Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Ọzụzụ Atụrụ

Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Ọzụzụ Atụrụ

Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Ọzụzụ Atụrụ

“Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya; ọ ga-ekuru ha n’obi ya.”​—AỊZAYA 40:11.

EKWURU banyere ndị ọzụzụ atụrụ n’ọtụtụ ebe na Baịbụl, malite na Jenesis ruo ná Mkpughe. (Jenesis 4:2; Mkpughe 12:5) Ọtụtụ ndị a ma ama n’oge ochie, dị ka Ebreham, Mozis, na Eze Devid, bụcha ndị ọzụzụ atụrụ. Ọbụ abụ bụ́ Devid kọwara ọrụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ na-arụ na ihe ndị bụ́ mkpa ya. Otu abụ ọma a kpọrọ abụ ọma Esaf kwuru na Devid bụ onye na-azụ ndị Chineke dị ka atụrụ n’oge ochie.—Abụ Ọma 78:70-72.

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọrụ ịzụ atụrụ ka bụ ọrụ dị oké mkpa. Jizọs sịrị na ya bụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma.” Ọtụtụ mgbe, o ji àgwà ndị e ji mara ezigbo onye ọzụzụ atụrụ kụziere ndị mmadụ ihe ga-abara ha uru. (Jọn 10:2-4, 11) Na Baịbụl, e jidị Jehova Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, tụnyere “onye ọzụzụ atụrụ.”—Aịzaya 40:10, 11; Abụ Ọma 23:1-4.

Olee ụdị anụmanụ ndị onye ọzụzụ atụrụ na-azụ? Olee ihe ndị ọ na-arụ? Gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’aka onye ọzụzụ atụrụ?

Atụrụ na Ewu

O nwere ike ịbụ na otu n’ime ụdị atụrụ ndị ọzụzụ atụrụ e nwere n’Izrel oge ochie na-azụ bụ atụrụ ndị Siria bụ́ ndị ọdụdụ ha na-ebutụ ibu. Atụrụ ndị ahụ na-enwekwa nnukwu ajị n’ahụ́. Ndị nke oké na-enwe mpi, ndị nke nne anaghị enwe. Ọ na-adị mfe ịzụ atụrụ ndị a n’ihi na ha na-erube isi. Ma, ọ na-adịkwara ndị ọjọọ na anụ ọhịa mfe ịkpara ha aka ma ọ bụ igbu ha.

Ndị na-azụ atụrụ na-azụkwa ewu. Ewu na-eji oji ma ọ bụ na-acha nchara nchara. Ntị ha na-asatụ mbara. Ọ bụ ya mere ogwu na osisi ji emerụkarị ha ahụ́ ná ntị mgbe ha na-arị ugwu ma ọ bụ mgbe ha na-ata ahịhịa n’akụkụ ugwu.

Otu nsogbu onye ọzụzụ atụrụ na-enwe mgbe niile bụ ịkụziri ewu na atụrụ ya ka ha na-erubere ya isi. N’agbanyeghị na ime nke a adịghị mfe, ezigbo onye ọzụzụ atụrụ na-elekọta ewu na atụrụ ya nke ọma, ọ na-agụkwa ha aha. Ọ na-abụ ya kpọọ ha aha ndị ahụ, ha agbara bịa.—Jọn 10:14, 16.

Otú Onye Ọzụzụ Atụrụ Si Azụ Atụrụ n’Oge Dị Iche Iche

Malite n’ọnwa Eprel, onye ọzụzụ atụrụ na-akpọrọ ìgwè ewu na atụrụ ya kwa ụbọchị aga n’ebe e nwejuru ahịhịa ndụ ka ha taa ahịhịa. Ebe ọ na-akpọ ha aga bụ n’ala ịta ahịhịa ndị na-adịghị anya n’obodo ya. Ọ bụ n’oge a ka nne atụrụ na nne ewu na-amụkarị ụmụ. Nke a na-eme ka ìgwè ewu na atụrụ ya dịkwuo ọtụtụ. Ọ bụkwa n’oge a ka a na-akpacha ajị atụrụ, bụrụkwa oge ndị nwe atụrụ ji eri oriri.

Ụfọdụ ndị n’obodo na-enwe naanị atụrụ ole na ole. N’ihi ya, ha na-enyefe onye ọzụzụ atụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ ka ọ zụwara ha. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-etinyekọta ha n’atụrụ ndị nke ya ma zụwa ha. Ndị na-azụrụ ndị mmadụ atụrụ anaghị elekọta atụrụ ndị ahụ anya otú ha si elekọta atụrụ nke ha.—Jọn 10:12, 13.

Ọ bụrụ na ndị ọrụ ubi ewerechaa ihe ubi n’ubi ha, ndị ọzụzụ atụrụ nwere ike ịkpọrọ ìgwè ewu na atụrụ ha gaa n’ubi ndị ahụ ka ha taa ahịhịa na ọka ndị e wefọrọ ewefọ. N’oge ọkọchị, ndị ọzụzụ atụrụ na-akpọrọ anụ ha aga n’ala ịta nri ebe na-ajụtụ oyi n’ugwu ka atụrụ ha nwee ike ịta ahịhịa n’ebe ahụ. Ha na-anọ n’ebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ha na-anọ ehi ụra ma chi jie. Onye ọzụzụ atụrụ na-echekwa ha nche n’abalị, na-akpọba ha n’ọgba mgbe ụfọdụ ka anụ ọhịa ndị dị ka nkịta ọhịa ghara ịdọgbu ha. Ọ bụrụ na ụja nkịta ọhịa na-agbọ emee ka ìgwè ewu na atụrụ ndị ahụ tụwa ụjọ n’abalị, onye ọzụzụ atụrụ na-ekwu okwu otú ga-eme ka ahụ́ ruo ha ala.

Ná mgbede ọ bụla, onye ọzụzụ atụrụ na-agụ atụrụ na ewu ya ọnụ ma leruo ha anya ka ọ mara ma ahụ́ ọ̀ dịkwa ha niile. N’ụtụtụ, ọ na-akpọ ha òkù, ha niile apụta soro ya gawa n’ebe ha ga-ata ahịhịa. (Jọn 10:3, 4) N’ehihie, ọ na-eduru ha aga n’iyi ka ha ṅụọ mmiri jụrụ oyi. N’oge iyi tachara, ọ na-akpọrọ ha aga n’olulu mmiri ma dọpụtara ha mmiri ka ha ṅụọ.

Mgbe oge ọkọchị gwụwara, ọ na-esi n’ugwu kpọrọ ìgwè ewu na atụrụ ya gaa na ndagwurugwu ma ọ bụ n’ebe dị nso n’osimiri. N’oge udu mmiri, mgbe oyi na-atụ, ọ na-akpọrọ ha lọta n’ụlọ ma kpọba ha n’ụlọ anụ ya. Ha ga-anọ n’ebe ahụ ruo mgbe oge oyi gafere. Ya nwaa anwaa hapụ ha n’èzí, mmiri, oké ifufe na snoo ga-egbuchapụ ha. Malite na Nọvemba ruo ihe dị ka Eprel, onye ọzụzụ atụrụ anaghị akpọpụta ha èzí.

Ihe Ndị Onye Ọzụzụ Atụrụ Na-eji Ma Ọ Gawa Ịzụ Ewu na Atụrụ

Onye ọzụzụ atụrụ na-eyi uwe kusara ekusa n’ahụ́. Ọ na-eyi uwe ajị atụrụ ka oyi ghara ịtụgbu ya n’abalị ma ọ bụ ka mmiri ghara ịmagbu ya. Ọ na-abụ ya yiri uwe ahụ, ajị atụrụ ahụ na-adị n’ime. Ma, ọ na-eyikwa uwe na-enweghị aka n’ime. Ọ na-eyikwa akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ ka ogwu ma ọ bụ nkume ghara imerụ ya ahụ́. Ọ na-ejikwa ákwà afụchi isi ya.

Lee ihe ndị onye ọzụzụ atụrụ na-eji ma ọ gawa ịzụ ewu na atụrụ: Akpa e ji akpụkpọ anụ mee nke o ji etinye ihe oriri ndị dị ka achịcha, mkpụrụ oliv, mkpụrụ osisi a mịrị amị, na chiiz (1); okpiri ígwè o ji echebe onwe ya na atụrụ ya. Okpiri ígwè a na-adị ihe dị ka otu mita n’ogologo, isi ya na-ebukwa ibu (2). Ihe ndị ọzọ bụ obere mma (3); mkpara o ji aga ije ma na-arị ugwu (4); ihe o ji agbara mmiri (5); ihe o ji esere mmiri n’olulu (6); èbè o ji agbapụ okwute ka ụjọ jide atụrụ ma ọ bụ ewu kpafuru akpafu ka ọ lọghachi n’ebe ndị ibe ya nọ. Ọ na-ejikwa ya achụ anụ ọhịa ọsọ (7). Ihe ọzọkwa bụ ọjà ọ na-egbu iji mee onwe ya obi ụtọ ma mee ka ahụ́ ruo ìgwè anụ ya ala (8).

Ewu na atụrụ na-abara onye ọzụzụ atụrụ uru n’ihi na ọ na-esi na ha enweta anụ ya na ezinụlọ ya ga-eri nakwa mmiri ara ewu ma ọ bụ mmiri ara atụrụ. Ọ na-ejikwa ajị ha na akpụkpọ ha enweta ihe ndị ọzọ dị ya mkpa, jirikwa ha eme uwe na karama e ji agbanye mmiri ma ọ bụ mmanụ. A na-eji ajị ewu akpa ákwà, na-ejikwa ma ewu ma atụrụ achụ àjà.

Ihe Anyị Na-amụta n’Aka Ndị Ọzụzụ Atụrụ

Ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ na-arụsi ọrụ ike, ha anaghịkwa atụ ụjọ. Ha na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ iji chebe ewu na atụrụ ha.—1 Samuel 17:34-36.

Ọ bụ ya mere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ji chọọ ka ụmụ nwoke ndị na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpa àgwà ka ndị ọzụzụ atụrụ. (Jọn 21:15-17; Ọrụ Ndịozi 20:28) Otú ahụ ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ si elekọta atụrụ ha nke ọma n’oge ochie bụkwa otú ndị na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge a si agbalịsi ike ka ha ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke nke ha na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama ha na-eji obi ha na-azụ ha; ọ bụghị n’ihi na ha hụrụ uru aghụghọ n’anya, kama n’ihi na ha na-anụ ọkụ n’obi.’—1 Pita 5:2.

[Foto dị na peeji nke 28]

(Lee ebe e sere ya n’akwụkwọ a)