ṄOMIE OKWUKWE HA
E ‘Sitere n’Ọrụ Rehab Kpọọ Ya Onye Ezi Omume’
REHAB si na windo ụlọ ya lepụ anya mgbe chi bọwara na Jeriko na obodo ndị gbara ya gburugburu. Ndị agha Izrel nọ nso na Jeriko, ha chọkwara ịlụso Jeriko agha. Ha bidokwara ịga obodo Jeriko gburugburu. Ka ha na-aga, e bidokwara ịnụ ụda opi ha. Otú ha si na-azọ ije mere ka uzuzu ju ebe niile.
Rehab bi na Jeriko. Ọ ma ụlọ na okporo ụzọ ndị dị na Jeriko nakwa ụlọ ahịa ndị e nwere na ya. Ọ maruru ndị bi na Jeriko ala. Ọ chọpụtara na ezigbo ụjọ ji ha ka ha na-ahụ otú ndị Izrel si na-aga obodo ha gburugburu otu ugboro n’ụbọchị. Ha ahụbeghị ụdị ihe a mbụ. N’agbanyeghị na a na-anụ ụda opi ahụ n’okporo ụzọ nakwa n’ámá dị iche iche dị na Jeriko, ụjọ ejighị Rehab ọ bụ eziokwu na o ji ndị obodo ya.
Rehab nọ na-ele anya ka ndị agha Izrel bidoro ịga obodo ha gburugburu n’isi ụtụtụ ụbọchị a bụ́ ụbọchị nke asaa. N’etiti ndị agha Izrel, ọ hụrụ ndị nchụàjà na-afụ opi, hụkwa ndị nke bu igbe nsọ Chineke, nke gosiri na Chineke ha, bụ́ Jehova, nọ n’etiti ha. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Rehab tụkwasịrị aka ya n’eriri uhie o kegidere na windo ya. Windo ya ahụ dị n’ahụ́ mgbidi obodo ahụ. Eriri ahụ chetaara Rehab na o nweghị ihe ga-eme ya na ezinụlọ ya mgbe a ga-ebibi obodo ha. Nke a ọ̀ pụtara na Rehab gbara ndị obodo ya mgba okpuru? Jehova ewereghị ya otú ahụ, kama o weere Rehab ka nwaanyị nwere ezigbo okwukwe. Ka anyị malite akụkọ Rehab n’isi ma hụ ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ya.
REHAB BỤ NWAANYỊ AKWỤNA
Baịbụl kwuru na Rehab bụ nwaanyị akwụna. Ihe a Baịbụl kwuru wụrụ ụfọdụ ndị na-akọwa Baịbụl n’oge ochie akpata oyi n’ahụ́ nke na ha kwuru na Rehab abụghị nwaanyị na-akwa iko, kama na o nwere ụlọ ebe ndị njem na-anọbọ chi. Ma, Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụ nwaanyị akwụna. (Jọshụa 2:1; Ndị Hibru 11:31; Jems 2:25) O nwere ike ịbụ na Ndị Kenan ewereghị ịgba akwụna ka ihe ọjọọ. N’agbanyeghị na ha ewereghị ya ka ihe ọjọọ, akọnuche Rehab, bụ́ nke Jehova nyere ya otú o nyere anyị niile, ga na-agwa ya na ịgba akwụna adịghị mma. (Ndị Rom 2:14, 15) O nwere ike ịbụ na ihere onwe ya na-eme ya na ọ na-agba akwụna. Ọ ga-abụ na o chere na ya agaghị ahapụli ọrụ ahụ ebe ọ dị ya ka o nweghị ihe ọzọ ọ ga na-arụ ka o nwee ike ịkpa afọ ya na ezinụlọ ya. Ọ bụkwa otú a ka ọ na-adị ụfọdụ ndị na-arụ ụdị ọrụ ahụ taa.
O doro anya na Rehab chọrọ otú ihe ga-esi aka mma ná ndụ ya. Ndị obodo ya na-eme ihe ike. Ihe ọjọọ jukwara n’obodo ha. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị na-edina ndị ikwu ha na ndị na-edina ụmụ anụmanụ. (Levitikọs 18:3, 6, 21-24) Ihe mere ihe ọjọọ ji ju n’obodo ha bụ okpukpe ha. Ndị mmadụ na-agba akwụna n’ụlọ arụsị ha. Ọ na-abụ ha fewe chi ha bụ́ Bel na Molek na chi ndị ọzọ, ha na-esure ụmụ ha n’ọkụ ná ndụ.
Jehova hụrụ ihe ọjọọ niile ndị bi na Kenan na-eme. Ọ bụ ya mere Jehova ji sị: “Ala ha bụ ihe na-adịghị ọcha, m ga-enyekwa ya ntaramahụhụ n’ihi njehie ya, ala ahụ ga-agbọpụkwa ndị bi n’ime ya.” (Levitikọs 18:25) Gịnị bụ ‘ntaramahụhụ a ga-enye ala Kenan maka njehie ya’? Chineke kwere ụmụ Izrel nkwa, sị: “Jehova bụ́ Chineke gị ga-eji nke nta nke nta kwapụ mba ndị a n’ihu gị.” (Diuterọnọmi 7:22) Ọtụtụ narị afọ tupu oge ahụ, Jehova kwere nkwa na ya ga-enye ezinụlọ Ebreham ala ahụ. ‘Chineke apụghịkwa ịgha ụgha.’—Taịtọs 1:2; Jenesis 12:7.
Ma, e nwere ndị bi n’ala Kenan Jehova kwuru na a ga-egbuchapụ. (Diuterọnọmi 7:1, 2) Ebe ọ bụ na Jehova bụ “Onyeikpe nke ụwa dum,” o nyochara obi ha ma hụ na ihe ọjọọ abaala ha n’ụmị nke na ha enweghị mmekwata. (Jenesis 18:25; 1 Ihe E Mere 28:9) Olee otú obi dị Rehab na o bi n’obodo ọjọọ a Chineke kwuru na a ga-ebibi? Anyị agaghị ekwuli kpọmkwem otú obi dị ya mgbe ọ nụrụ akụkọ ụmụ Izrel. Ọ nụrụ na Chineke ha anapụtala ha n’aka ndị Ijipt, bụ́ ndị ji ha mere ndị ohu, ma mee ka ha merie ndị agha Ijipt. N’oge ahụ, ọ bụ ndị agha Ijipt kacha akpa ike n’ụwa. Ugbu a, ụmụ Izrel na-abịa ibuso Jeriko agha. N’agbanyeghị ihe niile a, ndị Jeriko nọ na-eme ihe ọjọọ ha na-eme. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ndị Kenan, bụ́ ndị obodo Rehab, “nupụrụ isi.”—Ndị Hibru 11:31.
Ma, Rehab emeghị otú ahụ. Ọ ga-abụ na kemgbe ọtụtụ afọ, o chebarala ihe ndị ọ nụrụ gbasara ụmụ Izrel na Chineke ha, bụ́ Jehova, echiche. Ọ hụrụ na Chineke adịtụdịghị ka chi ndị a na-efe n’ala Kenan. Ọ bụ Chineke nke lụchiteere ndị na-efe ya ọgụ kama irigbu ha, o mekwara ka ndị na-efe ya na-akpa àgwà ọma, ọ bụghị àgwà ọjọọ. Chineke a weere ụmụ nwaanyị ka ndị bara ezigbo uru, ọ bụghị naanị ndị a ga na-edina edina ma ọ bụ ndị a ga-ere ere ka ha gbawa ohu ma ọ bụ ndị na-abaghị uru. Ọ ga-abụ na ụjọ ji Rehab mgbe ọ nụrụ na ndị Izrel nọzi n’ofe osimiri Jọdan, na-ejikere ịlụso Jeriko agha n’ihi ihe na-aga ime ndị obodo ya. Jehova ọ̀ hụrụ Rehab? Ihe ọ hụrụ n’obi Rehab ọ̀ masịrị ya?
Taa, e nwere ọtụtụ ndị dị ka Rehab. Ọ na-adị ha ka ha agaghị ahapụli ihe ọjọọ ndị ha na-eme, bụ́ ndị na-eme ka ha ghara inwe obi ụtọ, onwe ha ana-eme ha ihere, ya adịkwa ha ka o nweghị uru ha bara. Akụkọ Rehab na-eme ka obi sie anyị ike na o nweghị onye n’ime anyị Chineke na-ejighị kpọrọ ihe. Ọ bụrụgodị na anyị na-eche na anyị abatụdịghị uru, ‘Chineke anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ Ndịozi 17:27) Ọ nọ anyị nso, ọ dịkwa njikere ime ka ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ nwee olileanya. Rehab ò nwerenụ okwukwe na Chineke?
Ọ NABATARA NDỊ NLEDO
Otu ụbọchị, tupu ndị Izrel amalite ịga Jeriko gburugburu, ndị ikom abụọ Rehab na-amaghị ndị ha bụ bịara na nke ya. Ha achọghị ka a mata ndị ha bụ. Ma, ebe ọ bụ na onye ọ bụla chị obi ya n’aka n’obodo a, anya dị ọtụtụ ndị nkọ ka ha mata mgbe ndị Izrel ga-abata n’obodo ha. Ọ ga-abụ na Rehab matara ndị ha bụ ozugbo. Nke a apụtaghị na ndị ọ na-amaghị anaghị abịabu na nke ya. Ma ihe ndị ikom a chọrọ bụ ebe ha ga-ehi, ọ bụghị ka ha na ya kwaa iko.
N’eziokwu, ndị ikom abụọ ahụ si n’ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu bịa iledo Jeriko. Ọchịagha ha, bụ́ Jọshụa, dunyere ha ka ha gaa nyofuo Jeriko. Obodo a bụ obodo mbụ na Kenan ndị Izrel ga-alụso agha, o nwekwara ike ịbụ ya kacha obodo ndị ọzọ ike. Jọshụa chọrọ ịmata otú obodo a ha chọrọ ịlụso agha dị. O doro anya na ndị nledo ahụ kpachaara anya gaa n’ụlọ Rehab. Ma ó nweghị ihe ọzọ, ọ bụ n’ụlọ onye akwụna ka mmadụ nwere ike ịbanye, a ghara ịchọwa ịmata ebe o si bịa. O nwekwara ike ịbụ na ndị nledo ahụ chọrọ ile ma ò nwere ihe ha ga-anụta n’ọnụ ndị mmadụ n’ebe ahụ.
Baịbụl sịrị na Rehab ‘nabatara ndị ozi ahụ nke ọma.’ (Jems 2:25) Ọ kpọbatara ha n’ime ụlọ ya. Ọ bụrụgodị na ọ na-enyo ha enyo ma ọ bụ na ọ ghọtaghị ihe mere ha ji bịa, ọ hapụrụ ha ka ha nọrọ. O nwere ike ịbụ na ọ chọrọ ịmụtakwu banyere Chineke ha, bụ́ Jehova.
Ma na mberede, ndị eze Jeriko dunyere ozi rutere na nke ya. Ozi eruola ebe niile na e nwere ndị Izrel banyere n’ụlọ Rehab. Gịnị ka Rehab ga-eme? Ọ bụrụ na o zoo ndị nledo a, ọ̀ bụ na ọ gaghị etinye ya na ndị ezinụlọ ya niile ná nsogbu ma ọ bụkwanụ mee ka ndị Jeriko gbuo ha niile? O nwekwara ike ịbụ na ọbịbịa a ndị eze dunyere ozi bịara n’ụlọ Rehab emeela ka o dokwuo Rehab anya na ndị ikom abụọ ahụ bụ ndị Izrel n’eziokwu. Ọ bụrụ na ọ marala na Jehova ka chi ya ike, ọ̀ bụ na ihe a abụghị ohere ọ ga-eji dụnyere Jehova úkwù?
Rehab enwechaghị oge ọ ga-eji chee echiche mara ihe ọ ga-eme. Ma, o mere ngwa ngwa gaa zoo ndị nledo ahụ n’uko ụlọ ya, n’ebe e dewere okporo ahịhịa ogho n’úkwù n’úkwù ka ha kpọọ. Ọ gaziri gwa ndị ahụ eze dunyere, sị: “N’ezie, ndị ikom ahụ bịakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa. O wee ruo na mgbe chi jiwere, mgbe a chọrọ imechi ọnụ ụzọ ámá, ndị ikom ahụ pụrụ. Amaghị m ebe ndị ikom ahụ gara. Chụwanụ ha ọsọ ọsọ, n’ihi na unu ga-achụkwuru ha.” (Jọshụa 2:4, 5) Weregodị ya na ị na-ahụ ka Rehab lere ndị ahụ eze dunyere ozi anya n’ihu. Ọ̀ ga-abụ na egwu tụwara ya maka na o chere na ha nwere ike ịchọpụta na obi na-akụ ya kpum kpum?
Ma ihe ahụ o kwuru megharịrị ndị ahụ anya. Ha gbapụrụ ozugbo, tinye isi n’ụzọ gara n’ebe a na-eji ụkwụ agafe osimiri Jọdan. (Jọshụa 2:7) Rehab kudara ume. Ihe ahụ o kwuru zọrọ ndị ohu Jehova ahụ ma mee ka ndị ahụ chọrọ igbu ha tinye isi n’ebe ọzọ n’ihi na ha ekwesịghị ịma nke bụ́ eziokwu.
Rehab jizi ọsọ gbagoro n’uko ụlọ ya ma gwa ndị nledo ahụ ihe merenụ. Ọ gwakwara ha otu ihe ọzọ dị ezigbo mkpa, ya bụ, na ụjọ ejidela ndị obodo ya nakwa na obi na-alọ ha mmiri. O doro anya na obi tọrọ ndị nledo ahụ ụtọ mgbe ha nụrụ ihe a o kwuru. Ụjọ na-atụzi ndị Kenan ọjọọ ahụ n’ihi otú Jehova, bụ́ Chineke Izrel, si na-akpa ike. Rehab kwuziri ihe ọzọ anyị na-ekwesịghị ileghara anya. Ọ sịrị: “Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa.” (Jọshụa 2:11) Ihe ndị ọ nụrụla banyere Jehova ezuola ime ka ọ mara na o kwesịrị ịtụkwasị ya obi. N’ihi ya, o nwere okwukwe na Jehova.
Obi siri Rehab ike na Jehova ga-eme ka ndị Izrel merie ndị obodo ya. N’ihi ya, ọ rịọrọ ha ka ha meere ya ebere ma zọpụta ya na ndị ezinụlọ ya. Ndị nledo ahụ kwetara ihe o kwuru ma gwa ya na ha ga-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na ọ gbabọghị ha nakwa ma ọ bụrụ na o kegide eriri na-acha uhie uhie na windo ụlọ ya otú a ga na-ahụ ya n’ahụ́ mgbidi obodo ha.—Jọshụa 2:12-14, 18.
O nwere ezigbo ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Rehab gbasara inwe okwukwe. Baịbụl kwuru na “a na-esi n’ihe a nụrụ enwe okwukwe.” (Ndị Rom 10:17) Ọ nụrụ banyere ike Jehova Chineke kpara na otú o si ekpe ikpe ziri ezi. Nke a mere ka o nwee okwukwe na Jehova ma tụkwasị ya obi. Taa, e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmata gbasara Jehova karịa otú Rehab matara. Ma ajụjụ bụ, ihe ndị anyị na-amụta n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, hà ga-eme ka anyị mata ya ma tụkwasị ya obi?
MGBIDI JERIKO DARA
Rehab gwaziri ndị nledo ahụ ka ha jiri ụdọ si na windo ụlọ ya, bụ́ nke dị n’ahụ́ mgbidi, rịtuo ma tinye isi n’ógbè bụ́ ugwu ugwu. Ha mere otú ahụ. E nwere ọtụtụ ọgba ná mkpọda ugwu ndị dị n’akụkụ ebe ugwu Jeriko, bụ́ ebe ndị nledo ahụ nwere ike izo ruo mgbe ala ga-ajụ oyi, ha alaghachizie n’ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu ma kọọrọ ha akụkọ ọma ha nụrụ n’ọnụ Rehab.
Ezigbo ụjọ mechara jide ndị bi na Jeriko mgbe ha nụrụ na Jehova emeela ka Osimiri Jọdan kwụsị ịsọ asọ, ụmụ Izrel esi n’ala akọrọ gafere. (Jọshụa 3:14-17) Ma, akụkọ a emeghị ka ụjọ tụwa Rehab, kama o mere ka okwukwe o nwere na Jehova sikwuo ike.
Ọ bụ mgbe ihe a mechara ka ụmụ Izrel bidoro ịga Jeriko gburugburu otu ugboro n’ụbọchị ruo ụbọchị isii. Ma, ihe a bụ ụbọchị nke asaa. Ọ pụkwara iche. Dị ka anyị kwuru ná mmalite isiokwu a, ha bidoro nke ụbọchị a n’isi ụtụtụ. Mgbe ndị agha ahụ gachara Jeriko gburugburu otu ugboro, ha akwụsịghị, kama ha gakwara ya gburugburu ọzọ ọtụtụ ugboro. (Jọshụa 6:15) Gịnị ka ihe a ndị Izrel na-eme pụtara?
Mgbe ha gara Jeriko gburugburu nke ugboro asaa n’ụbọchị nke asaa ahụ, ha kwụsịrị. Ha kwụsịkwara ịfụ opi, ebe niile adaa jụụ. Ọ ga-abụ na ebe niile gbawaziri aghara n’ime Jeriko. Mgbe ahụ, Jọshụa gwara ndị agha Izrel ka ha tie mkpu, ha etie oké mkpu. Ihe ahụ bụ nke mbụ a nụrụ olu ha kemgbe ha gawara Jeriko gburugburu. Ọ̀ ga-abụ na ndị nche Jeriko, bụ́ ndị nọ n’elu mgbidi, nọ na-eche n’obi ha ma ọ̀ bụ naanị mkpu a ndị Izrel tiri bụ otú ha chọrọ isi lụso ha agha? Ọ bụrụ ihe ha chere, ihe mezirinụ tụrụ ha n’anya. Mgbidi Jeriko bidoro ịma jijiji. Ọ malitekwara ịgbawa ruo mgbe ọ daruru ala. Mgbe uzuzu kuchasịrị, a hụrụ na e nwere ebe na-adaghị ná mgbidi ahụ. Ụlọ Rehab ka guzo. Ọ bụ naanị ya fọrọ. Nke a gosiri na Rehab nwere okwukwe. Chegodị otú obi dị ya mgbe ọ hụrụ otú Jehova si chebe ya na ezinụlọ ya. *—Jọshụa 6:10, 16, 20, 21.
Ụmụ Izrel kwanyeere Rehab ùgwù n’ihi okwukwe ya. Mgbe ha hụrụ na ọ bụ naanị ụlọ ya fọrọ ná mgbidi Jeriko, ha matara ozugbo na Jehova nọnyeere ya. Mgbe ndị Izrel bibichara ndị bi na Jeriko, ha hapụrụ Rehab ka o biri n’ebe dị nso n’ebe ha mara ụlọikwuu. Rehab mechaziri bụrụ onye Juu. Ọ lụrụ nwoke aha ya bụ Salmọn. Ha mụtara Boaz. Mgbe Boaz toro, ọ ghọrọ nwoke e ji okwukwe ya ama atụ. Ọ lụrụ Rut, bụ́ nwaanyị Moab. * (Rut 4:13, 22) Ọ bụ n’ezinụlọ ndị a nwere okwukwe ka a mụrụ Eze Devid, mechaakwa mụọ Mesaya ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst.—Jọshụa 6:22-25; Matiu 1:5, 6, 16.
Akụkọ Rehab gosiri na o nweghị onye n’ime anyị Jehova na-ejighị kpọrọ ihe. Ọ na-ahụ anyị niile, na-enyochakwa obi anyị. Obi na-atọkwa ya ụtọ mgbe ọ bụla ọ hụrụ na anyị nwere okwukwe ka Rehab. Ọ bụ okwukwe ya mere o ji mee ihe ndị o mere. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ‘e sitere n’ọrụ kpọọ ya onye ezi omume.’ (Jems 2:25) Anyị ga-egosi na anyị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị eṅomie okwukwe Rehab.
^ para. 27 Jehova mezuru nkwa ndị nledo abụọ ahụ kwere Rehab.
^ para. 28 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara Rut na Boaz, gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha” n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2012 nakwa nke Ọktoba 1, 2012.