BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ
Baịbụl Zara Ajụjụ M Niile
-
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1987
-
ABỤ M ONYE: AZEBAỊJAN
-
NDỤ M BIRI: NNA M BỤ ONYE ALAKỤBA, NNE M ABỤRỤ ONYE JUU
NDỤ M BIRI NA MBỤ:
Amụrụ m n’obodo Baku, nke dị n’Azebaịjan. Nne na nna m mụrụ ụmụ abụọ. Abụ m nwa nke abụọ. Nna m bụ onye Alakụba, ebe nne m na-ekpe okpukpe ndị Juu. Ha abụọ hụrụ ibe ha n’anya, ha anaghịkwa enye ibe ha nsogbu maka na ihe otu onye kweere dị iche na nke ibe ya. Ọ na-abụ papa m buwe ọnụ n’ọnwa Ramadan, mama m na-enyere ya aka. Mama m mewekwanụ ememme Ngabiga ndị Juu, papa m enyere ya aka. N’ụlọ anyị, anyị nwere Koran, nwee Tora, nweekwa Baịbụl.
N’oge ahụ, ana m ewere onwe m ka onye Alakụba. Ọ bụ eziokwu na m kweere na Chineke dị, ma e nwere ihe ndị na-agbagwoju m anya. M na-eche, sị, ‘Gịnị mere Chineke ji kee mmadụ, gịnịkwa mere mmadụ ga-eji tachaa ahụhụ n’ụwa a, ya agaakwa tawa ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ?’ Ebe ndị mmadụ na-ekwu na ihe ọ bụla merenụ bụ uche Chineke, m na-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ Chineke na-akpatara ndị mmadụ nsogbu? Ha tawazie ahụhụ, ya elewe ha, obi ana-atọ ya ụtọ?’
Mgbe m dị afọ iri na abụọ, ebidoro m ikpe ekpere ndị Alakụba na-akpọ namaz. A na-ekpe ya ugboro ise n’ụbọchị. O teghị aka, papa m etinye mụ na nwanne m nwaanyị n’ụlọ akwụkwọ ndị Juu. A na-akụziri anyị iwu na omenala ndị dị na Tora, na-akụzikwara anyị asụsụ Hibru, na ihe ndị ọzọ. N’ụbọchị ọ bụla, tupu anyị ebido ịmụ ihe na klas, anyị na-ebu ụzọ ekpe ekpere otú ndị Juu si ekpe. Ma, m na-ebu ụzọ ekpe ekpere ndị Alakụba n’ụtụtụ tupu mụ agawa akwụkwọ, m ruzie n’ụlọ akwụkwọ, mụ esorokwa ha kpee ekpere ndị Juu.
Achọsiri m ike ka a zaa m ajụjụ ndị m nwere otú ga-edo m anya. Ọtụtụ ugboro, m jụrụ ndị rabaị nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị, sị: “Gịnị mere Chineke ji kee mmadụ? Olee otú Chineke si were papa m bụ́ onye Alakụba? Papa m bụ ezigbo mmadụ, oleekwanụ ihe mere e ji were ya ka onye na-adịghị ọcha? Gịnị mere Chineke ji kee ya?” Ihe a zara m enweghị isi na ọdụ.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:
N’afọ 2002, m kwụsịrị inwe okwukwe na Chineke. N’afọ ahụ, anyị kwagara Jamanị. Naanị otu izu anyị rutere Jamanị, ọrịa strok jidere papa m, ya atụbọọ. Kemgbe ọtụtụ afọ, ana m ekpe ekpere ka Chineke mee ka ahụ́ sie ndị ezinụlọ anyị ike nakwa ka ihe na-agaziri anyị niile.
Ebe o doro m anya na ọ bụ naanị Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nwere ike ime ka mmadụ dịrị ndụ ma ọ bụ ka mmadụ nwụọ, m nọ na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ka papa m gbakee. Echekwara m na ‘o nweghị oké ihe ọ bụụrụ Chineke ịza ekpere obere nwata nwaanyị dị ka m ji obi m niile na-ekpe.’ Obi siri m ike na ọ ga-emere m ihe m na-arịọ ya. N’agbanyeghị ekpere m niile, papa m nwụrụ.Obi gbawara m na Chineke azaghị ekpere m. Anọ m na-eche, sị, ‘Ma ọ́ bụghị na otú m si na-ekpe ekpere adịghị mma, ya abụrụ na Chineke adịghị.’ Ihe a merenụ enyeghị m ọnụ okwu, enwezighịkwa m ike ikpe ekpere namaz. Ihe a na-eme n’okpukpe ndị ọzọ amasịghịkwa m, mụ ekwuzie n’obi m na Chineke adịghị.
Mgbe ọnwa isii gachara, Ndịàmà Jehova bịara ozi ọma n’ụlọ anyị. Ma, ebe ọ bụ na o nweghị ihe anyị ji ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst kpọrọ, mụ na nwanne m nwaanyị chọrọ iji akọ gosi ha na ihe ha kweere abụghị eziokwu. N’ihi ya, anyị jụrụ ha, sị: “Gịnị mere Ndị Kraịst ji efe Jizọs, obe, Meri, na ihe ndị ọzọ a kpụrụ akpụ ebe Iwu Iri kwuru na ime otú ahụ adịghị mma?” Ndịàmà Jehova ahụ ji Baịbụl gosi anyị na ezigbo Ndị Kraịst anaghị ekpere arụsị nakwa na ọ bụ naanị Chineke ka e kwesịrị ikpegara ekpere. Ihe a ha kwuru juru m anya.
Anyị jụziri ha: “Oleekwanụ maka Atọ n’Ime Otu? Ọ bụrụ na Jizọs bụ Chineke, olee otú o si bụrụ na ọ dịrị ndụ n’ụwa, ndị mmadụ egbuokwa ya?” Ha jikwa Baịbụl zaa anyị ajụjụ a ma kọwaara anyị na Jizọs abụghị Chineke, ya na ya ahaghịkwa. Ndịàmà Jehova ahụ gwara anyị na ọ bụ ya mere na ha ekweghị n’Atọ n’Ime Otu. Ihe a ha kwuru tụrụ m n’anya, mụ ekwuzie n’obi m, ‘Oleekwanụ ụdị Ndị Kraịst ndị a bụ?’
Ma, m chọrọ ịmata ihe mere ndị mmadụ ji na-anwụ anwụ na ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-atagbu onwe ha n’ahụhụ. Ndịàmà Jehova ahụ nyere m akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. * Akwụkwọ a nwere ọtụtụ isiokwu zara ajụjụ ndị m na-ajụ. Ha ji ya bido ịkụziri m Baịbụl ozugbo.
Mgbe ọ bụla mụ na ha na-amụ ihe, otú ha si eji Baịbụl aza ajụjụ ndị m na-ajụ ha na-edo m anya. Abịara m mata na aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Ọmarịcha àgwà e ji mara ya bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) O kere ndị mmadụ n’ihi na ọ chọrọ ka ha dịrị ndụ otú yanwa dị. Aghọtakwara m na n’agbanyeghị na Chineke kwere ka mmegbu dịrị, ọ kpọrọ ya asị, ọ ga-ewepụkwa ya n’oge na-adịghị anya ruo mgbe ebighị ebi. Amụtakwara m na ọ bụ isi Adam na Iv nupụrụ mere imi na anya ji dị ụmụ mmadụ otú a ọ dị ha. (Ndị Rom 5:12) Otu n’ime nsogbu ndị nnupụisi ha na-akpatara anyị bụ ọnwụ, dị ka ọnwụ papa m. Ma mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka nsogbu a na nsogbu ndị ọzọ kwụsị n’ihi na n’oge ahụ, ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ.—Ọrụ Ndịozi 24:15.
Baịbụl zara ajụjụ m niile. M bidoro nwewekwa okwukwe na Chineke. Mgbe m matakwuru Ndịàmà Jehova, aghọtara m na ha nọ n’ebe niile n’ụwa. Otú ha si hụ ibe ha n’anya ma dị n’otu masịrị m. (Jọn 13:34, 35) Ihe m mụtara gbasara Jehova mere ka ijere ya ozi gụwa m agụụ. N’ihi ya, m kpebiri na m ga-abụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. E mere m baptizim n’abalị asatọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2005.
URU NDỊ M RITERELA:
Otú ihe e kwuru na Baịbụl si doo anya ma dị mfe nghọta mere ka ndụ m gbanwee. Ọtụtụ ihe m na-amụta na Baịbụl na-eme ka obi ruo m ala. Ihe na-eme m ezigbo obi ụtọ ma na-akasi m obi bụ na m na-atụ anya ịhụ papa m ọzọ mgbe Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ otú o kwuru na Baịbụl.—Jọn 5:28, 29.
O ruola afọ isii mụ na ezigbo di m Jonathan lụrụ. Anyị na-enwekwa obi ụtọ. Anyị abụọ ahụla na ihe Baịbụl kwuru banyere Chineke bụ eziokwu, o sighịkwa ike nghọta. Ma, uru dị na ya enweghị atụ. Ọ bụ ya mere obi ji atọ anyị ụtọ ịgwa ndị ọzọ ihe ọma niile anyị na-atụ anya ha. Ugbu a, aghọtala m “ụdị Ndị Kraịst” Ndịàmà Jehova bụ. Ha bụ ezigbo Ndị Kraịst.
^ para. 15 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, ma a naghịzi ebipụta ya.