Otú Unu Ga-esi Kwụọ Ụgwọ Unu Ji
Ihe Ndị Na-eme Ka E nwee Obi Ụtọ N’ezinụlọ
Otú Unu Ga-esi Kwụọ Ụgwọ Unu Ji
Giannis: * “Ahịa m na-azụ dara mgbe ihe malitere isi ike ná mba Gris. Nke a mere ka o siere anyị ike ịkwụ ego anyị gbazitere rụọ ụlọ anyị, meekwa ka o siere ndị mmadụ ike iresị anyị ihe n’aka. Ihe ndị a mere ka m ghara ịna-ehi ụra nke ọma n’ihi oké echiche.”
Katerina: “Obi anyị niile dị n’ụlọ ahụ anyị rụrụ, ọ na-ewutekwa m na e nwere ike ịnapụ anyị ya n’ihi ụgwọ anyị ji. Ọtụtụ mgbe, mụ na di m Giannis sere okwu mgbe anyị na-ekwurịta otú anyị ga-esi kwụọ ụgwọ anyị ji.”
ỌBỤRỤ na di na nwunye ji ụgwọ, o nwere ike ịkpatara ha nsogbu ma ọ bụ mee ka ha tisaa. Dị ka ihe atụ, otu ọkachamara aha ya bụ Jeffrey Dew kwuru na di na nwunye ndị ji ụgwọ na-esekarị okwu, ha anaghị enwecha obi ụtọ, ha anaghịkwa enwecha oge ha ji anọrị. Okwu ego na iji ụgwọ na-akpatara di na nwunye esemokwu na-anaghị ebi ebi. Ọ na-emekwa ka ha na-abara ibe ha mba ma na-alụ ọgụ, ọ na-akpatakwara ha nsogbu ndị ọzọ. Ọ bụ ya mere na o kwesịghị iju anyị anya na okwu ego bụ ihe kacha eme ka di na nwunye na-agba alụkwaghịm.
Iji oké ụgwọ na-akpatakwara ndị mmadụ ọrịa ndị dị ka ehighị ụra nke ọma, isi ọwụwa, afọ ọrụrụ, obi nkuchi, na ịda mbà n’obi. Otu nwaanyị aha ya bụ Marta kwuru, sị: “Ụgwọ anyị ji mere ka di m daa mbà n’obi nke na ọ na-anọ n’ụlọ mgbe niile na-ehi ụra. Di m, bụ́ agụ nwoke, nọzi n’amaghị ihe ọ ga-eme eme.” Ụfọdụ ndị anaghị edili nsogbu iji ụgwọ kpataara ha. Dị ka ihe atụ, otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi kwuru na otu nwaanyị n’India gburu onwe ya maka na o nwekwaghị ike ịkwụ ụgwọ o ji. Ụgwọ o ji dị ihe dị ka otu narị puku naịra na puku iri atọ. Nwaanyị ahụ ji ego ahụ gwọọ ụmụ ya.
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ụgwọ unu ji na-akpatara unu nsogbu? Ka anyị leba anya ná nsogbu
ụfọdụ di na nwunye na-enwe mgbe ha na-agbalị ka ha kwụọ ụgwọ ha ji nakwa otú Baịbụl ga-esi enyere ha aka imeri nsogbu ndị ahụ.NSOGBU NKE MBỤ: Anyị na-ata ibe anyị ụta.
Otu nwoke aha ya bụ Lukasz kwuru, sị: “Ana m agwa nwunye m na ọ na-emefukarị ego. Nwunye m na-agwa m na a sị na m na-arụ ọrụ mgbe niile n’afọ, ego agaghị na-akọ anyị.” Gịnị ka di na nwunye ga-eme ka ụgwọ ha ji ghara ime ka ha na-ese okwu?
Ihe ga-enyere unu aka: Jikọọnụ aka chọọ otú unu ga-esi akwụ ụgwọ unu ji. Ọ gaghị adị mma ka ị na-ewere di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe, ọ bụrụgodị na ọ bụ ya kotere ụgwọ ahụ. Ọ bụ ugbu a ka ọ kacha mkpa ka unu mee ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 4:31. Ebe ahụ kwuru, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.”
Chọwanụ otú unu ga-esi akwụ ụgwọ ahụ, ọ bụghị isewa okwu. Otu nwoke aha ya bụ Stephanos kwuru otú ya na nwunye ya si mekọọ ihe ọnụ n’oge ha ji ụgwọ. Ọ sịrị: “Mụ na nwunye m weere ụgwọ ahụ anyị ji ka nsogbu bịaara anyị abụọ.” Ime otú ahụ dabara n’ihe e kwuru n’Ilu 13:10. Ebe ahụ kwuru, sị: “Site n’ịdị mpako, naanị ihe mmadụ na-akpata bụ ọgụ, ma ndị na-agba izu na-enwe amamihe.” Ekwela ka mpako mee ka ị chọwa otú ị ga-esi akwụ ụgwọ ahụ naanị gị. Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwurịta ihe niile banyere ụgwọ ahụ. Unu kwurịtachaa, jikọọnụ aka mee ihe unu kwurịtara.
Ụmụ unu nwekwara ike inyere unu aka. Otu nwoke bi n’Ajentina, nke aha ya bụ Edgardo, kwuru ihe mere n’ezinụlọ ya. Ọ sịrị: “Obere nwa anyị nwoke chọrọ ka anyị zụọrọ ya ígwè ọhụrụ, ma anyị gwara ya ihe mere anyị na-agaghị enwe ike ịzụrụ ya ígwè ahụ. Ihe anyị meziri bụ ibunye ya ígwè nna ya ochie, ịgba ígwè ahụ na-atọkwa ya ụtọ. Nke a mere ka m ghọta na ime ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ mata otú ihe si kwụrụ bara ezigbo uru.”
MEENỤ IHE A: Wepụtanụ oge unu ga-eji kwurịta okwu banyere ụgwọ unu ji. Mgbe unu na-ekwurịta ya, unu abarala ibe unu mba. Ọ bụrụ na e nwere ebe i mejọrọ ihe, kweta na i mejọrọ ihe. Chefuonụ ihe ndị garala aga, ma gbalịanụ ka unu kwekọrịta otú unu ga-esi na-emefu ego unu.—Abụ Ọma 37:21; Luk 12:15.
NSOGBU NKE ABỤỌ: Anyị echeghị na anyị ga-akwụchali ụgwọ anyị ji.
Otu nwoke aha ya bụ Enrique kwuru, sị: “Ahịa m na-azụ mere ka m jide ọtụtụ ndị ụgwọ. Nsogbu m bịara ka njọ mgbe ihe malitere isi ike ná mba Ajentina. N’oge ahụ, a chọrọ ịwa nwunye m ahụ́. Ọ bịaziri dị m ka o nweghị otú m ga-esi akwụ ụgwọ ndị ahụ m ji.” Mgbe otu nwoke bi na Brazil, onye aha ya bụ Roberto, ji ego niile o nwere zụọ ahịa, ego niile ahụ miri ala, ya ejirikwa ụlọ akụ̀ iri na abụọ ụgwọ. O kwuru, sị: “Ihere na-eme m mgbe ọ bụla m hụrụ ndị enyi m. Ọ dị m ka nke m na-eme ná ndụ agwụla.”
Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ụgwọ unu ji emee ka ihere na-eme gị ma ọ bụ ka ike ndụ gwụ gị?
Ihe ga-enyere unu aka: Kpebienụ ihe unu ga-eji ego unu na-eme. *
1. Chọpụtanụ ego ole unu na-emefu. Depụtanụ ego niile unu na-akpata ma ọ bụ ego niile unu na-emefu n’ezinụlọ unu n’izu abụọ, ma ọ bụ n’otu ọnwa, ma ọ bụrụ na ọ kara unu mma. Depụtakwanụ ego ndị ọzọ unu na-emefu, dị ka ego ụtụ isi, ego inshọrans, na ego uwe. Ebe ọ bụ na ọ bụghị n’ọnwa niile ka unu na-emefu ego ndị ahụ, gbakọọnụ ego ole o nwere ike ịbụ kwa ọnwa.
2. Gbalịanụ ka unu na-akpatakwu ego. I nwere ike ịna-arụtụkwu ọrụ n’ebe ị na-arụ ọrụ ma ọrụ gbasaa ma ọ bụ na-arụ ọrụ ụfọdụ a na-arụ n’oge ọtụtụ ndị chọrọ ya. I nwekwara ike ịna-akụziri ụmụ akwụkwọ ihe mgbe a gbasara akwụkwọ ma ọ bụkwanụ gị arụọ ọrụ ọ bụla ọzọ ị ma arụ. Buru n’uche na i kwesịghị ikwe ka ihe ndị a gbochie gị ime ihe ndị ka mkpa ná ndụ gị, dị ka ihe ndị gbasara ife Chineke.
3. Selatanụ aka n’ego unu na-emefu. Na-azụnụ naanị ihe ndị dị unu mkpa, ọ bụghị ihe ọ bụla unu hụrụ n’ahịa. (Ilu 21:5) Enrique, bụ́ onye e kwuburu okwu ya, sịrị: “Ọ ka mma ichere ka oge gafetụ tupu gị azụwa ihe ọ bụla. Ime otú ahụ ga-eme ka ị mara ma ihe ahụ ọ̀ dị gị mkpa ka ọ̀ bụ na ọ dịghị gị mkpa.” Lee ihe ụfọdụ ga-enyere unu aka.
● Ụlọ: Ọ bụrụ na ọ dịịrị unu mfe, kwafeenụ n’obere ụlọ ebe unu na-agaghị akwụ nnukwu ego
kwa ọnwa. Gbaanụ mbọ ka ụgwọ ọkụ, ụgwọ mmiri, na ụgwọ ndị ọzọ unu na-akwụ belata.● Ihe oriri: Were nri n’ụlọ gaa ọrụ kama ịzụ nri azụ. Na-azụ ihe oriri n’ebe a na-egbu ya ná ntụ. Otu nwaanyị bi na Brazil, onye aha ya bụ Joelma, kwuru, sị: “M na-azụta mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ọnụ ala ma m gaa n’ebe a na-ere ha n’okporo ámá mgbe ahịa mechiwara.”
● Ụgbọala: Reenụ ụgbọala ndị unu na-anaghị agba mgbe niile, na-edozikwanụ ndị nke unu na-agba agba kama ire ha ka unu zụta ndị nke ọgbara ọhụrụ. Jirinụ ụkwụ gaa ebe ụfọdụ unu chọrọ ịga ma ọ bụkwanụ unu abanye ụgbọala ọhaneze.
Ozugbo unu selatara aka n’ego unu na-emefu, ọ ga-adịrị unu mfe iji ego fọọrọ unu na-eme ihe ga-akacha baara unu uru.
4. Chọpụtanụ ego ole unu ji n’ụgwọ na otú unu ga-esi akwụ ya. Ihe mbụ unu kwesịrị ime bụ ịmata ọmụrụ nwa unu ga-akwụ n’ụgwọ nke ọ bụla unu ji nakwa ego ole unu ga-akwụ ma ọ bụrụ na unu akwụchaghị ụgwọ nke ọ bụla ngwa ngwa ma ọ bụ na unu akwụghị ya n’oge unu kwesịrị ịkwụ ya. Leruonụ anya n’ihe e dere n’akwụkwọ unu ji biri ego ndị ahụ n’ihi na ụfọdụ ndị na-ebinye ndị mmadụ ego dị aghụghọ. Dị ka ihe atụ, otu ụlọ ọrụ nke na-ebinye ndị mmadụ ego n’Amerịka kwuru na ọmụrụ nwa ha na-anara ndị ha binyere ego bụ ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ego ha binyere ha. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọmụrụ nwa ha na-anara ndị mmadụ bụ ihe karịrị okpukpu anọ nke ego ha binyere ha.
Ihe ọzọ unu kwesịrị ime bụ ikpebi ụgwọ ndị unu ga-ebu ụzọ akwụ. Ihe unu nwere ike ime bụ ibu ụzọ kwụọ ụgwọ ndị ọmụrụ nwa ha buru oké ibu. Unu nwekwara ike ibu ụzọ kwụọ ụmụ obere ụgwọ ndị unu ji n’ihi na obi ga-esikwu unu ike na unu ga-akwụcha ụgwọ ndị unu ji ma ọ bụrụ na ndị unu ji ụgwọ adịghịzi ọtụtụ. Ọ bụrụ na o nwere ụgwọ unu ji nke unu na-akwụ nnukwu ọmụrụ nwa na ya, unu nwere ike ịga ebe ọzọ unu na-agaghị akwụ ọmụmụ nwa buru ibu gbazite ego ma jiri ya kwụọ ụgwọ ahụ.
Ma, ọ bụrụ na unu enweghị ike ịkwụ ụgwọ unu ji, gakwurunụ ndị unu ji ụgwọ ka unu na ha kwurịta ihe ọzọ unu ga-eme. Unu nwere ike ịgwa ha ka ha nyekwuo unu oge ma ọ bụ ka ha wepụ ego n’ọmụrụ nwa unu na-akwụ. Ụfọdụ ndị binyere unu ego nwedịrị ike iwepụ ego n’ụgwọ unu ji ha ma ọ bụrụ na unu ekweta ịkwụcha ha ego ha chọrọ otu mgbe. Gwanụ ha hoo haa otú ihe si dịrị unu. (Ndị Kọlọsi 4:6; Ndị Hibru 13:18) Deenụ ihe ọ bụla unu kwekọrịtara edee. Ọ bụrụgodị na ha ekwetaghị ihe mbụ unu gwara ha meere unu, obi adala unu mbà. Rịọsikwuonụ ha arịrịọ ike ka unu mara ma ò nwere aka ha ga-enyere unu.—Ilu 6:1-5.
Unu atụla anya na ihe niile unu tinyere ego na ya ga-aga otú unu chọrọ. Nsogbu nwere ike isi n’elu si n’ala mebisịa ahịa unu ma ọ bụ ihe unu tinyere ego unu na ya n’ihi na ọtụtụ mgbe, ego “na-emere onwe ya nku dị ka nke ugo wee fepụ chee ihu n’eluigwe.”—Ilu 23:4, 5.
MEENỤ IHE A: Ozugbo unu kpebiri ihe ndị unu chọrọ iji ego unu eme, kwurịtazienụ otú onye ọ bụla n’ezinụlọ unu ga-esi eselata aka n’ego unu na-emefu nakwa otú unu ga-esi na-akpatakwu
ego. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu ahụ mbọ ibe ya na-agba, ọ ga-eme ka unu jikọta aka na-agbalị ka unu kwụọ ụgwọ unu ji.NSOGBU NKE ATỌ: Obi anaghị ezu anyị ike n’ihi ụgwọ anyị ji.
Mbọ unu na-agba ka unu kwụọ ụgwọ unu ji nwere ike ime ka unu leghara ihe ndị ka mkpa ná ndụ unu anya. Otu nwoke aha ya bụ Georgios kwuru ihe yiri nke ahụ. Ọ sịrị: “Ihe kacha nye anyị nsogbu mgbe anyị ji ụgwọ bụ na ọ dịghị ihe ọzọ anyị na-eche ma ọ bụghị ụgwọ ahụ. O nweghị ihe ọzọ dị anyị mkpa ná ndụ anyị na-echeta.”
Ihe ga-enyere unu aka: Unu ekwela ka ego na-atụrụ unu ụka. N’agbanyeghị mbọ niile unu na-agba, o nwere ike iwe unu ọtụtụ afọ iji kwụchaa ụgwọ unu ji. Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ unu ga-ekpebi ma ùnu ga-ekwe ka ụgwọ ahụ na-echu unu ụra. Kama ichegbu onwe unu, meenụ ihe a Baịbụl kwuru: “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:8.
Ọ bụrụ na ihe unu nwere eju unu afọ, unu ga-enwe ike ‘ịchọpụta ihe ndị ka unu mkpa.’ (Ndị Filipaị 1:10) Ụfọdụ n’ime ‘ihe ndị ka unu mkpa’ bụ ihe unu ga-eme ka unu na Chineke na ndị ezinụlọ unu dịrị ná mma. Georgios, bụ́ onye e kwuburu okwu ya, kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na anyị akwụchabeghị ụgwọ anyị ji, anyị anaghị ekwe ka o mee ka anyị leghara ihe ndị ka mkpa ná ndụ anyị anya. Mụ na nwunye m enwekwuola obi ụtọ ugbu a anyị na-ewepụta oge anyị abụọ ji anọrị na oge anyị na ụmụ anyị ji anọrị ma na-emekọ ihe ndị gbasara ofufe Chineke ọnụ.”
MEENỤ IHE A: Depụtanụ ihe ndị baara unu ezigbo uru bụ́ ndị unu na-enweghị ike iji ego zụta. Unu depụtachaa ha, kwurịtanụ otú unu nwere ike isi na-ewepụtakwu oge maka ihe ndị ahụ unu depụtara.
N’eziokwu, iji ụgwọ na-eme ka obi koro mmadụ n’elu, mmadụ nwekwara ike ịhapụ ihe ụfọdụ dị ya mkpa ka o nwee ike ịkwụ ụgwọ o ji. Ma obi ga-eru onye ahụ ala ma ọ kwụchaa ụgwọ ahụ. Otu nwoke bi na Poland, onye aha ya bụ Andrzej, kwuru, sị: “Mgbe m nụrụ na nwunye m bịanyeere otu nwaanyị ya na ya na-arụkọ ọrụ aka n’akwụkwọ mgbe nwaanyị ahụ chọrọ ịgbazite nnukwu ego nakwa na nwaanyị ahụ eriela mbọmbọ, ebe niile malitere ịgba ghara ghara n’ụlọ anyị.” Ma Andrzej chetara ihe ya na nwunye ya mere n’oge ahụ ma kwuo, sị: “Anyị abụọ bịara dịkwuo ná mma. Ma, ọ bụghị nsogbu ahụ mere anyị ji dịrịkwuo ná mma, kama ọ bụ otú anyị si jikọta aka merie nsogbu ahụ.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 17 Ọ bụrụ na unu chọrọ ịmata ihe ndị ọzọ ga-enyere unu aka, gụọnụ isiokwu ndị bidoro Teta! Jenụwarị–Mach 2012, nke isiokwu ya bụ “Otú Ị Ga-esi Jiri Ego Gị Na-eme Ihe Bara Uru.” Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .
▪ Olee otú m nwere ike isi nyere ezinụlọ m aka ka anyị nwee ike ịkwụ ụgwọ anyị ji?
▪ Gịnị ka anyị ga-eme ka ụgwọ anyị ji ghara ime ka anyị leghara ihe ndị ọzọ dị mkpa ná ndụ anyị anya? Gịnịkwa ka anyị ga-eme ka ọ ghara ime ka anyị see okwu?
[Foto dị na peeji nke 18]
Iji ụgwọ nwere ike ịkpata esemokwu n’ezinụlọ ma ọ bụkwanụ tisaa ezinụlọ
[Foto dị na peeji nke 20]
Chọwanụ otú unu niile nọ n’ezinụlọ ga-esi akwụ ụgwọ unu ji
[Foto dị na peeji nke 21]
Ọ bụrụ na ihe unu nwere eju unu afọ, unu ga-enwe ụdị obi ụtọ ego na-enweghị ike ime ka unu nweta