Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Nrụrụ Aka Ekweghị Akwụsị Akwụsị?

Gịnị Mere Nrụrụ Aka Ekweghị Akwụsị Akwụsị?

Gịnị Mere Nrụrụ Aka Ekweghị Akwụsị Akwụsị?

‘Mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’—EKLIZIASTIS 8:9.

IHE A Baịbụl kwuru bụ nnọọ otú ọchịchị ụmụ mmadụ dị kemgbe ụwa. O meela ka ndị mmadụ na-atagbu onwe ha n’ahụhụ. Ọ dịla anya ọtụtụ ndị gbawara mbọ ka ihe dịrị ndị mmadụ mma, ma anyaukwu na nrụrụ aka emeela ka mbọ ndị ahụ kụọ afọ n’ala. Gịnị mere mbọ ndị ahụ ha gbara ji kụọ afọ n’ala? Gịnị mere nrụrụ aka ekweghị akwụsị akwụsị? Ọ bụ n’ihi ihe atọ a anyị chọrọ ileba anya.

1. Nke Mbụ: Mmehie.

Baịbụl kwuru hoo haa na anyị niile ‘nọ n’okpuru mmehie.’ (Ndị Rom 3:9) Mmehie dị ka ọrịa na-enweghị ngwọta nke mmadụ butere n’aka ndị mụrụ ya. O “bi” ebi n’ime anyị. Kemgbe ọtụtụ puku afọ, mmehie ‘na-achị’ ụmụ mmadụ dị ka eze. Mmehie na-akpa ike n’ahụ́ anyị. Ọ na-eme ka ọtụtụ ndị na-achọ naanị ọdịmma nke onwe ha, na-achụ ego ma ọ bụ na-azọ ọkwá ka à na-anwụ anwụ n’agbanyeghị nsogbu ihe ndị a ha na-eme na-akpatara ndị ọzọ.—Ndị Rom 5:21; 7:17, 20, 23, 25.

2. Nke Abụọ: Ụwa ọjọọ anyị bi n’ime ya.

Ihe e ji mara ụwa anyị a bụ anyaukwu na mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Ọ bụ ya mere o ji esiri ụfọdụ ndị ike ịkwụwa aka ha ọtọ. Oké ọchịchọ emeela ka ha na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ọchịchị ruo ha aka. Ọ na-agụsikwa ha agụụ ike inwetakwu ego na akụnụba n’agbanyeghị na o nweghị ihe ha ji ha eme. Ọ dị mwute na ha nwere ike ime ihe ọjọọ ọ bụla ka ha nweta ihe ndị ahụ ha chọrọ. Kama ịgbalịsi ike ka ha ghara ime ihe ndị ahụ, ha ‘na-eso ndị ọzọ na-eme ihe ọjọọ.’—Ọpụpụ 23:2.

3. Nke Atọ: Setan bụ́ Ekwensu.

Setan bụ mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi. Ọ “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ọ na-atọ ya ụtọ ịghọgbu ndị mmadụ. Ebe ọ bụ na ọ maara na ọ na-agụ ndị mmadụ agụụ inweta ihe ndị dị ha mkpa ná ndụ, ọ na-eji aghụghọ eme ka ndị mmadụ na-etinye aka n’ihe ọjọọ iji nweta ihe ndị ahụ dị ha mkpa.

Nke a ọ̀ pụtara na anyị ga na-eme ihe Ekwensu kwuru, ma ànyị chọrọ ya ma ọ̀ bụ na anyị achọghị? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.