Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Na-akụ Azụ̀

Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Na-akụ Azụ̀

Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Na-akụ Azụ̀

“Ka [Jizọs] na-aga n’akụkụ oké osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, bụ́ Saịmọn onye a na-akpọ Pita na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ azụ̀ n’ime oké osimiri, n’ihi na ha bụ ndị na-akụ azụ̀. O wee sị ha: ‘Soronụ m, m ga-eme unu ndị na-akụta mmadụ.’” —MATIU 4:18, 19.

N’ỌTỤTỤ ebe n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn, e kwuru banyere azụ̀, ịkụ azụ̀, na ndị na-akụ azụ̀. Jizọs jidị ịkụ azụ̀ mee ihe atụ ọtụtụ ugboro. Nke a ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na Jizọs kụziiri ndị mmadụ ihe ọtụtụ ugboro n’akụkụ Oké Osimiri Galili ma ọ bụ n’ebe dị nso n’osimiri ahụ. (Matiu 4:13; 13:1, 2; Mak 3:7, 8) Osimiri a bụ ọdọ mmiri mara mma nke dị ihe dị ka kilomita iri abụọ na otu n’ogologo ma dịrị ihe dị ka kilomita iri na otu n’obosara, a na-aṅụkwa mmiri ya aṅụ. Ihe dị ka mmadụ asaa n’ime ndịozi Jizọs bụ ndị na-akụ azụ̀. Ha bụ Pita, Andru, Jems, Jọn, Filip, Tọmọs, na Nataniel.—Jọn 21:2, 3.

Olee otú ndị na-akụ azụ̀ si akụ azụ̀ n’oge Jizọs nọ n’ụwa? Ọ́ gaghị adị mma ka ị gụọ banyere ndị ahụ na-akụ azụ̀ na otú ha si akụ azụ̀? I mee otú ahụ, ị ga-amatakwu ụdị mmadụ ndịozi Jizọs bụ ma ghọtakwuo ihe dị iche iche Jizọs mere, nakwa ihe atụ ndị o mere mgbe ọ na-ezi ihe. Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’otú e si egbu azụ̀ n’Oké Osimiri Galili.

“Oké Ifufe Malitere Ife n’Oké Osimiri Ahụ”

Oké Osimiri Galili dị n’otu nnukwu ndagwurugwu. Ụsọ oké osimiri a bụ okwute okwute, ọ kpọdakwara akpọda. E nwere otu nnukwu ugwu dị nso n’osimiri a. Aha ya bụ Ugwu Hemọn. N’oge oyi, ifufe oyi na-efe mgbe ụfọdụ n’osimiri a, ma ọ naghị efesikarị ike. Ma n’oge okpomọkụ, ifufe na-efekarị na ya. Oké ifufe nwere ike isi n’ugwu ndị dị nso kpawa ike n’osimiri a mgbe ndị na-akwọ ụgbọ na-atụdịghị anya na ifufe ga-efe. O nwere mgbe ụdị ifufe a kpara ike n’oké osimiri a n’oge Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụgbọ mmiri n’osimiri a.—Matiu 8:23-27.

Ụgbọ mmiri e ji akụ azụ̀ n’oge ahụ na-adị ihe dị ka mita asatọ n’ogologo, dịrị ihe dị ka mita abụọ n’etiti ya. Ọtụtụ ụgbọ mmiri ndị ahụ na-enwe osisi na-ejide ákwà ụgbọ mmiri nakwa ákwà ụgbọ mmiri. Ha na-enwekwa ebe e kpuchitụrụ ekpuchi n’azụ ha, bụ́ ebe mmadụ nwere ike ịnọ zurutụ ike. (Mak 4:35-41) Ụgbọ mmiri ndị ahụ na-eji nwayọọ nwayọọ aga n’elu mmiri. Ma a na-arụsi ha ike n’ihi otú ifufe si enye ụgbọ mmiri nsogbu n’elu mmiri. Ọ bụrụ na ifufe fesiwe ike, ndị na-akwọ ụgbọ ndị a na-adọsi eriri ákwà ụgbọ mmiri ha ike ka ifufe ghara iburu ụgbọ ha gawa ebe ha na-achọghị ịga.

Ndị ahụ na-akwọ ụgbọ mmiri na-ejikwa ụmara akwọ ụgbọ ha aga ebe ha chọrọ ka ọ gaa. Ụmara na-adị n’akụkụ abụọ nke ụgbọ mmiri. Ihe dị ka mmadụ isii ma ọ bụ karịa na-eji otu ụgbọ mmiri aga ịkụ azụ̀. (Mak 1:20) Ha na-etinye ihe ndị dị ha mkpa n’ime ụgbọ mmiri ha. Ụfọdụ n’ime ha bụ ákwà ụgbọ mmiri (1), eriri (2), ụmara (3), nkume e ji ejide ụgbọ mmiri (4), ákwà (5), ihe oriri (Mak 8:14) (6), nkata (7), ihe e ji ehiwe isi (Mak 4:38) (8), na ụgbụ (9). Ihe ndị ọzọ ha na-etinye n’ụgbọ ha bụ ihe ndị a na-ekegide n’ụgbụ ka ụgbụ ghara imikpucha n’ime mmiri (10), ihe ndị a na-ekegide n’ụgbụ ka ụgbụ mikpuo n’ime mmiri (11), ihe ndị e ji arụzi ụgbọ (12), nakwa ọkụ (13).

“Ha Gbutere Azụ̀ Dị Nnọọ Ukwuu”

Ebe ndị na-akụ azụ̀ kacha egbute azụ̀ n’Oké Osimiri Galili, ma n’oge a ma n’oge Jizọs nọ n’ụwa, bụ n’ebe mmiri dị iche iche si asọba n’osimiri ahụ. Azụ̀ na-agakarị ebe ndị ahụ ịchọ ihe oriri n’ihi na ahịhịa ndị mmiri na-asọba n’osimiri na-adịkarị n’ebe ahụ. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị na-akụ azụ̀ na-ejikarị ọkụ aga egbu azụ̀ n’abalị. Otu mgbe, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nọrọ abalị dum na-agbalị ka ha gbute azụ̀, ma ha egbuteghị. Ma n’echi ya, Jizọs gwara ha ka ha wụnye ụgbụ ha n’osimiri ahụ. Mgbe ha mere otú ahụ, ha gbutere ọtụtụ azụ̀. Azụ̀ ndị ha gbutere karịrị akarị nke na ụgbọ ha malitere imi.—Luk 5:6, 7.

Mgbe ụfọdụ, ndị na-akụ azụ̀ na-eji ụgbọ mmiri abụọ aga n’ebe dị omimi ka ha gbute azụ̀. Ha ruo n’ebe ahụ, ha na-awụba ụgbụ ha n’agbata ụgbọ abụọ ahụ ma kwọrọzie ụgbọ ndị ahụ na-aga. Otu ụgbọ gawa n’aka nri, nke ọzọ agawa n’aka ekpe. Ka ha na-aga, ha na-agbasa ụgbụ ahụ na mmiri ruo mgbe ụgbụ ha gbara azụ̀ ndị nọ n’ebe ahụ gburugburu. Mgbe ụgbọ abụọ ahụ bịakọtara ọnụ, ndị ahụ na-akụ azụ̀ na-ejide eriri ndị e kegidere n’isi ụgbụ ahụ ma dọrọ ụgbụ ahụ na azụ̀ ndị o gbutere dọbata n’ụgbọ ha. Ụgbụ ha na-adị ezigbo ogologo, saakwa mbara nke na ọtụtụ azụ̀ ndị nọ n’otu ebe nwere ike ịbanyecha n’ime ya. Ihe ndị e kegidere n’ọnụ ọnụ ụgbụ ahụ na-eme ka ụgbụ ghara imikpucha n’ime mmiri, ebe ihe ndị e kegidere n’ala ala ya na-eme ka o mikpuo n’ime mmiri. Mgbe ndị na-akụ azụ̀ kwadochara ụgbụ ha, ha na-awụnye ya ugboro ugboro n’ime mmiri. Ọ na-abụ ha sepụta ya, ha echere ihe dị ka otu awa tupu ha awụnye ya ọzọ.

Otú ndị na-akụ azụ̀ si akụ azụ̀ na mmiri ndị na-adịchaghị omimi na-adịtụ iche. Otú ha si akụ ya bụ na ha na-eke onwe ha abụọ. E nwere ndị nke ga-anọ n’ụsọ osimiri, nwee ndị nke ga-eji ụgbọ banye na mmiri. Mgbe ndị nke ahụ ji ụgbọ na-abanye na mmiri, ha na-adọrọ ụgbụ ahụ na-aga. Ụgbọ ha na-aga gburugburu ma lọghachi n’ụsọ osimiri ahụ. Ndị nke ahụ nọ n’ụsọ osimiri na-adọrọzi ụgbụ ahụ dọpụta n’ụsọ osimiri ma nọrọzie ebe ahụ họọ azụ̀ ndị ha gbutere. Ha na-etinye ndị nke dị mma na nkata. E mechaa, ha na-eresị ndị obodo ha ụfọdụ azụ̀ ha gbutere. Ma ha na-amị ọtụtụ n’ime ha amị, fesa ha nnu, chekwaa ha ma gaa ree ha na Jeruselem ma ọ bụkwanụ ná mba ọzọ. A na-atụfu azụ̀ ndị na-enweghị ntù ma ọ bụ akpịrịkpa n’ihi na ha adịghị ọcha n’anya ndị Izrel. (Levitikọs 11:9-12) Ọ bụ otú a e si akụ azụ̀ gbatara Jizọs n’obi mgbe o ji ịkụ azụ̀ mee otu ihe atụ. N’ihe atụ ahụ, o ji “alaeze eluigwe” tụnyere ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri, jirikwa azụ̀ dị iche iche ụgbụ ahụ gbutere tụnyere ndị ezi omume na ndị ajọ omume.—Matiu 13:47-50.

Ọ bụrụ na onye na-akụ azụ̀ achọọ ịga kụọ azụ̀ naanị ya, o nwere ike iji nkò azụ̀ gaa. Ọ na-etinye nri azụ̀ ná nkò ahụ tupu ya atụba nkò ahụ na mmiri. Ihe ọzọ o nwere ike iji gaa bụ obere ụgbụ. Ya ruo na mmiri, ọ na-eji ụkwụ banye na mmiri, jide ụgbụ ya nke ọma ma wụba ya na mmiri. Ụgbụ ahụ ọ wụbara na mmiri na-emikpu na mmiri ahụ. Ọ bụrụ na ọ dabara ya, ụgbụ ahụ na-egbute azụ̀ ole na ole mgbe ọ na-adọpụta ya.

Ụgbụ na-adị oké ọnụ, idozi ya abụghịkwa obere ọrụ. N’ihi ya, a na-akpachara anya ma e jiri ya na-egbu azụ̀. Mgbe onye na-akụ azụ̀ kụchara azụ̀ n’ụbọchị, ọ na-edozi ụgbụ ya, saa ya mmiri ma gbasaa ya n’anwụ. (Luk 5:2) Jems na nwanne ya bụ́ Jọn nọ n’ụgbọ mmiri ha na-edozi ụgbụ ha mgbe Jizọs bịara kpọọ ha ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.—Mak 1:19.

Ụdị azụ̀ ndị na-akụ azụ̀ n’oge Jizọs nọ n’ụwa na-achọkarị ka ha gbute bụ azụ̀ a na-akpọ apụpa. Apụpa na-adị ọtụtụ na mmiri. Ọtụtụ ndị bi na Galili na-eji azụ̀ a esi nri maka na ọ na-atọ ụtọ. Ọ ga-abụkwa na Jizọs tara azụ̀ a n’oge ahụ. O nwere ike ịbụ apụpa abụọ a mịrị amị ma fesa nnu ka Jizọs ji nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ n’oge ọ rụrụ ọrụ ebube. (Matiu 14:16, 17; Luk 24:41-43) Azụ̀ a na-akpụkarị ụmụ ya n’ọnụ mgbe ha na-agagharị na mmiri. Ma, ọ bụrụ na ọ kpụghị ụmụ ya n’ọnụ, o nwere ike ịkpụrụ okwute ma ọ bụkwanụ ya akpụrụ mkpụrụ ego na-egbuke egbuke ọ hụrụ n’ala ala oké osimiri.—Matiu 17:27.

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọrụ ịkụ azụ̀ chọrọ ndidi, ọ bụrụkwa na mmadụ adịghị ike ọrụ, ọ gaghị arụli ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọrụ Jizọs kpọrọ ndị mmadụ ka ha soro ya rụọ. Ọ bụrụ na ndị ahụ ọ kpọrọ enweghị ndidi ma dịrị ike ọrụ, ha agaghị arụli ọrụ ‘ịkụta ndị mmadụ.’—Matiu 28:19, 20.

[Foto dị na peeji nke 19]

(Lee ebe e sere ya n’akwụkwọ a)