Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Olee ebe e si nweta nkume ndị a kwụnyere n’akpa obi nke nnukwu onye nchụàjà n’Izrel na-eyi?
▪ Mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt ma banye n’ala ịkpa, Chineke nyere ha iwu ka ha mee akpa obi nke nnukwu onye nchụàjà ga na-eyi. (Ọpụpụ 28:15-21) A kwụnyere nkume dị iche iche n’elu akpa obi ahụ. Nkume ndị ahụ bụ nkume rubi, topaz, emerad, tọkwọiz, safaya, jaspa, leshem, aget, ametist, krisolaịt, ọniks, na jed. * Ndị Izrel hà nwere nkume ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa n’eziokwu?
N’oge Baịbụl, e ji nkume ndị ahụ kpọrọ ihe, a na-erekwa ha ere. Dị ka ihe atụ, ndị Ijipt oge ochie na-aga n’obodo ndị dị ezigbo anya enweta nkume ndị ahụ. Ha na-agarucha ebe ndị a na-akpọ Ịran, Afganịstan, na India ugbu a. Ndị Ijipt na-egwupụta ụdị nkume dị iche iche dị oké ọnụ ahịa n’ebe ndị ha na-egwu nkume. Ọ bụ ndị eze Ijipt nwe ihe niile a na-egwute n’ala bụ́ ndị a na-egwupụta n’obodo ndị ha na-achị. Na Baịbụl, Job kwuru na ndị dịrị ndụ n’oge ya na-eji okporo ígwè gaa na-achọ akụ̀ ndị dị n’ime ala, kwuokwa na ha na-esoro ọwara e gwuru n’ime ala gaa na-achọ ihe ndị ahụ. A bịa n’ihe ndị a na-egwupụta n’ala n’oge ahụ, Job kpọrọ nkume safaya na topaz aha.—Job 28:1-11, 19.
Akwụkwọ Ọpụpụ kwuru na mgbe ndị Izrel na-ahapụ Ijipt, ha gara rịọta ndị Ijipt ihe ndị dị oké ọnụ ahịa ha nwere ma “gbawa ndị Ijipt aka.” (Ọpụpụ 12:35, 36) N’ihi ya, ọ ga-abụ n’Ijipt ka ndị Izrel si nweta nkume ndị ahụ a kwụnyere n’akpa obi nke nnukwu onye nchụàjà na-eyi.
Gịnị mere e ji eji mmanya agwọ ọrịa n’oge Baịbụl?
▪ N’otu ihe atụ Jizọs mere, ọ kọrọ akụkọ otu nwoke nke ndị ohi kụrụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. Jizọs kwuru na otu onye Sameria nyeere nwoke ahụ aka ma kechie ọnyá ya, wụkwasịkwa “ha mmanụ na mmanya.” (Luk 10:30-34) Mgbe Pọl onyeozi degakwaara enyi ya Timoti akwụkwọ ozi, ọ sịrị ya: “Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, kama na-aṅụ ntakịrị mmanya n’ihi afọ gị na ọrịa nke ị na-arịakarị.” (1 Timoti 5:23) Mmanya ahụ Jizọs kwuru na a wụrụ n’ọnyá nwoke ahụ na mmanya Pọl gwara Timoti ka ọ na-aṅụ ọ̀ na-egosi na e ji mmanya agwọ ọrịa n’eziokwu?
Otu akwụkwọ aha ya bụ Ancient Wine kwuru na a na-eji mmanya “egbu ụmụ nje dị iche iche, jirikwa ya agwọ ahụ́ mgbu, na ọrịa ndị ọzọ.” N’oge ochie, mmanya so n’ihe ndị Ijipt, ndị Mesopotemia, na ndị Siria na-ejikarị agwọ ọrịa. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na mmanya bụ “ọgwụ mbụ e dere n’akwụkwọ nke ndị oge ochie ji agwọ ọrịa.” O nwere otu akwụkwọ nke kwuru banyere ihe ahụ Pọl gwara Timoti. Akwụkwọ ahụ sịrị: “A chọpụtala na nje ndị na-akpata oké ahụ́ ọkụ na nje ndị ọzọ na-anwụ ozugbo e tinyere ha n’ime mmanya.” Ihe ndị a chọpụtara na nso nso a gosiri na e nwere ihe karịrị narị ụmụ irighiri ihe ise ndị na-adị ná mmanya. Ụmụ irighiri ihe ndị ahụ na-enyekwa aka n’ịgwọ ọrịa.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 O siri ike ịmata ihe a na-akpọ nkume niile ahụ n’oge anyị a.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ebe ndị ọrụ ugbo na-azọcha mkpụrụ vaịn. e sere ihe a n’ili otu nwoke aha ya bụ Nakht. Ili a dị n’obodo Tibs, n’Ijipt
[Ebe E Si Nweta Foto]
Gianni Dagli Orti/The Art Archive at Art Resource, NY