Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | MMADỤ ỊṄỤ SỊGA Ọ̀ DỊ CHINEKE MMA?

Mmadụ Ịṅụ Sịga Ọ̀ Dị Chineke Mma?

Mmadụ Ịṅụ Sịga Ọ̀ Dị Chineke Mma?

Naoko anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ sịrị na ihe nyeere ya aka ịkwụsị ịṅụ sịga bụ eziokwu ọ mụtara gbasara Chineke, àgwà ya, na ihe ndị Chineke bu n’obi ime. Ebe o si mụta ihe ndị ahụ bụ na Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na a kpọghị sịga aha na Baịbụl, ihe Baịbụl kwuru na-eme ka anyị mata ma mmadụ ịṅụ sịga ọ̀ dị Chineke mma ma ọ bụ na ọ dịghị ya mma. * Ihe mere na ọtụtụ ndị anaghị aṅụ sịga bụ ihe ndị ha mụtara na Baịbụl, ọ bụkwa ya mere ọtụtụ ndị na-aṅụbu sịga ji kwụsị ịṅụ ya. (2 Timoti 3:16, 17) Ka anyị leba anya ná nsogbu atọ ịṅụ sịga na-akpatara ndị mmadụ na ihe Baịbụl kwuru gbasara nsogbu ndị ahụ.

SỊGA NA-ERI MMADỤ AHỤ́

O nwere ihe na-adị na sịga a na-akpọ nikotin. O so n’ihe ndị kacha eri mmadụ ahụ́ e nwere n’ụwa. Ọ na-eme ka ahụ́ dị mmadụ gara gara, ma ọ na-emekwa ka ahụ́ mmadụ ghara ịrụ ọrụ nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ aṅụọ sịga, nikotin na-abanye ya n’ụbụrụ ngwa ngwa, banyekwa ugboro ugboro. Mgbe ọ bụla ọ mịịrị sịga, nikotin na-abanye ya n’ụbụrụ otu ugboro. Ọ bụrụ na ọ na-aṅụcha otu mkpọ sịga n’ụbọchị, ihe ọ pụtara bụ na ọ na-amịrị nikotin ihe dị ka narị ugboro abụọ n’ụbọchị. O nweghị ụdị ọgwụ ọjọọ ọzọ nwere ike ime ka nikotin ruru otú ahụ banye mmadụ n’ụbụrụ. Ebe ọ bụ na nikotin hà otú ahụ na-abanye onye ahụ n’ahụ́ ugboro ugboro, ọ na-eri ya ahụ́ otú na-enweghị atụ. Ọ chọzie ịkwụsị ịṅụ sịga, ahụ́ enyewe ya nsogbu.

‘Unu bụ ohu ihe unu na-erubere isi.’—Ndị Rom 6:16

Ị̀ ga-erubeliri Chineke isi ma ọ bụrụ na sịga ji gị mere ohu?

Lekwa ihe Baịbụl kwuru gbasara mmadụ ikwe ka ụdị ihe a rie ya ahụ́. Ọ sịrị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu na-enyefe onwe unu n’aka onye ọ bụla ka unu bụrụ ndị ohu ya irubere ya isi, unu bụ ndị ohu ya n’ihi na unu na-erubere ya isi?” (Ndị Rom 6:16) Ọ bụrụ na ihe na-adị mmadụ n’obi mgbe niile bụ ịṅụ sịga, mgbe onye ahụ na-amala ihe na-emenụ, ya agbawara sịga ohu. Ma Chineke, onye aha ya bụ Jehova, achọghị ka ihe ga-emebi anyị ahụ́ ma ọ bụ ihe ga-emebi anyị mmụọ, ya bụ, ihe ga-emebi echiche anyị, na-atụrụ anyị ụka. (Abụ Ọma 83:18; 2 Ndị Kọrịnt 7:1) Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịkwanyere Jehova ùgwù, ọ ga-aghọta na ya kwesịrị inye Jehova ihe kacha mma o nwere ike inye ya. Ọ ga-aghọtakwa na o nweghị otú ọ ga-esi enye Jehova ihe kacha mma ma ọ bụrụ na ihe ga-eme ka ọ nwụchuo ọnwụ na-atụrụ ya ụka. Ịghọta ihe ndị a ga-eme ka ọ ghara ikwe ka ihe ga-emebi ya ahụ́ na-agụ ya agụụ.

E nwere otu nwoke bi na Jamanị. Aha ya bụ Olaf. O bidoro ịṅụ sịga mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. Ọ ṅụkwara ya afọ iri na isii. Olaf chere na o nweghị ihe ịṅụ sịga ga-eme ya. Ma, mgbe afọ ole na ole gachara, o riri ya ahụ́ nke na ma ọ́ ṅụghị ya, ahụ́ enyewe ya nsogbu. Ọ sịrị: “O nwere mgbe sịga gwụnahụrụ m, agụụ ịṅụ sịga emee ka m gaa tụtụkọta isi sịga niile m ṅụcharala aṅụcha dị n’efere m na-etinye ntụ sịga. M ji akwụkwọ fụkọta ha, mụnye ha ọkụ ṅụọ. Ọ na-abụ m cheta ihe m mere mgbe ahụ, ihere onwe m ana-eme m.” Olee otú o sizi kwụsị ịṅụ sịga? Ọ sịrị: “Ihe kacha mee ka m kwụsị ya bụ na m chọrọ ime ihe dị Jehova mma. Otú Jehova si hụ ụmụ mmadụ n’anya na olileanya o mere ka anyị nwee mere ka m kata obi kwụsịchaa ihe a riri m ahụ́.”

ỊṄỤ SỊGA NA-EMEBI MMADỤ AHỤ́

Otu akwụkwọ a na-akpọ The Tobacco Atlas sịrị: ‘Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala na ịṅụ sịga na-emebi ọtụtụ ihe dị mmadụ n’ahụ́. Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-arịakarị ọrịa, ọ na-egbufukwa ọtụtụ ndị.’ O doro ewu na ọkụkọ anya na ise sịga na-akpata ọrịa ndị dị ka kansa, ọrịa obi, na ọrịa akpa ume. Ọrịa ndị a anaghị efe efe. Ma, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na sịga so n’ihe kacha egbu ndị na-arịa ọrịa na-efe efe, dị ka ụkwara nta.

“Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—Matiu 22:37

Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ga-emebi ahụ́ Chineke nyere gị, ị̀ ga-asị na ị na-akwanyere Chineke ùgwù nakwa na ị hụrụ ya n’anya?

Jehova Chineke si n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na-agwa anyị ihe dị mma anyị kwesịrị iji ndụ anyị, ahụ́ anyị, na uche anyị na-eme. Nwa ya, bụ́ Jizọs, kwuru ihe anyị ga-eji ha na-eme. Ọ sịrị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) O doro anya na Chineke chọrọ ka anyị jiri ndụ anyị na ahụ́ anyị na-eme ihe dị mma, ọ chọkwara ka anyị na-akwanyere ahụ́ anyị ùgwù. Ọ bụrụ na anyị ana-amụtakwu banyere Jehova na nkwa ndị o kwere, anyị ga-ahụ ya n’anya ma jiri ihe niile o meere anyị kpọrọ ihe. Ọ ga-eme ka anyị gbaara ihe ọ bụla ga-emebi ahụ́ anyị ọsọ.

E nwere otu dọkịta bi n’India a na-akpọ Jayavanth. Ọ ṅụrụ sịga afọ iri atọ na asatọ. Ọ sịrị: “M gụtara n’akwụkwọ dị iche iche na-ekwu gbasara ahụ́ ike na ịṅụ sịga adịghị mma. Ama m na ọ dịghị mma, m na-agwakwa ndị bịara ka m gwọọ ha ọrịa ka ha kwụsị ịṅụ sịga. Ma, o kweghị mụnwa nkwụsị n’agbanyeghị na m gbalịrị ugboro ise ma ọ bụ isii ka m kwụsị ya.” Gịnị nyeere ya aka ịkwụsị ya? Ọ sịrị: “Ọ bụ ịmụ Baịbụl mere m ji kwụsị ịṅụ sịga. Ebe m chọrọ ime ihe dị Jehova mma, m kwụsịrị ya n’egbughị oge.”

ỊṄỤ SỊGA NA-EMEBI IHE N’AHỤ́ NDỊ ỌZỌ

Anwụrụ ọkụ sịga mmadụ kupụrụ na nke na-apụta n’isi sịga a ṅụchara aṅụcha na-emebi ihe n’ahụ́ mmadụ. Ọ bụrụ na mmadụ na-ekuru anwụrụ ọkụ ahụ, o nwere ike ịkpatara ya ọrịa kansa na ọrịa ndị ọzọ. Kwa afọ, narị puku mmadụ isii na-anwụ maka na ha na-ekuru anwụrụ ọkụ sịga ndị ọzọ na-aṅụ. Ndị kacha anwụ n’ime ha bụ ụmụ nwaanyị na ụmụaka. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike sịrị: “Ọ bụrụgodị na anwụrụ ọkụ sịga mmadụ kuuru mgbe onye ọzọ na-aṅụ sịga ebughị ibu, ọ ga-enye ya nsogbu n’ahụ́.”

“Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—Matiu 22:39

Ị̀ ga-asị na ị hụrụ ndị agbata obi gị na ndị ezinụlọ gị n’anya ma ọ bụrụ na ị na-eme ka ha na-ekuru anwụrụ ọkụ sịga ị na-aṅụ ebe ị ma na ọ ga-akpatara ha ọrịa?

Jizọs sịrị na e wezụga ihu Chineke n’anya, iwu kachanụ bụ: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Ndị so ná ndị agbata obi anyị bụ ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, na ndị ọzọ nọ anyị nso. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ga-enye ndị anyị na ha nọ nsogbu n’ahụ́, anyị anaghị egosi na anyị hụrụ ha n’anya. Ọ bụrụ na anyị hụrụ ha n’anya n’eziokwu, anyị ga-eme ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl sịrị: “Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”—1 Ndị Kọrịnt 10:24.

Otu nwoke bi n’Aminia aha ya bụ Armen kwuru, sị: “Ndị ezinụlọ m rịọrọ m ka m kwụsị ịṅụ sịga n’ihi na ọ na-enye ha nsogbu n’ahụ́. Ma, achọghị m ikweta na o nwere ihe ọ na-eme ha.” Armen kwuziri ihe mere o ji kwụsị ịṅụ sịga. Ọ sịrị: “Ihe m mụtara na Baịbụl na otú m sizi hụ Jehova n’anya mere ka m kwụsị ịṅụ sịga, meekwa ka m kweta na sịga m na-aṅụ na-emebi ma ahụ́ nke m ma nke ndị mụ na ha nọ.”

SỊGA HA KWỤSỊRỊ ỊṄỤ BAARA HA URU

Ihe Olaf, Jayavanth, na Armen mụtara na Baịbụl nyeere ha aka ịkwụsị ịṅụ sịga. Ihe mere ha ji kwụsị ya abụghị naanị na ha ma na ịnụ sịga na-emebi ma ahụ́ nke ha ma nke ndị ọzọ. Ha kwụsịrị ya maka na ha hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ime ihe ga-adị ya ụtọ. Ihe e kwuru na 1 Jọn 5:3 gosiri na ịhụnanya bara ezigbo uru. Ọ sịrị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” N’eziokwu, ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ ime ihe Baịbụl kwuru na-adị mfe. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ejiri obi ya niile hụ Chineke n’anya, irubere Chineke isi agaghị abụrụ ya ibu arọ.

Jehova Chineke si n’ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile na-enyere ọtụtụ nde mmadụ aka ka ha ghara ịṅụ sịga, na-enyekwara ndị nke na-aṅụ ya aka ka ha kwụsị ịṅụ ya. (1 Timoti 2:3, 4) Obere oge ugbu a, Jehova ga-eji Alaeze ya nke ga-esi n’eluigwe na-achị wepụ azụmahịa niile ndị mmadụ ji anyaukwu na-azụ n’ihi na ọ bụ ya mere ịṅụ sịga ji rie ọtụtụ nde mmadụ ahụ́. Jehova ga-esi n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, onye o nyefere Alaeze ahụ, mee ka ndị mmadụ kwụsịchaa ịṅụ sịga, meekwa ka ahụ́ na uche ndị mmadụ zuo okè.—Aịzaya 33:24; Mkpughe 19:11, 15.

Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịkwụsị ịṅụ sịga, obi adala gị mba. Ọ bụrụ na ị malite ịhụ Jehova n’anya ma lewe ịṅụ sịga anya otú o si ele ya anya, ị ga-akwụsịli ịṅụ sịga. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ka ị mụta ihe Baịbụl kwuru, mụtakwa otú ị ga-esi na-eme ya. Buru n’obi na ọ bụrụ na ị chọrọ ka Jehova nyere gị aka ka ị kwụsị ịṅụ sịga, ọ ga-enye gị ike na ume ị ga-eji kwụsị ya kpamkpam.—Ndị Filipaị 4:13.

^ para. 3 Ịṅụ sịga a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ịṅụ sịga nkịtị, ịṅụ sịga ọgbara ọhụrụ na-anaghị enwe anwụrụ ọkụ, ịṅụ igbo, ịṅụ ọkpọkọ, ịra anwụrụ, ịkpọ ụtaba, na ihe ndị yiri ha.