Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Anaghị Agba Krismas?
Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Anaghị Agba Krismas?
▪ N’ebe niile n’ụwa, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ijeri mmadụ abụọ na-agba Krismas n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba ọ bụla. Ọ dịkarịa ala, narị nde mmadụ abụọ na-echeta ọmụmụ Jizọs Kraịst n’abalị asaa n’ọnwa Jenụwarị ọ bụla. Ma, ọtụtụ nde mmadụ ndị ọzọ anaghị agbatụdị Krismas. Gịnị mere ha anaghị agba ya?
Otu ihe mere ya bụ na okpukpe ha esoghị n’okpukpe ndị sị na ha na-eso ụzọ Kraịst. Ụfọdụ n’ime ha na-ekpe okpukpe ndị Juu, okpukpe Hindu, ma ọ bụ okpukpe Shinto. Ndị ọzọ na-anaghị agba Krismas bụ ndị na-ekweghị na Chineke, ndị na-achọghị ịma ma Chineke ọ̀ dị, na ndị na-enweghị okpukpe ha na-ekpe. Ha chere na akụkọ Krismas bụ akụkọ ifo.
E nwekwara ọtụtụ ndị kweere na Jizọs, ma ha anaghị agba Krismas. Gịnị mere ha anaghị agba ya? O nwere ụzọ ihe anọ ha kwuru kpatara ya.
Nke mbụ bụ na ha ekweghị na a mụrụ Jizọs n’ọnwa Disemba ma ọ bụ n’ọnwa Jenụwarị. Baịbụl ekwughị kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Jizọs. Naanị ihe o kwuru bụ na “e nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa. Ndị ọzụzụ atụrụ a na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị. Na mberede, mmụọ ozi Jehova guzoro ha n’akụkụ, . . . Mmụọ ozi ahụ sịrị ha: ‘. . . A mụụrụ unu Onye Nzọpụta taa, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị.’”—Luk 2:8-11.
E nwere ihe ndị gosiri na ọ bụ n’ihe dị ka ná mbido ọnwa Ọktoba ka a mụrụ Jizọs. N’oge ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ na-akpọrọ atụrụ ha nọbọọ chi n’ọhịa. Ọ bụ n’ọnwa Disemba na ọnwa Jenụwarị ka oyi kacha atụ n’obodo Betlehem nakwa n’obodo ndị gbara ya gburugburu. N’ihi ya, ọ gaghị abụ n’ọnwa Disemba ma ọ bụ Jenụwarị ka a mụrụ Jizọs n’ihi na ndị ọzụzụ atụrụ anaghị akpọpụta atụrụ ha èzí n’ọnwa abụọ ahụ, kama ha na-akpọba ha n’ụlọ ka oyi ghara ịtụgbu ha.
Ihe nke abụọ kpatara ya bụ na naanị ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta bụ ọnwụ ya, ọ gwaghị ha ka ha na-echeta ọmụmụ ya. (Luk 22:19, 20) Ọ bụrụ na ị gụọ akwụkwọ Mak na Jọn, ị ga-achọpụta na ha ekwughị ihe ọ bụla banyere ọmụmụ Jizọs.
Ihe nke atọ kpatara ya bụ na e nweghị ihe ọ bụla gosiri na ndị mbụ soro ụzọ Kraịst mere ememme ncheta ọmụmụ Kraịst. Ma, ha chetara ọnwụ ya. (1 Ndị Kọrịnt 11:23-26) Ọ bụ mgbe a mụcharala Jizọs, ihe karịrị narị afọ atọ agafeekwa, ka ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst malitere ịgba Kristmas n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba. N’ihe dị ka narị afọ atọ na ọkara gara aga, ụlọ nzukọ omeiwu ndị Ingland tiri iwu ka a kwụsị ịgba Krismas. N’Amerịka, otu ụlọikpe dị na Masachusets mekwara otu ihe ahụ. Gịnị mere ha ji tie iwu ka a kwụsị ịgba Krismas? Otu akwụkwọ aha ya bụ The Battle for Christmas kwuru, sị: “Ọ dịghị ebe Baịbụl kwuru na a mụrụ Jizọs n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba, o nweghịkwa ihe gosiri na ọ bụ mgbe ahụ ka a mụrụ ya.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na ndị Puritan * sịrị na “Krismas bụ ememme ndị ọgọ mmụọ nke ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst bịaziri na-eme.”
Ihe nke anọ kpatara ya bụ otú ememme Krimas si malite. Ememme Krismas si n’ememme ndị ọgọ mmụọ ndị Rom na-eme malite. Ndị ọgọ mmụọ ahụ na-emere chi ha bụ́ Satọn na chi ha bụ́ Sol Inviktus ma ọ bụ Mitra ememme iji kwanyere ha ùgwù. Satọn bụ chi ọrụ ubi, ebe Sol Inviktus bụ chi anyanwụ. Ndị ọkachamara abụọ, bụ́ Christian Rätsch na Claudia Müller-Ebeling, dere n’akwụkwọ ha bụ́ Pagan Christmas, sị: “E nwere ọtụtụ ememme na omenala ndị a na-eme tupu oge Ndị Kraịst bụ́ ndị e mechara gbanwee ka ha ghọọ ememme Ndị Kraịst. Otu n’ime ha bụ ememme e ji echeta mgbe anyanwụ laghachiri. A gbanwere ememme a ka ọ bụrụ ememme e ji echeta ọmụmụ Kraịst.”
Ọ̀ bụ na ihe ndị a e kwuru emebeghị ka ị ghọta ihe mere ezigbo Ndị Kraịst anaghị agba Krismas?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Ndị a na-akpọ ndị Puritan bụ ụfọdụ ndị na-ekpe Chọọchị Ingland. Ha chọrọ iwepụcha ozizi ndị Katọlik na chọọchị ha. Ọ bụ n’ihe dị ka narị afọ anọ gara aga ka a malitere ịkpọ ha ndị Puritan.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]
Naanị ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta bụ ọnwụ ya, ọ gwaghị ha ka ha na-echeta ọmụmụ ya