Ihe Tọmọs Emlin Kụziri Ọ̀ Bụ Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Ụgha?
ÒNYE bụ Tọmọs Emlin? Gịnị mere o ji gbachitere eziokwu? Gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’aka ya?
Ihe mere n’Ingland nakwa n’Ayaland n’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga ga-enyere anyị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a. Ọ bụ Chọọchị Ingland na-atụ ihe na-eme n’oge ahụ. Ma, e nwere ndị Protestant ndị ọzọ nakwa mmadụ ole na ole na-ekwetaghị na ihe Chọọchị Ingland na-akụzi bụ eziokwu. Ha ekwetaghịkwa na ihe ndị chọọchị a na-eme dị mma.
ÒNYE BỤ TỌMỌS EMLIN?
A mụrụ Tọmọs Emlin n’abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee n’afọ 1663, n’obodo Stamfọd, nke dị na Linkọnshia, n’Ingland. O kwuru okwuchukwu mbụ ya mgbe ọ dị afọ iri na itoolu. O mechara kụziwere otu nwaanyị a ma ama bi na Lọndọn Baịbụl. Emlin mecharakwara kwaga n’obodo Belfast, nke dị n’Ayaland.
O mechara kwuwe okwuchukwu n’otu chọọchị dị n’obodo Belfast. Mgbe obere oge gafere, o kwuwere okwuchukwu na Dọblịn nakwa n’ebe dị iche iche.
GỊNỊ MERE E JI BO YA EBUBO NA IHE Ọ KỤZIRI BỤ ỤGHA?
N’oge niile ahụ, Emlin nọ na-amụsi Baịbụl ike. Ihe ọ mụtara mere ka o nyowe nkụzi Atọ n’Ime Otu enyo n’agbanyeghị na o kwebuuru na ya. Mgbe o lebara anya n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, o doro ya anya na Baịbụl ekwughị na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu.
Emlin agwaghị ndị mmadụ ihe ahụ ọ mụtara ozugbo. Ma, ụfọdụ ndị chọọchị ya dị na Dọblịn chọpụtara na ọ naghịzi ekwute okwu Atọ n’Ime Otu ma o kwuwe okwuchukwu na chọọchị. Emlin ma na ya gwa ndị mmadụ ihe ya chọpụtara, ha agaghị ekweta na nkụzi Atọ n’Ime Otu abụghị eziokwu. Ọ bụ ya mere o ji dee, sị: “Echeghị m na m ka ga-abụ ụkọchukwu ma m gwahaala ndị mmadụ ihe m kweere.” N’ọnwa Jun afọ 1702, mmadụ abụọ n’ime ndị chọọchị ya bịakwutere ya ma jụọ ya ihe mere na ọ naghịzi ekwute okwu Atọ n’Ime Otu ma o kwuwe okwuchukwu. Emlin gwara ha hoo haa na ya ekwetaghịzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Ọ gwakwara ha na ya achọghịzi ịbụ ụkọchukwu ha.
Mgbe ụbọchị ole na ole gafere, Emlin hapụrụ Dọblịn gawa Ingland. Ma mgbe ọnwa abụọ na izu abụọ gafere, ọ laghachiri Dọblịn ka o mee ihe ụfọdụ n’ebe ahụ. O bu n’obi na ya mechaa ihe ọ bịara ime, na ya ga-aga birizie na Lọndọn. Ọ nọ na Dọblịn dee otu akwụkwọ kwuru gbasara Jizọs Kraịst. N’akwụkwọ ahụ, o dere ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere o ji bụrụ na Jizọs abụghị Chineke Onye Kasị Elu. Ihe ahụ o dere were ndị chọọchị ya ahụ dị na Dọblịn ezigbo iwe, ha agbaa ya akwụkwọ.
A nwụchiri Emlin ma kpụpụ ya n’ụlọikpe dị na Dọblịn n’abalị iri na anọ n’ọnwa Jun afọ 1703. N’otu akwụkwọ Emlin dere, o kwuru na “ihe mere e ji gbaa ya akwụkwọ bụ na a sịrị na ọ kụziri nkụzi ụgha n’akwụkwọ o bipụtara n’ihi na o dere na Jizọs Kraịst na Nna ya bụ́ Chineke ahaghị.” E kpere Emlin ikpe arụrụala. Ndị bishọp asaa si na Chọọchị Ayaland na ndị ọkàikpe nọ n’oche mgbe a na-ekpe ikpe ahụ. Otu ọkàiwu a ma ama aha ya bụ Richad Levins gwara Emlin na a gaghị ekwe ka ọ zara ọnụ ya. Mgbe e kpechara ikpe ahụ, onyeisi ndị ọkàikpe e nwere n’Ayaland, bụ́ Richad Paịn, gwara ndị ga-ekpebi ikpe ahụ ka ha kpebie ya otú a chọrọ n’ihi na “ndị bishọp bụ́ ndị nwe ya nọ ebe ahụ.” Ọ ga-abụ na ọ na-agwa ha na ọ bụrụ na ha amaghị Emlin ikpe, a ga-emesi ha ike.
“Ọ bụ eziokwu m kweere gbasara Chineke na ebube ya mere e ji ata m ahụhụ.”
E mechara maa Emlin ikpe. Otu nnukwu ọkàikpe gwaziri Emlin ka o kwuo na ihe ahụ o dere n’akwụkwọ ya abụghịzi eziokwu. Ma, Emlin jụrụ. Ebe ọ bụ na ọ jụrụ, a tụrụ ya mkpọrọ otu afọ, gwakwa ya ego ole ọ ga-akwụ. Ma, ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ afọ abụọ n’ihi na o nweghị ike ịkwụ ụgwọ a sị ya kwụọ. Ihe zọrọ ya bụ na otu enyi ya nwoke bịara rịọ ndị isi ka ha wepụ ego n’ego ahụ a sị ya kwụọ. A kpọpụtara Emlin n’ụlọ mkpọrọ n’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa Julaị afọ 1705. Ahụhụ ọ tara mere ka o dee ihe ahụ anyị dere ná mbido isiokwu a. O dere, sị: “Ọ bụ eziokwu m kweere gbasara Chineke na ebube ya mere e ji ata m ahụhụ.”
Emlin mechara kwaga Lọndọn. N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Wiliam Wistịn. Wistịn ma Baịbụl nke ọma. A chụpụrụ ya n’obodo ya n’ihi na o dere ihe o chere bụ́ eziokwu n’akwụkwọ o bipụtara. Wistịn ejighị Emlin egwu egwu. O kwuru na Emlin bụ ‘ụkọchukwu mbụ kụziri eziokwu si n’aka Ndị Kraịst oge gboo.’
GỊNỊ MERE O JI KWUO NA NKỤZI ATỌ N’IME OTU ABỤGHỊ EZIOKWU?
Wiliam Wistịn na otu ọkà mmụta a ma ama bụ́ Aịzik Niutịn chọpụtara na Baịbụl ekwughị na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Emlin chọpụtakwara otu ihe ahụ. O kwuru, sị: ‘Agụọla m Akwụkwọ Nsọ nke ọma, chebara ya ezigbo echiche ma chọpụta na ihe m kweburu gbasara Atọ n’Ime Otu abụghị eziokwu. Ọ bụ ya mere na ekwetazighị m n’Atọ n’Ime Otu.’ O kwuziri na “ọ bụ naanị Chineke, bụ́ Nna Jizọs Kraịst, bụ Onye Kasị Elu.”
Gịnị mere Emlin ji kwuo ihe a o kwuru? O nwere ọtụtụ ebe ọ gụrụ na Baịbụl gosiri na Jizọs dị iche na Nna ya. Lee ụfọdụ n’ime ha (e dere ihe Emlin kwuru gbasara amaokwu ndị ahụ ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo):
Jọn 17:3: “O nweghị ebe e kwuru na Kraịst bụ otu Chineke ahụ, ma ya fọdụzie ikwu na ọ bụ naanị ya bụ Chineke.” Ọ bụ naanị Nna ya ka a kpọrọ “onye naanị ya bụ ezi Chineke.”
Jọn 5:30: “Ọkpara ahụ anaghị eme uche ya, kama ọ na-eme uche Nna ya.”
Jọn 5:26: “Ọ bụ Nna ya nyere ya Ndụ.”
Ndị Efesọs 1:3: “A na-akpọkarị Jizọs Kraịst Ọkpara Chineke, ma e nweghị ebe a kpọrọ Nna ya Nna Chineke n’agbanyeghị na a na-akpọkarị ya Nna Onyenwe anyị bụ́ Jizọs.”
Mgbe Emlin chebachaara amaokwu niile ahụ echiche, o kwuru hoo haa, sị: “O nweghị ebe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ bụ otu, bụrụkwa otu onye.”
GỊNỊ KA ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA N’IHE EMLIN MERE?
Taa, ụjọ na-eme ka ọtụtụ ndị ghara ikwu na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru bụ eziokwu. Ma, Emlin gbachiteere eziokwu dị na Baịbụl. Ọ jụrụ ajụjụ, sị, “Ọ bụrụ na o doro mmadụ anya na ihe ọ chọpụtara n’Akwụkwọ Nsọ bụ eziokwu bara uru, ma o nweghị ike ịgwa ya ndị ọzọ, gịnịzi mere o ji na-agụ Akwụkwọ Nsọ ma na-amụ ya?” Emlin agbaraghị eziokwu ọsọ.
Ihe Emlin mere na ihe ndị ọzọ dị ka ya mere kwesịrị ime ka anyị chee echiche ma ànyị ga-agbachitere eziokwu ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-eleda anyị anya n’ihi ihe anyị kweere. Anyị nwekwara ike ịjụ onwe anyị ma ‘ihe ka anyị mkpa ọ̀ bụ ịgbachitere ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ka ọ̀ bụ ịchọ ka ndị obodo anyị na-akwanyere anyị ùgwù?’