Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe Jizọs Ghọrọ Eze?

Olee Mgbe Jizọs Ghọrọ Eze?

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Olee Mgbe Jizọs Ghọrọ Eze?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị bụ alaeze ahụ e kwuru na a ga-enye Jizọs?

Chineke kwere Eze Devid nkwa na otu onye si n’ezinụlọ ya ga-anọkwasị n’ocheeze Chineke ma chịa ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ Jizọs bụ onye ahụ si n’ezinụlọ Devid, ọ na-achịkwa ugbu a n’Alaeze Chineke n’eluigwe.—Gụọ Abụ Ọma 89:4; Luk 1:32, 33.

Mgbe Devid ka bụ nwata, Jehova họọrọ ya ka ọ bụrụ eze ga-achị mba Izrel, bụ́ ndị Chineke. Mgbe Devid nwụrụ, ọ bụ Sọlọmọn ka Jehova họọrọ ka ọ nọkwasị “n’ocheeze Jehova.” (1 Ihe E Mere 28:4, 5; 29:23) Mgbe Sọlọmọn nwụrụ, e nwere ọtụtụ ndị eze chịrị na Jeruselem, ma ọtụtụ n’ime ha erubereghị Chineke isi. Jehova mechara kwe ka ndị agha Babịlọn bibie Jeruselem ma wepụ eze na-achị na ya n’oge ahụ. Ihe a mere n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. Kemgbe ahụ, ọ dịbeghị eze si n’ezinụlọ Devid nke bụ́ eze na Jeruselem.—Gụọ Ezikiel 21:27.

2. Afọ ole ka a na-agaghị enwe eze si n’ezinụlọ Devid nke na-achị n’ocheeze Chineke?

Mgbe e bibichara Jeruselem, Jehova gwara onye amụma ya bụ́ Daniel na ya ga-ahọrọ eze nke ga-esi n’eluigwe na-achị. Olee mgbe eze ahụ ga-amalite ịchị?—Gụọ Daniel 7:13, 14.

O nwere mgbe Daniel kọwara ọhụụ otu eze hụrụ. N’ọhụụ ahụ, Chineke nyere iwu ka e gbutuo otu nnukwu osisi otú ahụ o nyekwara iwu ka a kwatuo ma ọ bụ bibie alaeze ya nke dị na Jeruselem. Ma o kwuru na a ga-ahapụ úkwù osisi ahụ n’ala ka osisi ahụ nwee ike ipulitekwa mgbe “oge asaa” gafere. Baịbụl gosiri na afọ atọ na ọkara pụtara otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii. N’ihi ya, “oge asaa” pụtara puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị ise na iri abụọ. (Mkpughe 12:6, 14) N’amụma ndị e buru na Baịbụl, otu ụbọchị na-anọchikarị anya otu afọ. (Ọnụ Ọgụgụ 14:34) N’ihi ya, Alaeze Chineke ga-anọ puku afọ abụọ na narị afọ ise na iri abụọ n’enweghị eze.—Gụọ Daniel 4:10-17.

3. Olee mgbe Jizọs ghọrọ Eze?

Chineke chiri Jizọs Eze n’eluigwe n’afọ 1914, nke bụ́ puku afọ abụọ na narị afọ ise na iri abụọ e bibichara Jeruselem. Ike mbụ Jizọs kpara mgbe ọ ghọrọ Eze bụ ịchụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. (Mkpughe 12:7-10) O nweghị mmadụ hụrụ mgbe ihe a mere n’eluigwe, ma anyị niile na-ahụ ahụhụ anyị na-ata n’ihi ihe ahụ mere n’eluigwe. (Mkpughe 12:12) Ihe ndị na-eme kemgbe afọ 1914 gosiri na e chiri Jizọs Eze n’afọ ahụ.—Gụọ Matiu 24:14; Luk 21: 10, 11, 31.

4. Olee uru ọchịchị Jizọs ga-abara gị?

Ọtụtụ amụma ndị e buru banyere ọchịchị Jizọs emezuola. Nke a gosiri na i kwesịrị ịtụkwasị Okwu Chineke obi. N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-eji ikike ya napụta ụmụ mmadụ n’ahụhụ niile ha na-ata.—Gụọ Abụ Ọma 72:8, 12, 13; Daniel 2:44.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 215 ruo nke 218 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Chaatị dị na peeji nke 17]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ọktoba Ọktoba

607 T.O.N.K. * afọ 1914

← 2,520 afọ →

1000 T.O.N.K. 1 T.O.N.K. 1 O.N.K. 1000 O.N.K. Afọ 2000

← 606.25 afọ →← 1,913.75 afọ →

Mgbe e bibiri Jiri ígwè mgbakọ na mwepụ gbakọọ ya: Mgbe Chineke

alaeze ahụ dị 606.25 chiri Jizọs

na Jeruselem + 1,913.75 Eze n’eluigwe

= 2,520

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 T.O.N.K. pụtara Tupu Oge Ndị Kraịst, ebe O.N.K. pụtara Oge Ndị Kraịst.