Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Chineke Ọ̀ Na-ata Ndị Ajọ Omume Ahụhụ n’Ọkụ Ala Mmụọ?

Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Chineke Ọ̀ Na-ata Ndị Ajọ Omume Ahụhụ n’Ọkụ Ala Mmụọ?

Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara​—Chineke Ọ̀ Na-ata Ndị Ajọ Omume Ahụhụ n’Ọkụ Ala Mmụọ?

Ọ NA-ATỌ Ndịàmà Jehova ụtọ ka ha na ndị agbata obi ha na-akparịta ihe ndị dị na Baịbụl. Ò nwere ajụjụ gbasara Baịbụl ị ga-achọ ịma azịza ya? Ò nwere ihe Ndịàmà Jehova kweere ma ọ bụ ihe ha na-eme na-agbagwoju gị anya? Ya bụrụ otú ahụ, jụọ ya Onyeàmà Jehova ọzọ gị na ya ga-ahụ. Obi ga-atọ ya ụtọ ịza gị ya.

N’okpuru ebe a, e dere ihe Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike ịkparịta. Ka anyị were ya na Onyeàmà Jehova aha ya bụ Dick gara n’ụlọ otu onye aha ya bụ Harry.

Chineke Ọ̀ Ga-ata Ndị Ajọ Omume Ahụhụ?

Dick: Harry, olee otú unu mere?

Harry: Anyị dị mma. Nnọọ.

Dick: O nwere ihe i kwuru n’ụbọchị ahụ m bịara. M ka na-eche ya kemgbe ahụ.

Harry: Olee ihe ọ bụ?

Dick: I kwuru na o juru gị anya na Ndịàmà Jehova ekwetaghị na ọkụ ala mmụọ dị.

Harry: N’eziokwu, o juru m anya. O siiri m ike ikweta na unu ekweghị na ọkụ ala mmụọ dị.

Dick: Otú a ị gwara m ya dị mma. Ọ na-adị m mma ka ndị mmadụ gwa m ihe dị ha n’obi. Ma, ọ na-abụ m jụọ ndị mmadụ ihe ọkụ ala mmụọ pụtara, ihe ha na-aza anaghị abụ otu. M ga-achọ ka ị gwa m ihe i chere ọkụ ala mmụọ bụ.

Harry: Ihe m ma kemgbe ụwa bụ na ndị ajọ omume nwụọ, ha na-aga n’ọkụ ala mmụọ, ha ga-anọkwa n’ebe ahụ na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi.

Dick: Ọtụtụ ndị na-ekwu otú ahụ. Ma, ka m jụgodị gị, ò nwetụla ihe ọjọọ mere gị kemgbe ndụ gị?

Harry: Eheenụ! O nwetụla. Ndị ọjọọ gburu nwanne m nwaanyị afọ ise gara aga.

Dick: Chaị! Ndo. Ama m na ọnwụ ya ka na-ewute gị.

Harry: Ọ ka na-ewute m. Ọ naghị apụ m apụ n’obi.

Dick: Achọpụtara m na ihe mere ọtụtụ ndị ji achọsi ike ka Chineke taa ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ bụ n’ihi ihe ọjọọ ndị ajọ omume merela ha. O doro anya na ndị aka ha dị ọcha ga-achọ ka ndị ajọ omume jiri isi ha buru ihe ọjọọ ndị ha metara.

Harry: Gbam! Achọrọ m ka nwoke ahụ gburu nwanne m nwaanyị hụsie anya maka ihe ahụ o mere ezinụlọ anyị.

Dick: Ihe i kwuru adịghị njọ. Baịbụl kwuru na ọ na-ewute Chineke ma e mesie ndị ọ na-enweghị ihe ha mere ike. O kwekwara nkwa na ya ga-ata ndị ajọ omume ahụhụ. Legodị ihe e kwuru n’Aịzaya 3:11. Ebe ahụ kwuru, sị: “Ahụhụ ga-adịrị onye ajọ omume!—Ka ọdachi dakwasị ya; n’ihi na ihe o mere ndị ọzọ ka a ga-eme ya!” Ebe a gosiri na obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-ata ndị ajọ omume ahụhụ.

Harry: Oleekwanụ otú Chineke ga-esi ata ha ahụhụ ebe i kwuru na ọkụ ala mmụọ adịghị?

Dick: Ajụjụ a ị jụrụ dị mma. Ngwa, ka m zaa gị ya. Ahụhụ Chineke ga-ata ha abụghị ahụhụ nkịtị, kama ọ ga-ebibi ha kpamkpam. Legodị ihe Baịbụl kwuru ná 2 Ndị Tesalonaịka 1:9. Biko, gụọ ebe ahụ.

Harry: Ngwanụ, ka m gụọ ya. Ebe ahụ sịrị: “Ndị a ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke bụ́ mbibi ebighị ebi wee pụọ n’ihu Onyenwe anyị, pụọkwa n’ebube nke ike ya.”

Dick: Harry, ị̀ hụrụ na ebe a kwuru na mbibi a ga-ebibi ndị ajọ omume bụ mbibi ebighị ebi, nke bụ́ na ha ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi? Ha agaghị adị ndụ ọzọ.

Harry: Ahụrụ m ihe amaokwu ahụ kwuru. Ma nke ahụ adịghị mma. È nwere onye na-agaghị anwụ anwụ? Ọ̀ bụ na e kwesịghị ịta ndị ajọ omume ezigbo ahụhụ?

Gịnị Ka E Kwesịrị Ime Ndị Ajọ Omume?

Dick: Achọpụtara m na ị chọrọ ka onye mere ihe ọjọọ taa ahụhụ ihe o metara.

Harry: Ọọ eziokwu.

Dick: Nke ahụ dị mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị onye ihe ọma na-asọ nsọ, o nwekwanụghị onye ihe ọjọọ na-atọ ụtọ. Ọ bụ otú ahụ ka Chineke kere ụmụ mmadụ. Ihe ọjọọ anaghịkwa atọ Chineke ụtọ. Ma mgbe ndị ụkọchukwu na ndị pastọ na-ekwu na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ, ihe ha na-ekwu n’eziokwu bụ na ihe ọjọọ na-atọ Chineke ụtọ.

Harry: Aghọtabeghị m ihe ị na-ekwu.

Dick: Ngwa, ka m meere gị otu ihe atụ. Ama m na ị ma akụkọ Adam na Iv.

Harry: À na-ajụkwa ajụ? Chineke sịrị ha erila otu mkpụrụ osisi, ha enupụrụ ya isi rie ya.

Dick: I kwutere ya. Ngwa, ka anyị gụọ ebe ọ dị na Baịbụl. Ọ dị na Jenesis 2:16, 17. Ebe ahụ sịrị: “Jehova bụ́ Chineke nyekwara mmadụ ahụ iwu, sị: ‘I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.’” Olee ihe Chineke kwuru ga-eme Adam ma o rie mkpụrụ osisi ahụ ọ sịrị ya erila?

Harry: Ọ sịrị na Adam ga-anwụ.

Dick: Ị zatara ya. Ma chegodị echiche: Mmehie ahụ Adam mere mere ka mmadụ niile bụrụ ndị mmehie. * N’agbanyeghị nke a, Chineke ò kwuru na ọ ga-ata Adam ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ?

Harry: Mba.

Dick: Ọ bụrụ na Chineke bu n’obi ịta Adam na Iv ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi, ọ̀ bụ na ọ gaghị agwa ha agwa ebe ọ bụ na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi?

Harry: Ọ gaara agwanụ ha.

Dick: Ọ ga-adịkwa mma ka ị hụ ihe Chineke gwara Adam na Iv mgbe ha nupụchaara ya isi. Biko, gụọ ya na Jenesis 3:19.

Harry: Nsogbu adịghị. Ebe ahụ kwuru, sị: “Ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na e si na ya wepụta gị. N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.”

Dick: I meela. Olee ebe amaokwu a kwuru na Adam ga-aga?

Harry: O kwuru na Adam ga-alaghachi n’ájá.

Dick: I kwutere ya. Í cheghị na e kwuo na o nwere ebe mmadụ ga-alaghachi, ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ nọbu ebe ahụ?

Harry: Ọ bụ eziokwu.

Dick: Oleekwanụ ebe i chere Adam nọ tupu Chineke ekee ya?

Harry: O nweghị ebe ọ nọ.

Dick: Ị zatara ya. Ị̀ hụrụ na Chineke ekwuteghị okwu ọkụ ala mmụọ mgbe ọ gwara Adam ebe ọ ga-alaghachi? Chineke ò kwesịrị ịgwa Adam na ọ ga-alaghachi n’ala bụ́ ebe e si wepụta ya ma ọ bụrụ n’eziokwu na ọ ga-aga n’ọkụ ala mmụọ?

Harry: Mba, o kwesịghị ịgwa ya otú ahụ.

Ekwensu Ọ̀ Na-ejere Chineke Ozi?

Dick: O nwere ihe ọzọ dị mkpa anyị kwesịrị ilebara anya n’okwu a.

Harry: Olee ihe ọ bụ?

Dick: Ònye ka ndị mmadụ na-asị na ọ bụ ya na-elekọta ndị nọ n’ọkụ ala mmụọ? Ònye ka ha na-ekwu na ọ bụ ya na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ebe ahụ?

Harry: Ọ bụ Ekwensu.

Dick: Ma, ị manụ na Ekwensu bụ onye iro Chineke. Ọ bụrụ na Chineke na-ezigara Ekwensu ndị ọ ga na-ata ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ, í cheghị na ihe ọ pụtara bụ na Chineke na Ekwensu na-arụkọ ọrụ?

Harry: I kwuru eziokwu. Echetụbeghị m ya otú ahụ.

Dick: O nwere ihe atụ m chọrọ imere gị. Ọ ga-eme ka ị ghọtakwuo ihe m na-ekwu. Ọ̀ kwa i nwere nwa?

Harry: Eenụ, enwere m. Ọkpara m dị afọ iri na ise ugbu a.

Dick: Weregodị ya na ọkpara gị malitere ime ihe na-agbawa gị obi. Gịnị ka ị ga-eme?

Harry: M ga-agbalị ka m nyere ya aka ka ọ kwụsị àgwà ọjọọ ọ na-akpa.

Dick: Ama m na ị ga-eme ihe niile i nwere ike ime ka ọ kwụsị ya.

Harry: À na-ajụkwa ajụ?

Dick: Weregodị ya na n’agbanyeghị ihe niile i mere, ọ kwụsịghị ihe ọjọọ ahụ. Ama m na ihe ị ga-emezi bụ ịta ya ahụhụ, ọ̀ kwa ya?

Harry: Ọọ ya.

Dick: Ma gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọpụta na e nwere onye ọjọọ na-emegharị ya anya ma na-akụziri ya ihe ọjọọ niile ahụ ọ na-eme?

Harry: M ga-ewesa onye ahụ iwe.

Dick: M ga-achọ ka i gee ntị n’ajụjụ m chọrọ ịjụ gị ugbu a. Ozugbo ị matara na e nwere onye ọjọọ na-emegharị nwa gị anya ma na-akụziri ya ka ọ na-enupụrụ gị isi, ị̀ ga-akpọnye ya nwa gị ma gwa ya ka ọ taara gị ya ahụhụ?

Harry: Mbanụ. A naghị eme ụdị ihe ahụ eme.

Dick: Ebe ọ dị otú ahụ, ọ̀ dịnụ mma ka anyị kwuo na Chineke ga-agwa Setan bụ́ Ekwensu ka ọ taara ya ndị ahụ o duhiere ahụhụ ebe ọ bụkwanụ na ọ bụ Ekwensu na-eme ka ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ?

Harry: Mba, ọ dịghị mma.

Dick: N’eziokwu, ọ bụrụ na Chineke chọrọ ịta ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ, ì chere na Ekwensu ga-ekweta ime ihe Chineke gwara ya mee, ya bụ, ịtara ya ndị ajọ omume ahụhụ ebe ọ bụ onye iro Chineke?

Harry: Echeghị m otú ahụ.

Jehova Ga-eme Ka Ajọ Omume Niile Kwụsị

Dick: Ma o nwere ihe ọzọ ga-eme gị obi ụtọ. Ihe ahụ bụ na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume na-enweghị nchegharị. Ka anyị gụọ ebe ikpeazụ ga-eme ka ị ghọta ihe a m kwuru. Ebe m chọrọ ka anyị gụọ bụ Abụ Ọma 37:9. Biko, gụọ ya.

Harry: Ọ dị mma. Ebe ahụ sịrị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.”

Dick: I meela. Olee ihe ebe ahụ kwuru Jehova Chineke ga-eme ndị na-eme ihe ọjọọ?

Harry: O kwuru na Chineke ga-ebipụ ha.

Dick: I kwutere ya. Ihe ọ pụtara bụ na Chineke ga-ebibi ha, o nweghịkwa mgbe ha ga-adị ndụ ọzọ. Ma ndị ezi omume, ya bụ, “ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ,” ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ama m na o nwere ajụjụ ndị ga na-abata gị n’obi ugbu a. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ, sị, Gịnị mere Chineke ji hapụdị ụmụ mmadụ ka ha malite ime ihe ọjọọ? Ọ bụrụkwa na o bu n’obi ibibi ndị ajọ omume, gịnị mere na o bibibeghị ha kemgbe?

Harry: Ehee! Ọ bụ ajụjụ ndị m bu n’obi ịjụ gị.

Dick: M bịa ụbọchị ọzọ, m ga-egosi gị azịza ha na Baịbụl. *

Harry: Ọ dị mma otú ahụ. I meela.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ Gụọ Ndị Rom 5:12.

^ Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata azịza ajụjụ ndị ahụ, gụọ isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.