Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Ndị Ezi Omume Niile Hà Ga-aga Eluigwe?

Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Ndị Ezi Omume Niile Hà Ga-aga Eluigwe?

Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara​—Ndị Ezi Omume Niile Hà Ga-aga Eluigwe?

Ọ NA-ATỌ Ndịàmà Jehova ụtọ ka ha na ndị agbata obi ha na-akparịta ihe ndị dị na Baịbụl. Ò nwere ajụjụ gbasara Baịbụl ị ga-achọ ịma azịza ya? Ò nwere ihe Ndịàmà Jehova kweere ma ọ bụ ihe ha na-eme na-agbagwoju gị anya? Ya bụrụ otú ahụ, jụọ ya Onyeàmà Jehova ọzọ gị na ya ga-ahụ. Obi ga-atọ ya ụtọ ịza gị ya.

N’okpuru ebe a, e dere ihe Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike ịkparịta. Ka anyị were ya na Onyeàmà Jehova aha ya bụ Marcus gara n’ụlọ otu onye aha ya bụ Robert.

Gịnị Ka Ndị Ga-aga Eluigwe Ga-arụ n’Ebe Ahụ?

Marcus: O nwere otu ihe m chọrọ ịjụ gị. Ì chere na ihe ga-emecha dị mma, ka ì chere na ọ ga-aka njọ ma ọ bụkwanụ dịgide otú ọ dị ugbu a?

Robert: Echere m na ihe ga-adị mma. Ana m atụ anya na otu ụbọchị, m ga-alakwuru Onyenwe anyị n’eluigwe.

Marcus: Ihe i kwuru dị mma. Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe banyere eluigwe, kwuokwa na e nwere ndị ga-aga eluigwe. Ma, ì cheela echiche ihe ha ga-arụ n’ebe ahụ?

Robert: Anyị na Chineke ga-ebi n’ebe ahụ, anyị ga na-etokwa ya ruo mgbe ebighị ebi.

Marcus: Nke ahụ amaka. Dị ka m kwuru na mbụ, Baịbụl kwuru na e nwere ndị ga-aga eluigwe. Ma, o kwukwara ọrụ dị mkpa ha ga-arụ n’eluigwe.

Robert: Gịnị bụ ọrụ ahụ ha ga-arụ?

Marcus: E kwuru ya ná Mkpughe 5:10. Ebe ahụ kwuru, sị: “I [ya bụ, Jizọs] mekwara ka ha bụụrụ Chineke anyị otu alaeze na ndị nchụàjà, ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.” Olee ọrụ amaokwu a kwuru na ha ga-arụ n’eluigwe?

Robert: O kwuru na ha ga-abụ ndị eze.

Marcus: Ị zatara ya.

Ole Ndị Ka Ha Ga-achị?

Marcus: Í cheghị na ọ bụrụ na ha ga-abụ ndị eze, a ga-enwerịrị ndị ha ga na-achị? A sị ka e kwuwe, à ga-enwe ndị ọchịchị ma ọ bụrụ na e nweghị ndị ha ga-achị?

Robert: Aghọtala m ihe ị na-ekwu.

Marcus: Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị jụọ, sị, Ole ndị ka ha ga-achị?

Robert: Ọ ga-abụnụ ndị ezi omume nọ n’ụwa bụ́ ndị na-anwụbeghị gaa eluigwe.

Marcus: Ihe ị zara dị mma ma ọ bụrụ na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe. Ma o nwere ihe ọzọ i kwesịrị ichebara echiche. Ya bụrụkwanụ na e nwere ndị ezi omume na-agaghị aga eluigwe?

Robert: Ahụtụbeghị m Ndị Kraịst na-ekwu otú ahụ.

Marcus: Ihe mere m ji jụọ gị ajụjụ a bụ ihe e kwuru n’Abụ Ọma 37:29. Biko, gụọ ebe ahụ.

Robert: O kwuru, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”

Marcus: I meela. Olee ebe o kwuru na ọtụtụ ndị ezi omume ga-ebi?

Robert: O kwuru na ha ga-ebi n’ụwa.

Marcus: Ị zatara ya. Ma, afọ ole ka o kwuru na ha ga-ebiru? O kwughị na ha ga-ebi afọ ole na ole, kama ọ sịrị na ‘ha ga-ebi n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.’

Robert: Ọ ga-abụ na ihe ebe a na-ekwu bụ na ndị ezi omume agaghị agwụ agwụ n’ụwa. Ọ bụrụ na anyị anwụọ gaa eluigwe, ndị ezi omume ndị ọzọ a mụrụ n’ụwa ga-anọchi anyị.

Marcus: Ụfọdụ ndị nwekwara ike ịghọta amaokwu a otú a i si ghọta ya. Ma, ya bụrụkwanụ na otú a i si ghọta ya abụghị ihe amaokwu a na-ekwu? Ọ bụrụkwanụ na ọ na-ekwu na ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi?

Robert: Ihe ị na-ekwu edochabeghị m anya.

Ụwa Ga-aghọ Paradaịs n’Ọdịnihu

Marcus: Legodị ihe Baịbụl kwuru banyere ihe ga-eme n’ụwa n’ọdịnihu. Ka anyị gụọ Mkpughe 21:4. Amaokwu a kwuru banyere ndị ga-ebi n’ụwa n’ọdịnihu, sị: “Ọ [ya bụ, Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” Ihe a amaokwu a kwuru ọ́ dịghị gị mma?

Robert: Ọ dị m mma. Ma echere m na ọ na-ekwu ihe ga-eme n’eluigwe.

Marcus: N’eziokwu, ihe ọma ndị a ga-emekwara ndị ga-aga eluigwe. Ma legodị amaokwu ahụ anya ọzọ. Olee ihe o kwuru ga-eme ọnwụ?

Robert: O kwuru na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.”

Marcus: I kwutere ya. Ama m na ị ga-ekweta na ọ bụrụ na a sịrị na ihe agaghị adịkwa, ihe ọ pụtara bụ na ihe ahụ dịbu adị.

Robert: Ọ bụ eziokwu.

Marcus: Ma è nwetụla mgbe e nwere ọnwụ n’eluigwe? Ọ bụ naanị n’ụwa ebe a ka ọnwụ na-egbu ndị mmadụ.

Robert: I kwuru eziokwu. M ga-echebara ya echiche.

Marcus: Robert, Baịbụl kwuru na ụfọdụ ndị ezi omume ga-aga eluigwe, ma o kwukwara na ọtụtụ ndị ezi omume ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ama m na ị nụtụla ihe a Jizọs kwuru mgbe ọ nọ n’Ugwu Oliv na-ezi ndị mmadụ ihe: “Ngọzi na-adịrị ndị dị nwayọ n’obi, n’ihina ha ga-eketa ụwa.”—Matiu 5:5, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Robert: Anụla m ya ọtụtụ ugboro na chọọchị anyị.

Marcus: Ọ bụrụ na ndị dị nwayọọ n’obi ga-eketa ụwa, nke a ọ́ pụtaghị na ndị mmadụ ga-ebi n’ụwa? Ọ bụ ndị ahụ ga-ebi n’ụwa ka a ga-emere ihe ọma ndị ahụ e kwuru okwu ha ná Mkpughe. Ha ga-anọ ndụ mgbe Chineke ga-eme ka ihe dị mma n’ụwa, ya bụ, mgbe Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ niile, wepụkwa ọnwụ.

Robert: Aghọtawala m ihe ị na-ekwu. Ma ọ̀ bụ naanị otu ebe ma ọ bụ ebe abụọ a ị gụrụ ga-eme ka m kweta na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu?

Marcus: Mbanụ. N’Akwụkwọ Nsọ, e nwere ọtụtụ ebe kwuru otú ụwa ga-adị n’ọdịnihu. Ị̀ ga-achọ ka m jiri nkeji ole na ole gosi gị otu ebe kwuru ihe na-atọ m ezigbo ụtọ?

Robert: Nsogbu adịghị.

‘Ndị Ajọ Omume Agakwaghị Anọ’

Marcus: Ama m na i chetara na anyị gụrụ Abụ Ọma 37:29. Ka anyị gaghachi n’ebe ahụ ọzọ. Ma ebe anyị ga-agụ ugbu a bụ amaokwu nke 10 na nke 11. Biko, gụọ ebe ahụ.

Robert: Ebe ahụ sịrị: “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”

Marcus: I meela. Legodị anya ọzọ n’amaokwu nke 11. Olee ebe o kwuru na “ndị dị umeala n’obi,” ma ọ bụ ndị ezi omume, ga-ebi?

Robert: Ọ sịrị na ha “ga-enweta ụwa.” Ma, echere m na amaokwu a na-ekwu banyere ihe na-eme ugbu a; ị manụ na e nwere ọtụtụ ndị ezi omume n’ụwa ugbu a.

Marcus: I kwuru eziokwu. Ma, ị̀ hụrụ na amaokwu ahụ kwukwara na ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ “n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Udo adịnụghị n’ụwa taa, ka ọ̀ dị?

Robert: Mba, ọ dịghị.

Marcus: Ajụjụ bụzi, olee otú ihe e kwuru n’amaokwu ahụ ga-esi emezu? Ka m megodịrị gị ihe atụ a: Ka e were ya na ị rụchara ụlọ tinye ndị mmadụ na ya. Ụfọdụ ndị bi n’ụlọ ahụ bụ ndị ezigbo mmadụ. Ha na-elekọta ebe ha bi anya, ha na-agbalịkwa ka ha na ndị agbata obi ha biri n’udo. Obi ga na-atọ gị ụtọ na ụdị ndị dị otú ahụ bi n’ụlọ gị. Ma ndị ọzọ bi n’ụlọ ahụ bụ ndị ọjọọ; ha na-emebisị ụlọ ahụ ma na-emesi ndị agbata obi ha ike. Ọ bụrụ na ndị ọjọọ ahụ bi n’ụlọ ahụ achọghị ịgbanwe, gịnị ka ị ga-eme?

Robert: À na-ajụkwa ihe m ga-eme ajụ? M ga-achụpụnụ ha.

Marcus: Ihe a i kwuru bụ ihe Chineke ga-eme ndị ajọ omume ndị nọ n’ụwa taa. Legodị anya ọzọ n’amaokwu nke 10. O kwuru na ‘ndị ajọ omume agakwaghị anọ,’ nke bụ́ na Chineke “ga-achụpụ,” ma ọ bụ bibie, ndị na-akpatara ndị ọzọ nsogbu. N’oge ahụ, ndị ezi omume ga-ebi n’udo n’elu ụwa. Ama m na ihe a Baịbụl kwuru, nke bụ́ na ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, dị iche n’ihe a kụziiri gị n’oge gara aga.

Robert: I kwuru eziokwu. A kụzitụbeghị ụdị ihe a na chọọchị anyị.

Marcus: Dị ka i kwuru na mbụ, otu ebe ma ọ bụ ebe abụọ na Baịbụl agachaghị eme ka obi sie gị ike na ihe a m na-agwa gị bụ eziokwu. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịgụ ihe niile Baịbụl kwuru gbasara ihe Chineke ga-emere ndị ezi omume n’ọdịnihu. Ma ebe ndị ahụ anyị gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ taa, ó gosighị gị na ụfọdụ ndị ezi omume ga-aga eluigwe, ebe ọtụtụ ndị ezi omume ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi?

Robert: Ekwetachabeghị m. Ma n’eziokwu, o yiri ka ọ̀ bụ ihe ebe ndị ahụ anyị gụrụ na-ekwu. M ga-echebakwuru ihe i kwuru echiche.

Marcus: Ka ị na-echebakwuru ya echiche, e nwere ajụjụ ndị ọzọ nwere ike ịna-abata gị n’obi. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ, sị, Oleekwanụ maka ndị ezi omume ndị dịrị ndụ tupu oge anyị a? Ha niile hà gara eluigwe? Ọ bụrụ na ha agaghị eluigwe, oleekwanụ ebe ha nọ?

Robert: Ọ bụ ezigbo ajụjụ.

Marcus: O nwere ihe abụọ m ga-emere gị. Nke mbụ bụ na m ga-edepụtara gị amaokwu ole na ole na Baịbụl bụ́ ndị ga-enyere gị aka ịmata azịza nke ajụjụ ndị ahụ. * Nke abụọ bụ na ị gụchaa amaokwu ndị ahụ ma chebara ha echiche, m ga-abịaghachi ka anyị kwurịta ihe ha kwuru. Ọ̀ dịkwa mma otú ahụ?

Robert: Ọ dị mma. I meela.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]