Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE URU ALAEZE CHINEKE GA-ABARA GỊ?

Olee Uru Alaeze Chineke Ga-abara Gị?

Olee Uru Alaeze Chineke Ga-abara Gị?

O nwere ike ịbụ na isiokwu ndị bu nke a ụzọ emeela ka ị ghọta na Ndịàmà Jehova ejighị Alaeze Chineke egwu egwu. O nwekwara ike ịbụ na obi dị gị ụtọ mgbe ị gụtara ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere ndị mmadụ n’ọdịnihu. Ma, i nwere ike ịna-eche ma ihe ọma ndị ahụ hà ga-eme eme n’eziokwu.

Ọ dị mma na ị na-echebara ihe ị gụrụ echiche tupu gị ekweta na ha niile bụ eziokwu. (Ilu 14:15) E nwere ike ikwu na ihe a i mere yiri ihe ndị Beria * oge ochie mere. Mgbe mbụ e ziri ha ozi ọma Alaeze Chineke, ha nabatara ya. Ma, ihe mere ha ji nabata ya abụghị naanị na ha chọrọ ka ihe ndị ha nụrụ mee, kama ọ bụ n’ihi na ha nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma iji mara ‘ma ihe ndị ahụ hà bụ eziokwu.’ (Ọrụ Ndịozi 17:11) E nwere ike ikwu na ndị Beria gbalịrị ka ha mata ma ozi ọma e ziri ha ọ̀ dabara n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ha mechara chọpụta na ozi ọma ahụ si n’Okwu Chineke n’eziokwu.

Ndịàmà Jehova na-agba gị ume ka i mee ihe ahụ ndị Beria mere. Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’efu. Ọ bụrụ na i kweta ka gị na ha mụwa Baịbụl, ị ga-achọpụta ma ihe Ndịàmà Jehova kweere gbasara Alaeze Chineke ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl kwuru.

Uru ịmụ Baịbụl ga-abara gị abụghị naanị na ị ga-amụta banyere Alaeze Chineke, kama ị ga-amatakwa azịza ajụjụ ndị na-echu ndị mmadụ ụra.

Nke ka nke bụ na ịmụ Baịbụl ga-eme ka ị ‘bịaruo Chineke nsọ.’ (Jems 4:8) Ọ bụrụ na gị na Chineke ana-adịkwu ná mma, ị ga-amata uru Alaeze Chineke baara gị ugbu a, matakwa na ọ ga-abara gị uru ruo mgbe ebighị ebi. Jizọs gwara Nna ya n’ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

 

^ para. 4 Obodo Beria dị na Masedonia oge ochie.