Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 KỤZIERE ỤMỤ GỊ IHE

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-echeta Jizọs Kraịst?

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-echeta Jizọs Kraịst?

N’ọnwa Disemba, ọtụtụ ndị n’ụwa na-ahụ ebe e sere Jizọs ka nwa ọhụrụ ma ọ bụ ebe a kpụrụ ya akpụ. A na-esekarị ebe e nyiwere ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Ma, ihe anyị kwesịrị icheta ọ̀ bụ naanị mgbe Jizọs bụ nwa ọhụrụ? * Ka anyị mụta otú ka mma anyị ga-esi na-echeta ya. Anyị ga-amụta ya ma ọ bụrụ na anyị eleba anya n’ihe mere n’otu abalị, mgbe ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa dị nso na Betlehem na-azụ atụrụ.

Otu mmụọ ozi pụtara n’ihu ndị ọzụzụ atụrụ na mberede. Ọ sịrị ha: “A mụụrụ unu Onye Nzọpụta taa, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị.” Mmụọ ozi ahụ gwakwara ha na ha ga-ahụ Jizọs ‘ebe e ji ákwà fụọ ya ma nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.’ Ozugbo ahụ, ọtụtụ ndị mmụọ ozi pụtara “na-eto Chineke.”

Olee otú obi ga-adị gị ma ị nụ ka ndị mmụọ ozi na-eto Chineke?— Obi tọrọ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ụtọ. Ha gwara ibe ha ‘ka ha garuo Betlehem ozugbo ma hụ ihe ahụ merenụ.’ Mgbe ha ruru, ha hụrụ “Meri na Josef nakwa nwa ọhụrụ ahụ nke dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.”

Mgbe obere oge gachara, ndị ọzọ bịara n’ebe ahụ Meri na Josef nọ na Betlehem. Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kọọrọ ha ihe merenụ, ya eju ha anya. Obi ọ̀ dị gị ụtọ ịnụ ihe ebube a merenụ n’oge a mụrụ Jizọs?— Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, obi ga-adị anyị ụtọ. Anyị kwesịrị ịmata ihe mere obi ji atọ anyị ụtọ na a mụrụ Jizọs. Ma, ka anyị burugodị ụzọ mata ihe ndị mere tupu Meri alụọ di.

Otu ụbọchị, mmụọ ozi aha ya bụ Gebriel bịakwutere Meri. Ọ gwara Meri na ọ ga-amụ nwa nwoke, gwakwa ya na nwa ahụ “ga-abụ onye ukwu” nakwa na ‘a ga-akpọ ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu.’ Gebriel kwukwara na nwa ahụ ‘ga-achị ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.’

Mgbe Gebriel gwachara Meri ihe a, Meri chọrọ ịmata otú ihe a ga-esi eme ebe ọ bụ na ya na nwoke enwetụbeghị mmekọahụ. N’ihi ya, Gebriel gwara ya, sị: ‘Ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchi gị.’ Ọ gwakwara ya na  “a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.” Chineke ime ka ndụ Ọkpara ya bi n’eluigwe banye n’akpa nwa Meri, too n’ebe ahụ ma ghọọ obere nwa, abụghị obere ọrụ. Ọ bụ nnukwu ọrụ ebube.

Ị̀ hụtụla ebe e sere ndị a sịrị na ha bụ ndị amamihe atọ ka ha na ndị ọzụzụ atụrụ so bịa ileta Jizọs mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ?— N’oge Krismas, a na-egosikarị ebe e sere ụdị ihe ahụ. Ma, ihe ahụ a na-ese emeghị eme. N’eziokwu, ndị ahụ a sị na ha bụ ndị amamihe atọ bụ ndị na-agụ kpakpando. Chineke kpọkwara ịgụ kpakpando asị. Ka anyị hụ ihe mere mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando gara ịhụ Jizọs. Baịbụl sịrị: “Mgbe ha banyere n’ụlọ, ha hụrụ nwatakịrị ahụ na nne ya bụ́ Meri.” Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na Jizọs abụghịzi nwa ọhụrụ mgbe ahụ, o gosikwara na ọ nọghịzi n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Kama, Jizọs na Josef na Meri bizi n’ụlọ.

Olee otú ndị ahụ na-agụ kpakpando si chọta Jizọs?— E nwere kpakpando du ha. Ma, o durughị ha ozugbo gawa Betlehem. O bu ụzọ duru ha gaa Jeruselem, bụ́ ebe Eze Herọd nọ. Baịbụl kwuru na Herọd chọrọ ịhụ Jizọs ka o gbuo ya. Chebagodịrị ihe a echiche. Ònye ka i chere na ọ bụ ya mere ka kpakpando duru ndị ahụ na-agụ kpakpando gakwuru Herọd?— Ọ bụghị ezi Chineke, bụ́ Jehova. Kama, ọ bụ onye iro ya bụ́ Setan.

Taa, Setan chọrọ ka ndị mmadụ chee na Jizọs ka bụ nwa ọhụrụ na-enweghị ike ilekọta onwe ya. Ma, Gebriel gwara Meri na Jizọs ‘ga-achị dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.’ Jizọs na-achị ugbu a n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ebibi ndị niile bụ ndị iro Chineke. Ọ bụ ihe a kwesịrị ịna-agbata anyị n’obi mgbe ọ bụla anyị chetara Jizọs, anyị kwesịkwara ịkọrọ ya ndị ọzọ.

^ para. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gwa ya ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.