ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | SETAN Ọ̀ DỊ ADỊ?
Setan Ọ̀ Dị Adị?
“Anọ m na El Salvadọ too. Ọ na-abụ m mee isi ike, mama m asị m: ‘Ekwensu ga-abịa jide gị.’ M na-asị ya: ‘Ya bịawanụ!’ Ama m na e nwere Chineke, ma Ekwensu adịghị.”—ROGELIO.
Ì chere na ihe a Rogelio kwuru bụ eziokwu? Olee nke i chere bụ́ eziokwu n’ihe ndị e dere n’okpuru ebe a?
Setan adịghị adị. Ọ bụ ihe ọjọọ dị ndị mmadụ n’obi.
Setan dị adị. Ma o nwechaghị ihe gbasara ya na ndị mmadụ.
Setan bụ mmụọ dị ike. Ọ na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ.
Nke ọ bụla n’ime ihe atọ a nwechara ndị kwetara na ọ bụ eziokwu. Ndị nke ọ bụla n’ime ha ruru ọtụtụ nde mmadụ. Ọ̀ baara mmadụ uru ịchọwa ịmata nke bụ́ eziokwu? Ọ bụrụ na Setan adịghị adị, ihe ọ pụtara bụ na e duhiela ndị kwetara na ọ dị adị. Ọ bụrụ na ọ dị adị, ma ya abụrụ na o nweghị ihe gbasara ya na ụmụ mmadụ, ọ pụtara na egwu ọtụtụ ndị na-atụ ya abaghị uru. Ma, ọ bụrụ na Setan bụ onye dị adị nke na-aghọgbu ndị mmadụ, ihe ọ pụtara bụ na e kwesịrị ize ya eze karịa otú ọtụtụ ndị chere.
Ka anyị leba anya n’Akwụkwọ Nsọ iji mata azịza ajụjụ ndị a: Setan ọ̀ bụ ihe ọjọọ dị ndị mmadụ n’obi, ka ọ̀ bụ mmụọ dị adị? Ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ dị adị, ò kwesịrị ka i zewe ya eze? Ọ bụrụ na i kwesịrị ize ya eze, olee ihe ị ga-eme ka ọ ghara imemila gị?