Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị

Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị

E bidoro ibipụta magazin a ị na-agụ ugbu a n’ọnwa Julaị nke afọ 1879. Ọtụtụ ihe agbanweela kemgbe ahụ, otú ahụ ka ọ dịkwa Ụlọ Nche a. (Lee foto ndị dị n’elu.) Malite n’Ụlọ Nche a ị na-agụ ugbu a, ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ anyị gbanwere n’otú Ụlọ Nche na-adịbu. Olee ihe ndị anyị gbanwere?

N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ọtụtụ ndị na-agazi n’Ịntanet agụ ihe ọ bụla ha chọrọ ịgụ. Ha pịhaala aka na maụs kọmputa ha, ha ahụ ihe ha chọrọ ịgụ bụ́ ndị dị naanị n’Ịntanet. E nwere ọtụtụ akwụkwọ na magazin ndị mmadụ nwere ike ịgụ n’Ịntanet.

Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-agazi n’Ịntanet agụ akwụkwọ ugbu a, anyị agbanweela otú ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.pr418.com na-adịbu. Anyị emeela ka ọ matụkwuo mma, meekwa ka ọ dịkwuoro ndị mmadụ mfe ịnọ na ya chọta ihe ha na-achọ. Ndị gara na ya nwere ike ịgụ akwụkwọ anyị n’ihe karịrị narị asụsụ anọ na iri atọ. Ma, malite n’ọnwa Jenụwarị 2013, ndị na-aga na www.pr418.com nwekwara ike ịnọ ebe ahụ gụọ isiokwu ụfọdụ ndị na-agbabu n’Ụlọ Nche. Isiokwu ndị ahụ ga na-agbazi naanị n’Ịntanet. *

Ebe ọ bụ na ọtụtụ isiokwu ndị na-agbabu n’Ụlọ Nche a anyị na-ebipụtara ọhaneze ga na-agbazi naanị n’Ịntanet malite n’Ụlọ Nche nke a gawa, Ụlọ Nche a ga na-adị naanị peeji iri na isii, ọ bụzighị peeji iri atọ na abụọ. A na-ebipụta Ụlọ Nche a na narị asụsụ abụọ na anọ. Ebe ọ bụ na ọ ga na-adịzi peeji iri na isii, ọ ga-adị mfe ugbu a ịsụgharịkwu ya n’asụsụ ndị ọzọ.

Anyị na-atụ anya na ihe ndị a anyị gbanwere ga-eme ka anyị kwusakwuoro ọtụtụ ndị ozi ọma, bụ́ nke ga-eme ka a zọpụta ndị mmadụ. Anyị kpebisiri ike na anyị ka ga na-ebipụta isiokwu ndị ga na-amasị gị ma na-abara gị ezigbo uru. Anyị ga na-ebipụta ha n’akwụkwọ, ha ga na-agbakwa n’Ịntanet. Nke a ga-abara ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị uru, bụ́ ndị na-akwanyere Baịbụl ùgwù ma chọọ ịmata ihe Baịbụl na-akụzi.

Ndị Bipụtara Ụlọ Nche A

^ para. 5 Isiokwu ga na-agbazi naanị n’Ịntanet bụ: “Maka Ndị Na-eto Eto.” Isiokwu a ga-enyere ndị na-eto eto aka ịna-amụ Baịbụl. Isiokwu ọzọ ga na-agbakwa naanị n’Ịntanet bụ: “Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl.” E wepụtara isiokwu a ka ndị nne na nna were ya na-akụziri ụmụ ha ndị dị afọ atọ gbadawa ihe.