Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BỊARUO CHINEKE NSO

“I Kpugheworo Ha Ụmụ Ọhụrụ”

“I Kpugheworo Ha Ụmụ Ọhụrụ”

Ị̀ chọrọ ịmata eziokwu banyere Chineke, ya bụ, onye ọ bụ, ihe ndị ọ hụrụ n’anya na ihe ndị ọ kpọrọ asị, nakwa ihe bụ́ uche ya? Jehova Chineke si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl gwa anyị eziokwu banyere onwe ya. Ma ọ bụghị onye ọ bụla bulitere Baịbụl gụọ ga-aghọta eziokwu ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ịghọta eziokwu ahụ bụ ihe ùgwù, ọ bụghị onye ọ bụla ga-aghọta ya. Ka anyị tụlee ihe Jizọs kwuru gbasara ndị ga-aghọta eziokwu ahụ na ndị na-agaghị aghọta ya.—Gụọ Matiu 11:25.

Okwu ndị bidoro amaokwu ahụ bụ: “N’oge ahụ, Jizọs kwuru, sị.” Nke a na-egosi na e nwere ihe mere tupu Jizọs ekwuo ihe o kwuru n’amaokwu ahụ. Jizọs ka bachaara ndị bi n’obodo atọ dị na Galili mba n’ihi na ha jụrụ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya n’agbanyeghị ọrụ ebube ndị ọ rụrụ n’obodo ha. (Matiu 11:20-24) O nwere ike iju gị anya otú mmadụ ga-esi hụchaa ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ ma ghara ikwere eziokwu ọ kụziri ma ghọọ onye na-eso ụzọ ya. Ihe mere ndị ahụ ji jụ ikwere ọrụ niile ahụ Jizọs rụrụ bụ na obi kpọrọ ha nkụ.—Matiu 13:10-15.

Jizọs ma na e nwere ihe abụọ ga-eme ka anyị ghọta eziokwu banyere Chineke. Nke mbụ bụ enyemaka Chineke, nke abụọ abụrụ anyịnwa inwe ezi obi. Jizọs kwuru, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a, i kpughewokwara ha ụmụ ọhụrụ.” Ị̀ hụla ihe mere e ji sị na ịghọta eziokwu banyere Chineke bụ ihe ùgwù? Ebe Jehova bụ “Onyenwe eluigwe na ụwa,” o nwere ikike ikpebi na ya ga-eme ka ụfọdụ ndị mata eziokwu banyere onwe ya ma kpebie na ndị ọzọ agaghị amata ya. Ma, onye ọ bụla chọrọ ịmata eziokwu banyere Chineke nwere ike ịmata ya n’ihi na Chineke anaghị akpa ókè. Ebe ọ dị otú ahụ, gịnị mere Chineke ji eme ka ụfọdụ ndị mata eziokwu banyere onwe ya, ma zonahụ ya ndị ọzọ?

Ọ bụ ndị dị umeala n’obi ka Jehova na-eme ka ha mata ya, ọ naghị eme ka ndị mpako mata ya. (Jems 4:6) Jehova na-ezonahụ “ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi” eziokwu banyere onwe ya. Ndị a bụ ndị e weere n’ụwa na ha ma ihe ma gụọ oké akwụkwọ. Jehova na-ezonahụ ha eziokwu banyere onwe ya n’ihi na ha bụ ndị mpako na ndị onwe ha juru afọ, ha achọkwanụghị ka Jehova nyere ha aka. (1 Ndị Kọrịnt 1:19-21) Ma, Jehova na-ekpughere “ụmụ ọhụrụ” eziokwu ahụ. Ndị a bụ ndị ji obi ha niile bịakwute ya ma dịrị umeala n’obi ka nwatakịrị. (Matiu 18:1-4; 1 Ndị Kọrịnt 1:26-28) Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, hụrụ ụdị ndị abụọ a. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe ndị dị mpako aghọtaghị ihe Jizọs kụziri, ma ndị ọ́kụ̀ azụ̀ bụ́ ndị dị umeala n’obi ghọtara ya. (Matiu 4:18-22; 23:1-5; Ọrụ Ndịozi 4:13) Ma n’oge ahụ, ụfọdụ ndị ọgaranya na ndị gụrụ oké akwụkwọ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ihi na ha gosiri na ha dị nnọọ umeala n’obi.Luk 19:1, 2, 8; Ọrụ 22:1-3.

Ka anyị laghachikwa n’ajụjụ ahụ a jụrụ ná mmalite isiokwu a. Ajụjụ ahụ bụ: Ị̀ chọrọ ịmata eziokwu banyere Chineke? Ọ bụrụ na ị chọrọ, obi ga-adị gị ụtọ ịmata na ọ bụghị ndị oké amamihe ka Chineke na-eme ka ha mata onye ọ bụ, kama ọ bụ ndị ndị oké amamihe ahụ na-eleda anya ka Chineke na-eme ka ha mata onye ọ bụ. Ọ bụrụ na i jiri obi umeala mụọ Baịbụl, i nwere ike iso ná ndị Jehova na-eme ka ha ghọta eziokwu banyere ya. Eziokwu banyere Chineke bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụrụ na ị mata eziokwu banyere Chineke, ọ ga-eme ka ndụ gị nwee isi ugbu a, ọ ga-emekwa ka i nweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ya bụ, ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke kwere ná nkwa na ọ ga-eweta n’oge na-adịghị anya. *1 Timoti 6:12, 19; 2 Pita 3:13.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Jenụwarị:

Matiu 1-21

^ para. 7 Obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ka ị mụta eziokwu banyere Chineke na ihe ndị o bu n’obi ime. Ha na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ụlọ ha n’anaghị ha ego ọ bụla. Akwụkwọ ha na-ejikarị akụziri ndị mmadụ Baịbụl bụ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?