Olee Akwụkwọ Bụ́ “Oziọma Judas”?
N’ỌNWA Eprel afọ 2006, otu akụkọ juru ndị mmadụ anya gbara n’ọtụtụ akwụkwọ akụkọ n’ụwa niile. Akwụkwọ akụkọ ndị ahụ kwuru na ndị ọkà mmụta na-ewepụtara ọhaneze ihe e dere n’akwụkwọ mgbe ochie a chọtara n’oge na-adịbeghị anya. A kpọrọ akwụkwọ ahụ “Oziọma Judas.” Akwụkwọ akụkọ ndị ahụ sịrị na ndị ọkà mmụta kwuru na ihe e dere n’akwụkwọ ahụ ga-agbanwe otú anyị si were Judas Iskarịọt. Ndị ọkà mmụta ahụ kwuru na Judas bụ dike, bụrụkwa onyeozi kacha ghọta Jizọs nke ọma. Ha kwukwara na ọ raara Jizọs nye maka na Jizọs gwara ya ka o mee otú ahụ.
Ihe ndị e dere n’akwụkwọ ahụ hà bụ eziokwu? Ọ bụrụ na ha bụ eziokwu, hà na-akọwara anyị ihe ụfọdụ banyere Judas Iskarịọt, Jizọs Kraịst ma ọ bụ ndị mbụ soro ụzọ Kraịst, bụ́ ndị a na-achọbughị ka anyị mata? Ihe ndị e dere n’akwụkwọ ahụ hà kwesịrị ịgbanwe ihe ndị anyị kweere banyere Jizọs Kraịst nakwa ihe ndị ọ kụziiri anyị?
OTÚ E SI CHỌTA AKWỤKWỌ “OZIỌMA JUDAS”
Otú e si chọta akwụkwọ ahụ a kpọrọ “Oziọma Judas” edochaghị anya. Ọ bụghị ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọtara ya. Naanị ihe anyị ma bụ na a hụrụ ya n’ebe a na-ere ihe ndị mgbe ochie mgbe afọ 1978 gafechara. Ọ ga-abụ na a hụrụ ya n’otu ili dị n’Ijipt n’afọ 1978. Ọ ga-abụkwa na ili a dị n’ọgba. “Oziọma Judas” so n’ụzọ akwụkwọ anọ dị n’otu akwụkwọ mgbe ochie. E dere akwụkwọ a n’asụsụ a na-asụ n’Ijipt n’oge ochie.
Akwụkwọ ahụ nọrọ ọtụtụ narị afọ n’ebe e debere ya n’Ijipt. Ma mgbe e wegara ya ebe ọzọ, ọ malitere imebi n’ike n’ike n’ihi na ọ bụ akpụkpọ anụ ka e ji mee ya. E gositụrụ ndị ọkà mmụta ole na ole akwụkwọ ahụ n’afọ 1983. Ma o nweghị onye zụrụ akwụkwọ ahụ n’ihi na ego a kpọrọ aha na a ga-ere ya karịrị akarị. Ebe ọ bụ na e dosaghị ya n’ebe dị mma ruo ọtụtụ afọ, o mebikwuru. N’afọ 2000, otu nwaanyị Swizaland zụrụ akwụkwọ ahụ. O mechara nyefee ya ndị ọkà mmụta ole na ole si mba dị iche iche. A gwara ndị ọkà mmụta ahụ ka ha mezie ebe ndị mebiri emebi n’akwụkwọ ahụ ma depụtaghachi ihe e dere na ya ka o kwe ọgụgụ. Ọ bụkwa ha ga-achọpụta afọ ole akwụkwọ ahụ nọrọla, sụgharịa ya ma kọwaa ihe ndị e dere na ya. Ọrụ a e nyere ha adịghị mfe.
Nchọpụta ha mere gosiri na ọ ga-abụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa ma ọ bụ otu puku afọ na narị afọ isii gara aga ka e dere akwụkwọ ahụ n’asụsụ ndị Ijipt. Ma, ndị ọkà mmụta ahụ chere na e bu ụzọ dee “Oziọma Judas” n’asụsụ Grik, mechazie sụgharịa ya n’asụsụ ndị Ijipt ahụ. Ha chekwara na ọ karịala otu puku afọ na narị afọ asaa e dere ya n’asụsụ Grik. Ma oleekwanụ mgbe e dere “Oziọma Judas” ahụ n’asụsụ Grik, oleekwa ndị dere ya?
E DERE “OZIỌMA JUDAS” N’OGE NDỊ NỌSTIK
Ebe mbụ a kpọrọ “Oziọma Judas” aha bụ n’akwụkwọ Aịreniọs dere. Aịreniọs bụ nwoke na-ede akwụkwọ nke sịrị na ya bụ Onye Kraịst. Ọ dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asatọ gara aga. N’otu akwụkwọ Aịreniọs dere, o kwuru banyere òtù dị iche iche na-akụzi ihe ndị yanwa na-ekwetaghị. O kwuru, sị: “Ha na-ekwu na ihe niile a doro Judas anya nakwa na ọ bụ naanị ya ma eziokwu karịa ndị ọzọ, ọ bụ ya mere o ji rara Jizọs nye. Ha na-ekwukwa na ọ bụ Judas mere e ji nwee ọgba aghara ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ọ bụ ụdị akụkọ a na-enweghị isi na ọdụ ka ha dere n’akwụkwọ ma kpọọ ya Oziọma Judas.”
‘E deghị akwụkwọ a n’oge Judas nọ ndụ, ọ bụkwanụghị onye ma Judas dere ya’
Aịreniọs fooro ntutu taa na ya ga-eme ka ndị mmadụ mata na ihe dị iche iche ndị Nọstik na-akụzi abụghị eziokwu. Ndị Nọstik sịrị na ha bụ Ndị Kraịst. Ha kwukwara na e nwere ihe ha ma ndị ọzọ na-amaghị. E nwere òtù dị iche iche kpọrọ onwe ha ndị Nọstik, òtù nke ọ bụla n’ime ha na-akọwa Okwu Chineke otú o si masị ya. Ndị Nọstik dere ọtụtụ akwụkwọ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asatọ gara aga. Ha si n’akwụkwọ ndị ahụ eme ka ndị mmadụ mata ihe ndị ha na-akụzi.
Ọtụtụ akwụkwọ ndị Nọstik dere kwuru na ndịozi Jizọs a ma ama aghọtaghị ihe Jizọs kụziiri ha nakwa na e nwere ihe nzuzo Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya nke naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ghọtara. * Ụfọdụ ndị Nọstik ahụ kweere na ụwa anyị a bụ ụlọ mkpọrọ. Ọ bụ ya mere ha ji ekwu na “chi nke kere ihe dị iche iche,” bụ́ nke e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ obere chi nke dị iche na chi ndị ọzọ ha kweere na ha. Ha kweere na onye nwere ezi “amamihe” ga-aghọta “ihe nzuzo” a, ọ ga na-achọkwa ka ọ nwụọ hapụ ụwa a.
Ọ bụ ụdị ihe a ka e dere n’akwụkwọ ahụ a kpọrọ “Oziọma Judas.” Ihe e dere ná mmalite ya sịrị: “Ihe nzuzo Jizọs gwara Judas Iskarịọt mgbe ya na ya kparịtara ụka abalị asatọ. Ha kparịtachara ụka ahụ mgbe ọ fọrọ abalị atọ ka Jizọs mee ememme Ngabiga.”
Ọ̀ ga-abụ Oziọma Judas a, bụ́ nke e chere na o furu kemgbe ọtụtụ narị afọ, ka Aịreniọs kwuru banyere ya n’akwụkwọ ahụ o dere? Marvin Meyer, bụ́ onye so ná ndị ọkà mmụta mbụ ahụ a gwara ka ha sụgharịa akwụkwọ ahụ a chọtara, kwuru na “ihe e dere n’akwụkwọ ahụ a kpọrọ Oziọma Judas gosiri na ọ bụ ya ka Aịreniọs kwuru okwu ya n’akwụkwọ ya.”
IHE NDỊ A KỌRỌ BANYERE JUDAS N’AKWỤKWỌ AHỤ AMASỊCHAGHỊ NDỊ ỌKÀ MMỤTA
E dere ‘n’Oziọma Judas’ na Jizọs na-achị ndị na-eso ụzọ ya ọchị mgbe ha na-aghọtachaghị ihe ọ gwara ha, deekwa na n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, ọ bụ naanị Judas ghọtara onye Jizọs bụ nke ọma. Ọ bụ ya mere Jizọs ji agwa naanị ya “ihe ndị dị omimi gbasara alaeze Chineke.”
Ndị ọkà mmụta mbụ ndị sụgharịrị “Oziọma Judas” ahụ kwetara ihe Aịreniọs kwuru banyere akwụkwọ ahụ. Ọ bụkwa ihe Aịreniọs kwuru mere ha ji sụgharịa ihe ụfọdụ otú ha si sụgharịa ha. Mgbe ha na-asụgharị akwụkwọ ahụ, ha kwuru na Jizọs weere Judas ka naanị onye ga-aghọta ihe ndị dị omimi nakwa onye “ga-aba” “n’alaeze” ahụ. Ha kwukwara na n’agbanyeghị na ndịozi Jizọs ga-ahọpụta onye ga-anọchi Judas, Judas ga-aghọ “mmụọ nke iri na atọ,” a ga-agọzikwa ya karịa ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ n’ihi na ọ bụ Judas mere ka Jizọs nwụọ ma hapụ ụwa.
E nwere ndị ọkachamara abụọ aha ha bụ Bart Ehrman na Elaine Pagels bụ́ ndị ọkà mmụta n’okwu gbasara Ndị Kraịst oge mbụ nakwa gbasara okpukpe ndị Nọstik. Ha bipụtara akwụkwọ nke ha ozugbo iji kọwaa ihe ha chọpụtara gbasara “Oziọma Judas.” Ihe ha dere n’akwụkwọ ha yiri ihe ndị ọkà mmụta mbụ sụgharịrị “Oziọma Judas” dere. Ma, obere oge ndị ọkà mmụta a bipụtachara akwụkwọ ha ahụ, ndị ọkà mmụta ndị ọzọ, ndị dị ka April DeConick na Birger Pearson, kwuru ihe na-enye ha nsogbu n’obi banyere otú e si sụgharịa “Oziọma Judas.” Ha kwuru na e bipụtara akwụkwọ ahụ ọkụ ọkụ ka ọ gbaa n’akwụkwọ akụkọ. Ha kwukwara na mgbe a sụgharịchara “Oziọma Judas,” a kpọtaghị ndị ọzọ ka ha gụgharịa ya ka e nwee ike ịmata ma à sụgharịrị ya nke ọma tupu e wepụta ya.
DeConick na Pearson leruru akwụkwọ ahụ anya n’otu n’otu ma chọpụta na e nwere ebe ụfọdụ ndị ọkà mmụta mbụ sụgharịrị akwụkwọ ahụ na-asụgharịtaghị. Mgbe DeConick sụgharịrị ihe e dere n’akwụkwọ ahụ, o kwuru na Jizọs kpọrọ Judas “Mmụọ Ọjọọ nke Iri na Atọ,” ọ bụghị “mmụọ nke iri na atọ.” * O kwukwara na Jizọs gwara Judas hoo haa na ọ gaghị abanye “n’alaeze” Chineke. O kwuru na a gaghị agọzi Judas karịa ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ, kama nke ahụ, a ga-ata ya ezigbo ahụhụ maka na o gburu Jizọs. DeConick chere na ndị Nọstik e nwere n’oge ochie bụ́ ndị dere “Oziọma Judas” ji ya na-akwa ndịozi Jizọs emo. Ihe DeConick na Pearson chọpụtara bụ na Judas abụghị dike otú ahụ e kwuru na ọ bụ ‘n’Oziọma Judas.’
GỊNỊ KA ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA ‘N’OZIỌMA JUDAS’?
N’ime ndị ọkà mmụta niile ahụ lebara anya n’akwụkwọ ahụ a kpọrọ Oziọma Judas, o nweghị nke kwetara na ihe e dere na ya mere eme, ma ndị nke kwuru na Judas bụ dike ma ndị nke kwuru na ọ bụ mmụọ ọjọọ. Otu ọkà mmụta aha ya bụ Bart Ehrman kwuru, sị: “Ọ bụghị Judas dere akwụkwọ a, akwụkwọ a ekwukwanụghị na ọ bụ Judas dere ya. . . . E deghị ya n’oge Judas nọ ndụ, ọ bụkwanụghị onye ma Judas dere ya . . . Ebe ọ dị otú ahụ, e kwesịghị iwere akwụkwọ a ka akwụkwọ na-akọwakwuru anyị ihe ndị mere n’oge Jizọs dị ndụ n’ụwa.”
Ọ bụ ndị Nọstik dere “Oziọma Judas.” E deburu ya n’asụsụ Grik n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asatọ gara aga. O dobeghị ndị ọkà mmụta anya ma “Oziọma Judas” ahụ a chọtara ọhụrụ ọ̀ bụ ya ka Aịreniọs kwuru okwu ya n’akwụkwọ ahụ o dere. Ma o nwere ihe dị mkpa “Oziọma Judas” na-eme ka anyị mata. Ọ na-eme ka anyị mata na e nwere mgbe Ndị Kraịst ụgha malitere izi ozizi nke ha. Nke a mere ka ha kewasịa ghọọ òtù dị iche iche. N’eziokwu, ihe e dere ‘n’Oziọma Judas’ anaghị egosi na ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ abụghị eziokwu, kama nke ahụ, ọ na-egosi na ihe Pọl onyeozi kwuru n’Ọrụ Ndịozi 20:29, 30 mechara mezuo. Ebe ahụ sịrị: “Amaara m na mgbe m pụsịrị, . . . ndị ikom ga-esikwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.”
^ para. 11 Ọ na-abụkarị ndị ndị Nọstik chere ghọtara ihe Jizọs kụziri ka ha na-eji aha ha agụ akwụkwọ ndị ahụ ha dere. Dị ka ihe atụ, e nwere nke ha kpọrọ “Oziọma Tọmọs” na nke ha kpọrọ “Oziọma Meri Magdalin.” E nwere ihe dị ka akwụkwọ iri atọ dị otú ahụ a hụrụla bụ́ ndị e dere n’oge ochie.
^ para. 18 E nwere ndị ọkà mmụta ndị kwetara na ihe a kpọrọ Judas n’Oziọma Judas bụ mmụọ ọjọọ, ya bụ, na Judas maara Jizọs nke ọma karịa ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ. Ihe mere ha ji kweta bụ n’ihi ihe Baịbụl kwuru banyere ndị mmụọ ọjọọ. Ha sịrị na Baịbụl kwuru na ndị mmụọ ọjọọ maara Jizọs nke ọma.—Mak 3:11; 5:7.
N’ime ndị ọkà mmụta niile ahụ lebara anya n’akwụkwọ a, o nweghị onye nke kwetara na ihe e dere na ya mere eme