Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BỊARUO CHINEKE NSO

“Jehova Gbaghaara Unu Kpamkpam”

“Jehova Gbaghaara Unu Kpamkpam”

E nwere otu nwoke Briten bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme. Aha ya bụ Edward Herbert. Ọ sịrị: “Onye na-anaghị agbaghara ndị ọzọ achọghị ka ndị ọzọ gbaghara ya.” Ihe a o kwuru gosiri otu ihe mere anyị ji kwesị ịgbaghara ndị ọzọ, ya bụ, na mee elu mee ala, anyị ga-achọkwa ka ndị ọzọ gbaghara anyị. (Matiu 7:12) Ma, e nwere ihe ka mkpa mere anyị ji kwesị ịgbaghara ndị ọzọ. Ka anyị lebagodị anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:13.—Gụọ ya.

Ebe anyị niile bụ ndị na-ezughị okè, anyị nwere ike ịkpasu ndị ọzọ iwe ma ọ bụ mejọọ ha mgbe ụfọdụ. Ha nwekwara ike imejọ anyị ma ọ bụ kpasuo anyị iwe. (Ndị Rom 3:23) Ma, olee ihe anyị ga-eme ka anyị na ndị na-ezughị okè ibe anyị na-adị n’udo? Pọl si n’ike mmụọ nsọ dụọ anyị ọdụ ka anyị na-anagiderịta ibe anyị ma na-agbaghara ibe anyị. Ndụmọdụ ahụ Pọl nyere baara anyị uru taa otú ahụ ọ bara n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga o dere ya. Ka anyị leruo ihe ahụ Pọl dere anya.

“Na-ediri ibe unu ihe.” Okwu Grik a sụgharịrị ‘na-edi ihe’ pụtara mmadụ idi ihe ọjọọ e mere ya. Otu akwụkwọ kwuru na Ndị Kraịst na-ediri ibe ha ihe “maka na ha ji obi ha chọọ inwere ibe ha ndidi n’agbanyeghị na e nwere ihe ndị ibe ha na-eme na-agbakasị ha ahụ́.” Okwu bụ́ “ibe unu” pụtara na aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri, ya bụ, na ọ bụghị naanị ndị ọzọ ga na-agbaghara anyị, anyị ga na-agbaghakwara ha. Mgbe ọ bụla anyị chetara na o nwere ihe anyị na-eme na-akpasukwa ndị ọzọ iwe, anyị agaghị ekwe ka ihe na-adịchaghị anyị mma ndị ọzọ na-eme mee ka anyị na ha sewe okwu. Ma, oleekwanụ ihe anyị ga-eme ma ndị ọzọ mejọọ anyị?

“Na-agbaghara ibe unu kpamkpam.” Otu ọkà mmụta kwuru na okwu Grik a sụgharịrị ‘ịgbaghara kpamkpam’ abụghị otu okwu ahụ a na-asụgharịkarị “ịgbaghara mmadụ mmehie . . . kama nke a pụrụ iche n’ihi na ọ pụtara mmadụ iji obi ya niile gbaghara onye mejọrọ ya kpamkpam.” Otu ọkà mmụta ọzọ kwuru na okwu Grik ahụ pụtara “imere mmadụ amara ma ọ bụ ihe ọma.” Anyị na-egosi na anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma ma ọ bụrụ na anyị ji obi anyị na-agbaghara ha, a sịgodị na ha mere ‘ihe ga-eme ka anyị mee mkpesa.’ Ma, gịnị mere anyị ji kwesị iji obi anyị niile gbaghara ha? Otu ihe kpatara ya bụ na a ga-enwekwa mgbe anyị ga-achọ ka onye anyị mejọrọ gbaghakwara anyị.

“Dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.” Ọ bụ nke a bụ ihe kacha mkpa mere anyị ji kwesị ịna-agbaghara ndị ọzọ kpamkpam, ya bụ, Jehova Chineke na-agbaghakwara anyị kpamkpam. (Maịka 7:18) Chegodị echiche ụdị ihe ọma Jehova na-emere ndị mmehie chegharịrịnụ. Jehova adịghị ka anyị n’ihi na ọ naghị eme mmehie. Ma, ọ na-eji obi ya niile agbaghara ndị mmehie chegharịrịnụ, n’agbanyeghị na ọ ma na o nweghị mgbe ọ ga-adị ya mkpa ka ha gbaghara ya. N’eziokwu, Jehova bụ onye anyị ga-akacha esi n’aka ya mụta ịgbaghara ndị ọzọ.

Jehova bụ onye anyị ga-akacha esi n’aka ya mụta ịgbaghara ndị ọzọ

Ọ bụ ebere Jehova na-emere anyị mere anyị ji abịa ya nso, ọ bụkwa ya mere anyị ji agbalị ka anyị ṅomie ya. (Ndị Efesọs 4:32–5:1) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Ebe ọ bụ na Jehova ji obi ya niile na-agbaghara m, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ịgbaghara mmadụ ibe m na-ezughị okè ma ọ bụrụ na o mejọrọ m ma chegharịa?’—Luk 17:3, 4.