Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | AGHA NKE GHASASỊRỊ ỤWA

Onye Na-akpata Agha na Ahụhụ

Onye Na-akpata Agha na Ahụhụ

N’abalị iri na otu n’ọnwa Nọvemba afọ 1918, Agha Ụwa nke Mbụ biri. Ndị mmadụ hapụrụ ahịa ha na ọrụ ha gaa n’okporo ụzọ na-agba egwú. Ma mgbe obere oge gafere, ha kwụsịrị ịṅụrị ọṅụ n’ihi na ihe ka agha ahụ njọ bidoziri ime.

N’ọnwa Jun afọ 1918, otu ajọ ọrịa na-efe efe a kpọrọ inflenza malitere igbu ndị mmadụ n’ọgbọ agha dị na Frans. Mgbe obere oge gafere, ọrịa ahụ gburu ndị mmadụ ka ọkụkọ. Dị ka ihe atụ, n’ime ọnwa ole na ole, ndị agha Amerịka ọrịa ahụ gburu na Frans karịrị ndị agha ụwa nke mbụ riri isi ha. Mgbe agha ahụ biri, ụfọdụ ndị agha bu ọrịa ahụ lọta n’obodo ha. Ọrịa ahụ esizie otú ahụ gbasaa ebe niile n’ụwa.

Ihe ọzọ kpara ndị mmadụ ezé mgbe agha ahụ biri bụ agụụ na ihe isi ike. E nwere ụkọ nri n’ọtụtụ mba ndị dị na Yurop mgbe agha ahụ biri n’afọ 1918. Mgbe ọ na-erule afọ 1923, ego ndị Jamanị enwekwaghị ihe e ji ya azụta n’ahịa. Mgbe afọ isii gafere, ihe isi ike bidoro ịnyụ onye ukwu na onye nta anya n’ebe niile n’ụwa. N’afọ 1939, agha ụwa nke abụọ malitere. E nwere ike ikwu na ọ bụ ihe mere n’agha ụwa nke mbụ kpatara agha ụwa nke abụọ. Ma, gịnị kpatara nsogbu niile a?

IHE A GA-EJI AMATA OGE IKPEAZỤ

Amụma ndị e buru na Baịbụl na-eme ka anyị ghọta ihe kpatara ihe ụfọdụ ji eme n’ụwa. Ọ na-emekwa ka anyị ghọta ihe kpatara Agha Ụwa nke Mbụ. Jizọs Kraịst kwuru na oge ga-abịa mgbe “mba ga-ebuso mba ọzọ agha,” e nweekwa ụkọ nri na ọrịa  ndị na-efe efe n’ebe dị iche iche n’ụwa. (Matiu 24:3, 7; Luk 21:10, 11) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-eji nsogbu ndị ahụ mata oge ikpeazụ. Akwụkwọ Mkpughe mere ka ihe ahụ Jizọs kwuru dokwuo anya. O kwuru na ọ bụ agha a lụrụ n’eluigwe mere ka nsogbu ju n’ụwa.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ  “Agha A Lụrụ n’Ụwa na nke A Lụrụ n’Eluigwe.”

Akwụkwọ Mkpughe kwukwara gbasara ịnyịnya anọ na ndị na-agba ha. Atọ n’ime ndị ahụ na-agba ịnyịnya nọchiri anya agha, ụkọ nri, na ọrịa ndị na-efe efe Jizọs kwuburu okwu ha. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ  “Ịnyịnya Anọ na Ndị Na-agba Ha Hà Na-awụ Ọsọ n’Eziokwu?”) O doro anya na agha ụwa nke mbụ mere ka oge nsogbu malite n’ụwa. Nsogbu ka na-akpakwa ndị mmadụ ezé. Baịbụl gosikwara na ọ bụ Setan kpatara nsogbu niile ahụ. (1 Jọn 5:19) Ma, à ga-ahapụ ya ka ọ kpara ike na-aga?

Akwụkwọ Mkpughe gwakwara anyị na oge Setan nwere “dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:12) Ọ bụ ya mere iwe ji ju ya obi, ya ana-akpatara ụmụ mmadụ ọtụtụ nsogbu n’ụwa. Ma, ọtụtụ nsogbu ndị a anyị na-ahụ gosikwara na oge Setan nwere agwụla agwụ.

 A GA-EBIBI ỌRỤ EKWENSU

N’eziokwu, Agha Ụwa nke Mbụ ghasara ụwa. O mere ka e bido ịlụ agha aghara aghara. O mekwara ka ndị mmadụ kwụsị ịtụkwasị ndị ọchịchị obi, meekwa ka ha na-eme ngagharị iwe ka a gbanweere ha ndị ọchịchị. Ihe ọzọ bụ na o gosiri na a chụdatala Setan n’ụwa. (Mkpughe 12:9) Ebe Setan ma na oge ya agwụla agwụ, o bidoro ịkpa ike n’ụwa. Ọ bụ mgbe oge ya ga-agwụ ka nsogbu niile Agha Ụwa nke Mbụ buteere ụmụ mmadụ ga-akwụsị.

Amụma ndị e buru na Baịbụl kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na Eze anyị nọ n’eluigwe, bụ́ Jizọs Kraịst, ‘ga-ebibi ọrụ Ekwensu’ n’oge na-adịghị anya. (1 Jọn 3:8) Ọtụtụ nde mmadụ na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Ì so ná ndị na-ekpe ekpere a? Alaeze ahụ ga-eme ka ndị niile na-efe Chineke hụ mgbe uche Chineke ga-eme n’ụwa, ọ bụghị uche Setan. (Matiu 6:9, 10) Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, a gakwaghị enwe agha ọ bụla n’ụwa, ma ya fọdụzie agha zuru ụwa ọnụ. (Abụ Ọma 46:9) Ọ ga-adị mma ka ị mụtakwuo gbasara Alaeze Chineke n’ihi na nke a ga-eme ka i jiri anya gị hụ mgbe udo ga-adị ebe niile n’ụwa.—Aịzaya 9:6, 7.