Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eziokwu

Eziokwu

Eziokwu?

Olee otú o nwere ike isi baara gị na ezinụlọ gị uru?

Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịa nụrụ azịza nke ajụjụ ndị a ná mgbakọ ụbọchị atọ Ndịàmà Jehova ga-enwe.

ISIOKWU YA BỤ:

‘Okwu Chineke Bụ Eziokwu!’

E si n’ihe Jizọs kwuru na Jọn 17:17 nweta ya.

IHE ỤFỌDỤ A GA-EME NÁ MGBAKỌ A:

Otu n’ime isiokwu ndị magburu onwe ha a ga-ekwu ná mgbakọ a bụ “Gịnị Bụ Eziokwu?” Isiokwu a ga-akọwa ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, obi.

A ga-enwe ihe nkiri abụọ ndị ga-eme ka anyị ghọtakwuo akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl na uru ndị ha baara anyị.

NDỊ NWERE IKE ỊBỊA MGBAKỌ A:

Ma onye ukwu ma onye nta. Ị gaghị akwụ ụgwọ tupu gị abata, o nwekwanụghị onye a ga-ana ụtụ.

OGE NA EBE Ọ GA-ABỤ:

Gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr418.com ka ị hụ ebe dị gị nso a ga-enwe mgbakọ a nakwa ka i kirie vidio ga-eme ka ị mata otú mgbakọ anyị na-adị. (Ị gaa n’ebe e dere GBASARA ANYỊ pịa ebe e dere MGBAKỌ)

Ị gaa na www.pr418.com, ị ga-ahụ akwụkwọ usoro ihe omume mgbakọ a. (Ị gaa n’ebe e dere IHE ANYỊ NWERE pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ)