Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú ndị Juu oge ochie si akwadebe ozu tupu ha elie ya?

Ndị Juu na-eli ozu ngwa ngwa. Ọ na-abụkarị n’ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ha na-eli ya. E nwere ihe abụọ mere ha ji eme otú ahụ. Nke mbụ bụ na ozu na-amalite irekasị ngwa ngwa n’ihi na ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu na-ekpokarị ọkụ. Nke abụọ bụ na ndị oge ahụ na-eche na ọ bụrụ na a hapụ ozu n’elighị ya ruo ọtụtụ ụbọchị, ọ ga-egosi na e jighị onye ahụ nwụrụ anwụ kpọrọ ihe, ọ ga-abụkwara ndị ezinụlọ ya ihe ihere.

Akwụkwọ Matiu na Ọrụ Ndịozi kọrọ banyere mmadụ anọ e liri n’ụbọchị ha nwụrụ. (Matiu 27:57-60; Ọrụ Ndịozi 5:5-10; 7:60–8:2) Ọtụtụ narị afọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, nwunye Jekọb bụ́ Rechel nwụrụ mgbe Jekọb na ezinụlọ ya na-eme njem. Ma e burughị ozu Rechel laghachi n’ebe ezinụlọ Jekọb na-eli ozu. Kama nke ahụ, Jekọb liri ya ‘n’ụzọ gara Betlehem.’—Jenesis 35:19, 20, 27-29.

Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri na ndị Juu na-akwadebe ozu nke ọma tupu ha elie ya. Ndị ikwu na ibe onye ahụ nwụrụ anwụ na-asa ya ahụ́, tee ya ihe na-esi ísì ụtọ na ezigbo mmanụ ma were ákwà fụọ ya. (Jọn 19:39, 40; Ọrụ Ndịozi 9:36-41) Ndị agbata obi na-aga na nke ndị mmadụ nwụnahụrụ ma soro ha ruo uju, kasiekwa ha obi.—Mak 5:38, 39.

È liri Jizọs otú ndị Juu si eli ozu?

Ọtụtu ndị Juu na-elikarị ndị ezinụlọ ha nwụrụ anwụ n’ọgba ma ọ bụ n’ili ha gwuru na nkume na-esichaghị ike. Ụdị nkume ahụ juru eju n’Izrel. Ọ bụ n’ụdị ili ahụ ka ndị nna ha ochie liri ozu. Dị ka ihe atụ, ọ bụ n’ọgba dị na Mak-pila, nke dị nso na Hibron, ka e liri Ebreham, Sera, Aịzik, Jekọb, na ọtụtụ ndị ọzọ.—Jenesis 23:19; 25:8, 9; 49:29-31; 50:13.

E liri Jizọs n’ili e gwuru n’oké nkume. (Mak 15:46) Ọnụ ụdị ili a na-adịkarị ntakịrị. A na-awa nkume ahụ ka ezinụlọ nwee ebe dị iche iche ha ga-adọba ozu ndị ezinụlọ ha nwụrụ anwụ. Ọ bụrụ na ozu erekasịchaa, a na-achịkọta ọkpụkpụ dịzi ebe ahụ ma tinye ha n’ime igbe e ji nkume rụọ. Ọ bụ otú ahụ ka ndị Juu na-eme n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Ịchịpụ ọkpụkpụ onye ahụ nwụrụ anwụ na-eme ka ezinụlọ ahụ nwee ebe ha ga-adọba ozu onye ezinụlọ ha ọzọ nwụrụnụ.

Chineke nyere ndị Juu iwu ka ha na-edebe ụbọchị izu ike nsọ. N’ihi ya, ndị Juu anaghị akwadebe ozu n’ụbọchị izu ike. Ebe Jizọs nwụrụ mgbe ọ fọrọ naanị awa atọ ka ụbọchị izu ike malite, Josef onye Arimatia na ndị ọzọ akwadebechaghị ozu Jizọs otú ndị Juu si eme tupu ha elie ya. (Luk 23:50-56) Ọ bụ ya mere ụfọdụ ndị enyi Jizọs ji gaa n’ili ya mgbe ụbọchị izu ike gasịrị ka ha kwadebechaa ozu ya otú ndị Juu si eme.—Mak 16:1; Luk 24:1.