BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ
Otú Baịbụl Si Zaa M Ajụjụ M Niile Ha Edoo M Anya Tọrọ M Ezigbo Ụtọ
-
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1948
-
ABỤ M ONYE: HỌNGARỊ
-
NDỤ M BIRI: ACHỌSIRI M IKE ỊMATA AZỊZA AJỤJỤ NDỊ NA-ECHU M ỤRA
NDỤ M BIRI NA MBỤ:
A mụrụ m n’obodo Sekashfọhirivarụ dị na Họngarị. Ọ karịala otu puku afọ obodo a dịwara. Ọ ka na-ewute m ma m cheta ihe ndị e mebisịrị n’obodo a mgbe a na-alụ agha ụwa nke abụọ.
Ọ bụ mụ na mpa nnukwu m na mma nnukwu m bi mgbe m dị obere. Ha anaghị apụ m apụ n’obi, karịchaa mma nnukwu m aha ya bụ Elisabeth. Ihe ọ kụziiri m mere ka m nwee okwukwe siri ike na Chineke. Malite mgbe m dị afọ atọ, mụ na ya na-eso ekpe Ekpere Onyenwe Anyị ná mgbede ọ bụla. Ma, ọ bụ mgbe m dị ihe dị ka afọ iri abụọ na asatọ ka m ghọtara ihe ekpere ahụ pụtara.
Ọ bụ mpa nnukwu m na mma nnukwu m na-elekọta m mgbe m dị obere maka na mpa m na mma m na-arụ ọrụ ehihie na abalị ka ha nweta ego ha ga-eji azụta ụlọ nke anyị. Ma, na Satọdee nke abụọ n’ọnwa ọ bụla, anyị niile na-ezukọta rie nri. Oge ndị ahụ anyị na-ezukọta na-atọ m ezigbo ụtọ.
N’afọ 1958, mpa m na mma m mechara zụta ụlọ, mụ na ha ebirizie. Obi tọkwara m ezigbo ụtọ na mụ na ha bizi. Ma, mgbe ọnwa isii gara, ọrịa kansa gburu mpa m, obi ụtọ m niile ahụ ebie.
Obi gbawara m. Echetara m otu ụbọchị m nọ na-ekpe ekpere na-ajụ Chineke, sị: “Chineke, arịọrọ m gị ka i nyere mpa m aka ka ọ gbakee, achọghị m ka ọ nwụọ. Gịnị mere i meereghị m ihe m rịọrọ gị?” M nọ na-achọsi ike mgbe ahụ ka m mata ma mpa m ọ̀ gaala eluigwe ka ọ̀ bụ na nke ya agaala kpamkpam. M hụ ụmụaka ndị ọzọ mpa ha ka nọ ndụ, ya ana-adị m ka m bụrụ ha.
Ọ na-esi ike otu ụbọchị agafee mụ aghara ịga ebe e liri mpa m. M gagidere ebe ahụ ruo ọtụtụ afọ. Ọ na-abụ m rute n’ili ya, mụ egbuo ikpere n’ala na-arịọ Chineke, sị: “Chineke, biko, m chọrọ ịma ebe mpa m nọ.” M rịọkwara Chineke ka o mee ka m mata ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ.
Mgbe m dị afọ iri na atọ, ekpebiri m ịmụ asụsụ Jaman. E nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị bara uru e dere n’asụsụ Jaman. Uche m bụ na m ga-ahụ nke ga-aza m ajụjụ ndị na-echu m ụra. N’afọ 1967, ebidoro m ịmụ asụsụ Jaman n’obodo Jina. Jina dịbu n’ebe a na-akpọ Ist Jamanị. M ji obi m niile na-agụ akwụkwọ ndị Jamanị bụ́ ọkachamara dere, karịchaa ndị nke kwuru gbasara ihe mere e ji kee mmadụ. M gụtara ihe ndị tọrọ m ezigbo ụtọ n’akwụkwọ ndị ahụ, ma o nweghị nke zara m ajụjụ ndị ahụ otú doro m anya. M nọgidere na-arịọ Chineke ka o nyere m aka ka m mata azịza ajụjụ ndị ahụ.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:
N’afọ 1970, alọghachiri m Họngarị. Ọ bụkwa ebe ahụ ka m hụrụ onye m mechara lụọ. Aha ya bụ Rose. N’oge ahụ, ọ bụ ọchịchị Kọmunist na-achị Họngarị. Obere oge anyị lụchara, mụ na nwunye m gbagara Ọstria. Ihe anyị bu n’obi gbaga ebe ahụ bụ ka anyị si ebe ahụ kwaga Sidni dị n’Ọstrelia, ebe nwanne mma m bi.
O teghị aka mụ enweta ọrụ n’Ọstria. Otu ụbọchị, onye mụ na ya na-arụ ọrụ gwara m na m nwere ike ịhụ azịza ajụjụ m niile na Baịbụl. O nyere m akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Baịbụl. Agụchara m akwụkwọ ndị ahụ ozugbo, chọọkwa ịmatakwu ihe ndị ọzọ. Achọpụtara m na ndị bipụtara akwụkwọ ndị ahụ bụ Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, edegaara m ha akwụkwọ ka ha zitekwuoro m akwụkwọ ndị ọzọ.
N’ụbọchị mere ya otu afọ anyị lụrụ, otu nwa okorobịa Ọstria bụ́ Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị. O wetaara m akwụkwọ ndị ahụ m kwuru ka e wetara m, ọ gwakwara m na ya ga-achọ ka mụ na ya mụwa Baịbụl, mụ ekweta. Mụ na ya na-amụ ihe ugboro abụọ n’izu n’ihi na m chọsiri ike ịmụtakwu ihe. Anyị na-anọru ihe dị ka awa anọ ma anyị mụwa ihe.
Ihe Ndịàmà Jehova ji Baịbụl kụziere m tọrọ m ezigbo ụtọ. Mgbe ha gosiri m aha Chineke, bụ́ Jehova, na Baịbụl m e dere n’asụsụ Họngarịan, o juru m anya. N’ime afọ iri abụọ na asaa m gara chọọchị, o nweghị ụbọchị m nụrụ aha Chineke na chọọchị anyị. Otú Baịbụl si zaa m ajụjụ ndị ahụ m nwere ha edoo m anya tọrọ m ezigbo ụtọ. Dị ka ihe atụ, amụtara m na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ha dị ka ndị nọ n’oké ụra. (Ekliziastis 9:5, 10; Jọn 11:11-15) Amụtakwara m na Jehova kwere anyị nkwa na ya ga-ewetara anyị ụwa ọhụrụ ebe ‘ọnwụ na-agaghị adị ọzọ.’ (Mkpughe 21:3, 4) Ebe ọ bụkwa na “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ” n’ụwa ọhụrụ ahụ, m na-atụ anya ịhụ mpa m ọzọ.—Ọrụ Ndịozi 24:15.
Nwunye m bidokwara mụwa Baịbụl. Anyị tinyere uche anyị n’ihe anyị na-amụ. N’ime ọnwa abụọ, anyị mụchakwara akwụkwọ anyị ji na-amụ Baịbụl. O nweghị ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-akwa anyị. Otú Ndịàmà Jehova si hụ ibe ha n’anya, na-enyere ibe ha aka, ma dịrị n’otu masịrị anyị nke ukwuu.—Jọn 13:34, 35.
N’afọ 1976, mụ na nwunye m nwetara akwụkwọ ikike ịkwaga Ọstrelia. Ozugbo anyị ruru Ọstrelia, anyị gbalịrị chọta Ndịàmà Jehova. Ha nabatara anyị ma mee ka ahụ́ ruo anyị ala. N’afọ 1978, anyị mere baptizim ma ghọọ Ndịàmà Jehova.
URU NDỊ M RITERELA:
Ahụla m azịza ajụjụ ndị ahụ nọ na-echu m ụra kemgbe. Enwetakwala m Nna kacha nna niile, ya bụ, Jehova Chineke, onye mụ na ya dị ná mma ugbu a. (Jems 4:8) Obi bụkwa m sọ aṅụrị n’ihi na m nwere olileanya ịhụ mpa m n’ụwa ọhụrụ.—Jọn 5:28, 29.
N’afọ 1989, mụ na nwunye m kpebiri ịlaghachi Họngarị ka anyị nwee ike ịkụziri ndị ikwu na ibe anyị na ndị ọzọ ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl. Obi na-atọ anyị ụtọ na anyị akụzierela ọtụtụ narị mmadụ Baịbụl. Ihe karịrị mmadụ iri asaa n’ime ha esorokwala anyị fewe Jehova, mama m sokwa na ha.
M kpere ekpere afọ iri na asaa ka Chineke nyere m aka ka m mata azịza ajụjụ ndị na-echu m ụra. Afọ iri atọ na itoolu agaakwala kemgbe ahụ, akwụsịbeghị m ikpe ekpere. Ma, ihe m na-eme ugbu a bụ ịna-ekele Chineke, na-asị ya: “Nna m, i meela maka ịza m ekpere niile m kpegaara gị mgbe m dị obere.”