M Mechara Nwere Onwe M
M Mechara Nwere Onwe M
AKỤKỌ MARIA KILIN KỌRỌ
Otu nwoke nke na-elekọta ụlọ mkpọrọ ebe anyị nọ chịrị m ọchị ma gwa m, sị: “O nweghị onye na-ajụ ajụjụ unu. Unu atọla ebe a.” Ebe anyị bụ ndị Rọshịa, o nwekwanụghị ndị anyị na ha na-ese okwu, gịnị mere anyị ji nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ná mba Nọt Koria n’afọ 1950 n’agbanyeghị na Agha Ụwa nke Abụọ ebiela kemgbe ihe dị ka afọ ise?
IHE e dere n’akwụkwọ m ji gosiri na a mụrụ m n’afọ 1924. Ọ bụ n’obodo Shmakovka nke dị ná ngwụcha ngwụcha ebe ọwụwa anyanwụ Rọshịa ka a mụrụ m. Obodo a dị nso n’ókè ndị Rọshịa na Chaịna.
Otu ụbọchị, ndị ohi bịara kpụrụ papa m na ụmụnne m ndị nwoke tọrọ m. Ihe ahụ bụ anya ikpeazụ mama m hụrụ ha. Ọ bụzi naanị ya ka a hapụụrụ ụmụaka juru ụlọ. Ma ọ naghị akpali afọ anyị. Otu onye agbata obi anyị gwara mama m ka ya kpọga anyị n’ebe ndị Chọọchị Ọtọdọks nke Rọshịa na-elekọta ụmụaka na-enweghị nne na nna. O kwuru na ya ga-agwa ndị ahụ na mama m hapụrụ anyị rie mbọ mbọ.
Mama m kwetara ihe ahụ onye agbata obi anyị gwara ya maka na agụụ nwere ike ịgụgbu anyị ma a sị na o meghị otú ahụ. Ugbu a m dị afọ iri asatọ na ise, ana m ekele Chineke na mama m kwetara ka a kpọga anyị n’ebe ahụ a na-elekọta ụmụaka. O nwere ike ịbụ ebe ahụ zọrọ mụ na ụmụnne m ndụ. Ma ọ ka na-ewute m na mama m kwetara ka a kpọga anyị ebe ahụ kama iji aka ya zụọ anyị.
N’afọ 1941, m kwagara mba Koria. M nọ ebe ahụ lụọ otu nwoke Rọshịa aha ya bụ Ivan. Ọ bụ nwoke obiọma. Anyị mụrụ ada anyị aha ya bụ Olya n’afọ 1942 n’obodo Sool, nke dị na Koria. Anyị mụrụ ọkpara anyị aha ya bụ Kolya n’ebe ahụ n’afọ 1945, mụọkwa nwanne ya nwoke aha ya bụ Zhora n’afọ 1948. Di m na-anọ n’ụlọ ahịa anyị ere ahịa, ebe mụnwa na-anọ n’ụlọ akwa ákwà. Mgbe ụmụ anyị na-eto, ha mụtara asụsụ ndị Japan n’ihi na n’oge ahụ, ndị Japan bijuru n’obodo Sool, ọ bụkwa ha na-achị obodo ahụ. Ma n’ụlọ anyị, anyị na-asụ asụsụ Rọshịa. Tupu afọ 1950, e nweghị nsogbu dị n’etiti ndị Rọshịa, ndị Amerịka, na ndị Koria. Ha niile na-abịa n’ụlọ ahịa anyị azụ ahịa.
Otú Ndị Nọt Koria Si Jide Anyị
Ma ihe niile gbanwere na mberede n’afọ 1950. Ndị agha Nọt Koria weghaara obodo Sool. Ha jidere anyị, jidekwa ndị ọzọ si mba ọzọ, ebe ọ bụ na anyị enwelighị ike ịgbapụ. Ha kpọọrọ anyị na ndị ọzọ e ji eji bụ́ ndị Briten, ndị Rọshịa, ndị Amerịka, na ndị French gaa ebe dị iche iche na Nọt Koria. Ọ na-abụ ha kpọga anyị ebe a taa, a nọtụ ha akpọga anyị ebe ọzọ. Ihe a ka ha nọ na-eme anyị ruo afọ atọ na ọkara. Ha na-akpọba anyị n’ebe ọ bụla ha hụrụ ụlọ ka anyị biri ruo mgbe a ga-akpọga anyị ebe ọzọ. Anyị na-emekwa ihe ọ bụla anyị nwere ike ime ka a ghara ịtụta anyị bọmbụ.
O nwere mgbe anyị bi n’ụlọ nwere ekwú. A na-akwanye ọkụ n’ekwú ahụ ka ụlọ kpọrọ ọkụ. A na-enyejukwa anyị afọ n’oge ahụ. Ma ọtụtụ mgbe, anyị na-ebi n’ụlọ a gbahapụrụ agbahapụ, oyi ana-atụgbu anyị, ọ bụkwa naanị ọka milet ka a na-enye anyị. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ anyị na ha so nwụrụ n’ihi na ha anaghị eri ezigbo nri, o nweghịkwa onye na-elekọta ha. Ọ na-ewute m ịhụ ebe ụmụ m na-ata ahụhụ. N’afọ ahụ, oyi malitere ngwa ngwa na Nọt Koria. Echetara m otu ụbọchị m mụ anya chi abọọ. Ihe m nọ na-eme bụ iburu okwute na-etinye n’ọkụ, ha kporo ọkụ, mụ edowe ha n’okpuru ihe ụmụ m dina na ha ka ahụ́ kporo ha ọkụ.
Mgbe oge oyi gafewara, ụfọdụ ndị Koria bi n’ebe ahụ gosiri anyị ahịhịa na osisi ndị dị n’ọhịa a na-eri akwụkwọ ha eri. Anyị na-agakwa n’ọhịa achọ akwụkwọ na mkpụrụ osisi dị iche iche, nakwa ero. O doro anyị anya na ndị obodo ahụ akpọghị anyị asị, kama ha na-emetara anyị ebere n’ihi otú ihe si siere anyị ike. Amụtara m otú e si egbute mbàrá. Anyị na-eri ya eri ebe ọ bụ na nri a na-enye anyị anaghị ezuru anyị. Ụmụ m na-arịọkarị ndị mmadụ mbàrá. Ọ na-ewute m nke ukwuu mgbe ọ bụla ha mere otú ahụ.
N’ọnwa Ọktoba n’afọ ahụ, a manyere anyị niile ka anyị jiri ụkwụ gaa obodo a na-akpọ Manpo. A gwara anyị na a ga-eji trọk ndị ehi na-adọkpụ buru ndị ahụ́ na-adịghị nakwa ụmụaka. Ma, anyị niile agawaghị ebe ahụ otu mgbe. Olya na di m so ná ndị nke mbụ gawaranụ. Mụ na ụmụ m ndị nke obere cheere ruo ọtụtụ ụbọchị ka trọk ndị ahụ rute. Ha mechakwara rute.
A fajuru ndị ahụ́ na-adịghị na trọk ahụ ka hà bụ akpa garị. Onye ọ bụla hụrụ ha ga-emetere ha ebere. Akwọ m Zhora n’azụ. Ma mgbe m chọrọ ikukwasị Kolya na trọk ahụ, o bere ákwá ma sị m: “Mama, Mama, m chọrọ iji ụkwụ soro gị! Biko, ahapụla m!”
Kolya jidesiri uwe m ike, jiri ọsọ na ije na-eso m n’azụ. A gbagburu ọtụtụ n’ime ndị anyị na ha so na njem ahụ. O were anyị ọtụtụ ụbọchị tupu anyị erute Manpo. Udele so anyị n’azụ na-eri ozu ndị nwụrụ n’ụzọ. Anyị mechara rute ebe di m na Olya nọ. Anyị bere ákwá ma makụọ ibe anyị. N’abalị ụbọchị ahụ, m mụ anya na-etinye okwute n’ọkụ. M ji okwute ndị ahụ tinye n’ihe ụmụ m niile ji ehi ụra ka ahụ́ kporo ha ọkụ. Obi dị m ụtọ ugbu a ebe ọ bụ na anyị niile nọzi otu ebe.
N’afọ 1953, mgbe anyị rutere n’ókè ndị Nọt Koria na ndị Saụt Koria, ihe bịara katụrụ anyị mma. A na-enye anyị uwe dị mma, akpụkpọ ụkwụ, achịcha, na swiit. N’oge na-adịghị anya, a hapụrụ ndị Briten e ji anyị na ha, mechaakwa hapụ ndị French. Ma, o nweghị onye tụpụụrụ anyị ọnụ ebe ọ bụ na o nweghị mba weere anyị na anyị bụ ụmụ amaala ya. Mgbe a hapụrụ ndị ikpeazụ e ji anyị na ha, ọ fọdụziri naanị anyị. Anyị bere ákwá ma jụ iri ihe. Ọ bụ
mgbe ahụ ka onye Koria ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ gwara m ihe ahụ m kọrọ ná mbido.Otú Ihe Si Gbanweere Anyị n’Amerịka
Mgbe obere oge gafere, ihe anyị na-atụghị anya ya mere. A kpọfere anyị n’ebe ndị nkịtị bi na Saụt Koria. Ndị agha Amerịka gbara anyị ajụjụ n’ebe ahụ. Ha mechara kweta ka anyị kwaga Amerịka. Anyị ji ụgbọ mmiri si ebe ahụ gaa San Fransisko, nke dị na Kalịfọnịa. Mgbe anyị ruru, otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ndị gbatara ọsọ ndụ nyeere anyị aka. Anyị mechara kwaga Vejinịa. Ndị anyị hụrụ n’ebe ahụ nyeere anyị aka ka anyị chọta ihe anyị ga-emewe. Anyị mechakwara si ebe ahụ kwaga Meriland bụ́ ebe anyị nọ bido ụwa n’isi.
Ọ na-abụ anyị hụ ihe ụfọdụ na-enweghị ihe ha bụ, dị ka ihe ndị Amerịka ji azacha ime ụlọ, ha eju anyị anya. Ebe ọ bụ na anyị ka bịara abịa n’Amerịka, anyị na-arụ ọrụ ọtụtụ awa. Ma o wutere m mgbe m hụrụ otú ndị bi ebe ahụ si emegbu ndị bịara ọhụrụ. Obere oge anyị rutere, otu ụkọchukwu Chọọchị Ọtọdọks nke Rọshịa gwara anyị, sị: “Unu erutela n’ala a gọziri agọzi. Ọ bụrụ na unu chọrọ ka ihe dịrị unu mma, unu na ndị Rọshịa ibe unu akpakwala.” Ihe ahụ o kwuru wụrụ m akpata oyi n’ahụ́. M jụrụ onwe m ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma anyị nyere ibe anyị aka?
N’afọ 1970, otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Bernie Battleman bịara ozi ọma n’ụlọ anyị. Nwoke a anaghị ezo ọnụ, ọ na-ekwu ihe otú ọ dị. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị na ya kwuru okwu ọtụtụ awa. Ebe ọ bụ na m tolitere n’ebe ndị Chọọchị Ọtọdọks na-elekọta ụmụ na-enweghị nne na nna, ebu m ihe niile a na-akụzi na chọọchị ahụ n’isi. Ma o nweghị mgbe ọ batara m n’obi na m kwesịkwaranụ inwe Baịbụl nke m. Bernie mechara wetara anyị otu Baịbụl ma kwuo, sị: “M wetaara unu Baịbụl a maka na m hụrụ unu n’anya.” O gosikwara anyị otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Ben. Ben bụ onye Belarus, ma ọ na-asụ asụsụ Rọshịa.
Ben na nwunye ya bịara n’ụlọ anyị ma jiri Baịbụl zaa m ajụjụ niile m jụrụ ha. N’obi m, echere m na Ndịàmà Jehova na-asụgharị Baịbụl isi. Otu ihe kacha wee m iwe bụ na akwụkwọ ha kwuru na Meri mụrụ ụmụ ọzọ mgbe ọ mụchara Jizọs. Ma, a kụziiri anyị na chọọchị na Meri amụghị nwa ọzọ.
Ihe m meziri bụ na m kpọrọ otu enyi m bụ́ onye Poland ma gwa ya ka o jiri Baịbụl ya e dere n’asụsụ ndị Poland gụọrọ m ihe e kwuru na Matiu 13:55, 56. Mgbe ọ gụụrụ m ebe ahụ, o juru m anya ịnụ na ọ bụ eziokwu na Jizọs nwere ụmụnne ndị obere. Enyi m ahụ kpọkwara otu onye ọ ma na-arụ ọrụ n’otu ọ́bá akwụkwọ dị na Wọshịntịn Diisi ka ọ gụọ amaokwu ndị ahụ na Baịbụl niile dị n’ọ́bá akwụkwọ ahụ. Onye ahụ kwuru na Baịbụl niile dị n’ebe ahụ kwuru na Jizọs nwere ụmụnne ndị nwoke na ụmụnne ndị nwaanyị.
O nwekwara ajụjụ ndị ọzọ m jụrụ Ben na nwunye ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ, Gịnị mere ụmụaka ji anwụ anwụ? Gịnị mere mba dị iche ji alụrịta agha? Gịnị mere ndị mmadụ na ibe ha anaghị adị n’otu, ma ndị na-asụ otu asụsụ? Otú ha si jiri Baịbụl zaa m ajụjụ ndị ahụ tọrọ m ụtọ. Amụtara m na ahụhụ ndị mmadụ na-ata esighị Chineke n’aka. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m mụtara na m ka ga-ahụ ndị m hụrụ n’anya agha dị iche iche a lụrụla n’ụwa tara isi ha. M ji nwayọọ nwayọọ mata Jehova nke ọma.
Otu ụbọchị, m guzo n’ihu ihe oyiyi m na-arịọ Chineke ka o nyere nwa m nwoke aka. N’oge ahụ, nwa m nwoke ahụ ka si agha Vietnam lọta, obi dakwara ya mbà n’ihi ihe ndị ọ hụrụ n’agha ahụ. Ka m nọ na-ekpe ekpere ahụ, m ghọtara ozugbo na ọ bụghị ihe oyiyi ka m kwesịrị ikpegara ekpere, kama ọ bụ Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ. M dọbiri ihe oyiyi ahụ ma chọpụta na ihe e ji rụọ ya bụ ígwè nkịtị dị fere fere nke na-egbuke egbuke. M zụtara ha na chọọchị anyị. Ma n’abalị ahụ, m tụfuru ha.
Ọ dịrịghị m mfe ịhapụ chọọchị ahụ m na-aga kemgbe a mụrụ m. Ma ihe dị m mkpa ugbu a karịa ihe ọ bụla ọzọ bụ ihe m mụtara na Baịbụl. Mgbe otu afọ ọzọ gafere, mụ na nwa m nwaanyị na di m gara ịhụ ụkọchukwu Chọọchị Ọtọdọks ahụ. Mgbe anyị na-aga, eji m akwụkwọ ebe m dere ajụjụ na amaokwu Baịbụl ụfọdụ. Mgbe m na-agụpụta amaokwu Baịbụl ndị ahụ, ụkọchukwu ahụ fufere isi ma kwuo, sị, “I fuola.” Ọ gwara anyị abịakwala na nke ya ọzọ.
Ihe ahụ o mere metụrụ Olya n’ahụ́. Olya maliteziri ịmụchi Baịbụl anya. N’oge na-adịghị anya, o sowere m na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. N’afọ 1972, e mere m baptizim, e meekwa yanwa n’afọ sochiri ya.
Ihe Anyị Na-ekwukarị n’Ezinụlọ Anyị
Ihe anyị na-ekwukarị n’ezinụlọ anyị bụ, Nke gara aga agaala, lekwasị anya na nke i ji n’aka ugbu a. Ọ bụ ya mere na ọ naghị esiri anyị ike ime ihe anyị na-emetụbeghị ma ọ bụrụ na o doo anyị anya na ihe ahụ dị mma. Mgbe mụ na Olya na Chineke malitere ịdị ná mma, ọ gụsiwere anyị agụụ ike ịga n’ụlọ ndị mmadụ kọọrọ ha ihe anyị na-amụta na Baịbụl. Ma n’eziokwu, ọ dịrịghị m mfe ná mmalite maka na anaghị m ezo ọnụ ekwu okwu. N’oge ụfọdụ, anaghị m edozi ọnụ agwa ndị mmadụ okwu ma m ziwe ha ozi ọma, onye mụ na ya so na-ejizi olu ọma kwuzie ihe ndị m na-ekwuteghị. Ma m mechara mụta iji olu ọma agwa ndị ọ dị ka ọ dị m okwu bụ́ ndị si ebe dị iche iche bịa n’Amerịka, ma ndị ukwu ma ndị nta.
N’ime afọ ndị sochirinụ, mụ na nwa m nwaanyị na-ekwukarị na mgbe ọ bụla ọchịchị Sọviet Yuniọn dara, anyị ga-aga Rọshịa nyere ndị mmadụ aka ka ha mụta banyere Chineke. Mgbe ọchịchị ahụ dara n’afọ 1991, Olya mere ihe ahụ anyị abụọ chọrọ ime. Ọ gara Rọshịa kwusaa ozi ọma oge niile afọ iri na anọ. Ọ kụziiri ọtụtụ ndị Baịbụl, o sokwa sụgharịa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Rọshịa n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Rọshịa.
Ugbu a, ọrịa anazighị ekwe m bilie ọtọ gaa ebe ọzọ. Ma, ụmụ m na-emere m ihe niile ha nwere ike ime ka ihe dịtụrụ m mfe. Ana m ekele Chineke na o mere ka ihe katụrụ m mma n’agbanyeghị ahụhụ m tara ná mmalite. Ihe ahụ Devid dere n’Abụ Ọma emezuola n’isi m. O dere, sị: ‘Chineke na-edu m n’ebe izu ike nke mmiri jupụtara. Ọ na-eme ka mkpụrụ obi m nwetaghachi ume. Ọ na-edu m n’ụzọ ezi omume n’ihi aha ya.’—Abụ Ọma 23:2, 3. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 29 Maria Kilin nwụrụ tupu e bipụta akụkọ a ọ kọrọ. Ọ nwụrụ n’abalị mbụ n’ọnwa Mach n’afọ 2010.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 13]
AKỤKỌ NA-EMETỤ N’AHỤ́
Ná ngwụcha afọ 1954, Maria Kilin dere ihe ndị mere ya mgbe ya na ezinụlọ ya bi na Nọt Koria. Akụkọ ọ kọrọ na-emetụ n’ahụ́. Otu onye Rọshịa nke na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-anọchị anya Ọstrelịa ná mba Amerịka sụgharịrị akụkọ ahụ n’asụsụ Bekee. Mgbe ọ sụgharịchara ya, o resịrị ya otu ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ n’Amerịka. Ụlọ ọrụ ahụ kebiri akụkọ ahụ ụzọ iri na abụọ ma bipụta ha otu otu n’akwụkwọ akụkọ ha. Ha malitere ibipụta ha n’abalị iri na isii n’ọnwa Jenụwarị ruo n’abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa ahụ n’afọ 1955.
Okwu e ji malite nkebi nke mbụ n’akụkọ ahụ bụ: “Ebe ọ bụ na abụghị m onye na-ede akwụkwọ, o nwere ike agaghị m edetacha akụkọ ihe mere m otú dị mma. Ma m ga-edeli ihe niile otú ha si mee.” Maria mere otú ahụ. Isiokwu a kọtụrụ ihe ndị mere Maria mgbe ya na ezinụlọ ya nọ na Nọt Koria nakwa otú ihe si gbanweere ha afọ ole na ole ha kwagachara Amerịka.
[Foto]
Akụkọ ahụ m ji aka m dee na nkebi nke mbụ ya e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ
[Foto dị na peeji nke 13]
Obodo Shmakovka, nke dị na Primoski Kre, ná ngwụcha ngwụcha ebe ọwụwa anyanwụ Rọshịa—ọ bụ n’ebe a ka a mụrụ m
[Foto dị na peeji nke 14]
Mgbe mụ na di m lụrụ n’afọ 1941
[Foto dị na peeji nke 14]
Ebe mụ na di m na ụmụ anyị abụọ nọ n’afọ 1954
[Ebe E Si Nweta Foto]
U.S. Army photo
[Foto dị na peeji nke 15]
Ebe m nọ n’ubi dị n’ụlọ anyị n’obodo Meriland, n’Amerịka, n’ihe dị ka afọ 1990
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 12]
U.S. Army photo