Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Okpukpe niile hà na-eme ihe dị Chineke mma?

O nwere ike ịbụ na ihe ndị ị na-anụ n’akụkọ ụwa emeela ka ị mata na mgbe ụfọdụ, okpukpe ndị mmadụ na-ekpe na-eme ka ha kpaa arụ. Ọ bụghị okpukpe ma ọ bụ chọọchị niile na-eme ihe dị Chineke mma. (Matiu 7:15) N’eziokwu, okpukpe eduhiela ọtụtụ ndị.—Gụọ 1 Jọn 5:19.

Ma, Chineke maara na e nwere ndị ihe ọma na-adị mma ji obi ha niile chọọ ife ya. (Jọn 4:23) Chineke chọrọ ka ndị dị otú ahụ mụọ Okwu ya bụ́ Baịbụl ka ha mụta eziokwu.—Gụọ 1 Timoti 2:3-5.

Olee otú ị ga-esi mata nke bụ́ ezigbo okpukpe?

Jehova Chineke na-eme ka ndị si n’okpukpe dị iche iche dịrị n’otu. Otú o si eme ya bụ na ọ na-akụziri ha eziokwu, na-akụzikwara ha ka ha hụ ibe ha n’anya. (Maịka 4:2, 3) N’ihi ya, ihe ị ga-eji amata ndị na-ekpe ezigbo okpukpe bụ na ha hụrụ ibe ha n’anya.—Gụọ Jọn 13:35.

Jehova Chineke ji ezigbo okpukpe eme ka ndị dị iche iche dịrị n’otu.—Abụ Ọma 133:1

Ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ na-ekwere naanị ihe Baịbụl kwuru, ha na-akpakwa àgwà otú Baịbụl kwuru ka ndị na-efe Chineke na-akpa. (2 Timoti 3:16) Ha na-akwanyere aha Chineke ùgwù. (Abụ Ọma 83:18) Ha na-agwakwa ndị mmadụ na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-egboro ndị mmadụ mkpa ha. (Daniel 2:44) Ha na-eme ka ‘ìhè ha na-enwu’ otú Jizọs mere. Otú ha si eme ya bụ na ha na-emere ndị agbata obi ha ihe ọma. (Matiu 5:16) Ọ bụ ya mere na ihe ọzọ ị ga-eji amata ezigbo Ndị Kraịst taa bụ na ha na-aga n’ụlọ ndị mmadụ ezi ha ozi ọma gbasara Alaeze Chineke.—Gụọ Matiu 24:14; Ọrụ Ndịozi 5:42; 20:20.

[Okwu nkọwa 16]