Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Kpọrọ Mmegbu Asị

Jehova Kpọrọ Mmegbu Asị

Bịaruo Chineke Nso

Jehova Kpọrọ Mmegbu Asị

‘MMADỤ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’ (Ekliziastis 8:9) Ihe a Baịbụl kwuru na-eme n’ebe niile n’ụwa taa n’agbanyeghị na e dere ya ihe dị ka puku afọ atọ gara aga. Ebe ọ bụla ị gara n’ụwa, ndị mmadụ na-eji ikike ha nwere emegbu ndị ọzọ. Ndị a na-emegbukarị bụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. Ma olee otú obi na-adị Jehova ma ọ hụ mmegbu a ndị mmadụ na-emegbu ibe ha? Anyị ga-ahụ azịza ya n’akwụkwọ Ezikiel 22:6, 7, 31.—Gụọ.

N’iwu Jehova nyere ụmụ Izrel, ọ gwara ha hoo haa na ndị isi ekwesịghị iji ikike ha nwere na-emegbu ndị ọzọ. Jehova kwuru na ya ga-agọzi mba Izrel ma ọ bụrụhaala na ndị isi ha na-emetere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ebere ma na-enyere ha aka. (Diuterọnọmi 27:19; 28:15, 45) Ma n’oge Ezikiel nọ ndụ, ndị bụ́ ndị isi na Jeruselem nakwa na Juda nọ na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala. Gịnị ka ha nọ na-eme?

Ndị isi ji ‘ogwe aka ha na-awụfu ọbara.’ (Amaokwu nke 6) Okwu a bụ́ “ogwe aka” pụtara ike ma ọ bụ ikike. Lekwa otú Baịbụl ọzọ si sụgharịa amaokwu ahụ: “Ndị na-achị achị . . . ji ike ha nwere na-egbu ndị mmadụ.” Oleezi otú ihe ga-esi adị mma n’obodo mgbe ndị isi, bụ́ ndị kwesịrị irubere iwu Chineke isi ma na-akụziri ya ndị ọzọ, ji ikike ha nwere na-emegbu ndị mmadụ, na-egbukwa ndị ọ na-enweghị ihe ha mere?

Mgbe Ezikiel kwuchara banyere ndị isi ahụ, o kwukwara banyere ndị ọzọ so ndị isi ahụ na-enupụrụ Jehova isi. Ezikiel sịrị: “Ha elelịwo nna na nne.” (Amaokwu nke 7) Ebe ọ bụ na ndị ọjọọ a anaghịzi akwanyere ndị mụrụ ha ùgwù, ezinụlọ ndị e nwere na Jeruselem nakwa na Juda ghasasịrị, mba ha aghasasịakwa.—Ọpụpụ 20:12.

Ndị ọjọọ ahụ nọ na-emesi ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ike. Mgbe ọ bụla ha nupụụrụ Chineke isi, ha na-egosi na ha ejighị iwu ọma ndị ahụ Chineke nyere ha kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, Chineke gwara ha n’iwu ya ka ha na-enyere ndị mbịarambịa bi n’ala ha aka. (Ọpụpụ 22:21; 23:9; Levitikọs 19:33, 34) Kama ime ihe Chineke kwuru, ha nọ ‘na-erigbu ndị mbịarambịa’ bi n’ala ha.—Amaokwu nke 7.

Ndị ọjọọ ahụ megbukwara “nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ” bụ́ ndị na-enweghị ndị na-enyere ha aka. (Amaokwu nke 7) Jehova na-ahụ ihe ọjọọ niile a na-eme ụmụ na-enweghị nna ma ọ bụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ọ na-ewutekwa ya nke ukwuu. O kwere nkwa na ya ga-ebibi ndị na-emegbu ụmụ na-enweghị nna ma ọ bụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ.—Ọpụpụ 22:22-24.

Ihe ọjọọ ndị ahụ na ndị ọzọ ụmụ Izrel nọ na-eme n’oge Ezikiel gosiri na ha ejighị iwu ọma ndị ahụ Chineke nyere ha kpọrọ ihe. Gịnị ka Jehova ga-eme? O kwuru, sị: “M ga-awụkwasị ha ọnụma m.” (Amaokwu nke 31) Jehova mere ihe ahụ o kwuru. O kwere ka ndị Babịlọn bibie Jeruselem ma kpụrụ ndị bi na ya laa Babịlọn n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst.

E nwere ihe abụọ anyị na-amụta n’ihe ndị a Ezikiel kwuru banyere Jehova nakwa banyere otú Jehova si ele mmegbu anya: Nke mbụ bụ na Jehova kpọrọ mmegbu asị; nke abụọ abụrụ na ọ na-emetere ndị a na-emegbu emegbu ebere. Chineke agbanwebeghịkwa. (Malakaị 3:6) O kwere nkwa na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka mmegbu kwụsị ma bibie ndị na-emegbu ndị ọzọ. (Ilu 2:21, 22) Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo banyere Chineke bụ́ onye “hụrụ ikpe ziri ezi n’anya” ma mụtakwuo ihe ị ga-eme ka gị na ya dịkwuo ná mma?—Abụ Ọma 37:28.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Ọgọst:

Ezikiel 21-38

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Jehova kwuru hoo haa na ndị isi ekwesịghị iji ikike ha nwere na-emegbu ndị ọzọ