ỤLỌ NCHE Jenụwarị 2014 | Ọ Bụrụ na Mmadụ Anwụọ, nke Ya Ọ̀ Gaala?

Ọtụtụ ndị anaghị achọ ikwu gbasara ọnwụ. Ọtụtụ n’ime anyị achọghịkwa ịnwụ anwụ. Ma, ò nwere mgbe ọnwụ ga-akwụsị igbu mmadụ?

ISIOKWU TETA! A

Ọnwụ Na-agba Anyị Ka Akpị

Ọnwụ nwere ike igbu onye ọ bụla n’ime anyị. Otú ọnwụ si agba ndị mmadụ ka akpị emeela ka ọtụtụ ndị gbaa mbọ ka ha mata gbasara ọnwụ.

ISIOKWU TETA! A

Mbọ Ndị Mmadụ Gbara Ka Ha Ghara Ịnwụ Anwụ

O teela ndị mmadụ chọwara ihe ha ga-eme ka ha ghara ịnwụ anwụ. Ò nwere mgbe ụmụ mmadụ ga-akwụsị ịnwụ anwụ?

ISIOKWU TETA! A

Ọ Bụrụ na Mmadụ Anwụọ, Ọ Pụtaghị na nke Ya Agaala

Gịnị mere Jizọs ji sị na onye nwụrụ anwụ na-ehi ụra? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara ndị a kpọlitere n’ọnwụ?

IHE ONYEÀMÀ JEHOVA NA ONYE AGBATA OBI YA NWERE IKE ỊKPARỊTA

Gịnị Mere Chineke Ji Hapụ Ụmụ Mmadụ Ka Ha Na-ata Ahụhụ?

Akwụkwọ Jenesis kọwara ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme n’agbanyeghị na o nwere ike ịkwụsị ya.

Ị̀ Maara?

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, olee otú ndị mmadụ si enye onyinye n’ụlọ nsọ? Ihe niile Luk, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, dere na Baịbụl hà bụ eziokwu?

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Jehova Echefubeghị M”

Mụta otú nwaanyị a na-agachi ụka anya si mụta ihe Baịbụl kwuru mere ụmụ mmadụ ji anwụ anwụ na ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ.

A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ

Gịnị mere obi ji sie ndịozi Jizọs ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ?

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Gịnị ka ị ma gbasara Chineke? Olee otú anyị nwere ike isi matakwuo ya?

Ihe Ndị Ọzọ Anyị Nwere

Gịnị Ka Chineke Chọrọ Ka M Jiri Ndụ M Mee?

Chineke ọ̀ ga-agwa gị ná nrọ ma ọ bụ kpugheere gị ma ọ bụkwanụ kpọọ gị n’ụzọ pụrụ iche tupu gị amata ihe ọ chọrọ ka i jiri ndụ gị mee? Gụọ ihe a ka ị mata ihe Baịbụl kwuru.