nweghị Nna dị ka ya.

Olee otú anyị nwere ike isi kelee Nna anyị nke eluigwe maka ịhụnanya ya? Ihe anyị ga-eme bụ ịgba mbọ mụtakwuo banyere ya na ihe ndị o bu n’obi ime. (Jọn 17:3) Ihe ọzọ anyị ga-eme bụ ime ihe ọ chọrọ. (1 Jọn 5:3) Anyị kwesịkwara ịhụ ndị ọzọ n’anya otú ahụ ọ hụrụ anyị n’anya. (1 Jọn 4:11) Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, anyị na-egosi na Jehova bụ Nna anyị, gosikwa na obi dị anyị ụtọ na anyị bụ ụmụ ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 N’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ, e kwuru na Jehova bụ nna anyị. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Matiu, Mak, na Luk, Jizọs kpọrọ Chineke “Nna” ihe dị ka ugboro iri isii na ise, ọ kpọkwara ya “Nna” ihe karịrị otu narị ugboro n’Oziọma Jọn. Pọl kpọkwara Chineke “Nna” ihe karịrị ugboro iri anọ n’akwụkwọ ozi ndị o dere. Jehova bụ Nna anyị n’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ.

^ par. 9 Gụọ isiokwu bụ́ “Ọ Dịghị Ihe Pụrụ ‘Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke,’” nke dị n’isi nke 24 n’akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Ọ bụrụ na anyị aghọta ụdị Nna Jehova bụ, ọ ga-eme ka anyị na ya dịkwuo ná mma, meekwa ka anyị hụkwuo ya n’anya

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

Anyị kwesịrị igosi na Jehova bụ Nna anyị, gosikwa na obi dị anyị ụtọ na anyị bụ ụmụ ya

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 21]

E NWERE ỌTỤTỤ ỤZỌ JEHOVA SI EGOSI NA YA BỤ NNA NKE HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

O NWERE MMASỊ N’EBE ANYỊ NỌ

NA-ENWERE ANYỊ ỌMỊIKO

NA-ECHEBE ANYỊ

NA-ADỌ ANYỊ AKA NÁ NTỊ

NA-EGBORO ANYỊ MKPA ANYỊ